Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Jọn 1:1​—“Okwu Ahụ Nọ ná Mmalite”

Jọn 1:1​—“Okwu Ahụ Nọ ná Mmalite”

 “Okwu ahụ nọ ná mmalite, Okwu ahụ na Chineke nọkwa, Okwu ahụ bụkwa chi.”​— Jọn 1:​1, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Na mbụ tupu e kee ụwa, okwu ahụ dịrịị. Okwu ahụ na Chineke dịrịị. Okwu ahụ bụkwa Chineke.”​—Jọn 1:​1, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik. a

Ihe Jọn 1:1 Pụtara

 Amaokwu Akwụkwọ Nsọ a na-akụziri anyị ọtụtụ ihe gbasara ndụ Jizọs Kraịst dịrị n’eluigwe tupu ya aghọọ mmadụ bịa n’ụwa. (Jọn 1:​14-17) N’amaokwu nke 14, e turu Jizọs “Okwu ahụ” (ma ọ bụ “Logọs,” na Grik ho loʹgos). Ọ ga-abụ na e turu ya “Okwu ahụ” iji gosi na ọ na-akụziri ndị mmadụ iwu Chineke, na-agwakwa ha ihe ndị Chineke chọrọ ka ha na-eme. Jizọs nọgidere na-akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke ma mgbe ọ nọ n’ụwa ma mgbe ọ laghachiri eluigwe.​—Jọn 7:16; Mkpughe 1:1.

 Okwu bụ́ “ná mmalite” na-egosi mgbe Chineke malitere ike ihe. Ọ bụ mgbe ahụ ka o kere Okwu ahụ. Mgbe e mechara, Okwu ahụ nyeziiri Chineke aka kee ihe ndị ọzọ. (Jọn 1:​2, 3) Baịbụl kwuru na Jizọs bụ “onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke” nakwa “na e si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile.”​— Ndị Kọlọsi 1:​15, 16.

 Okwu bụ́ “Okwu ahụ bụkwa chi” na-egosi na tupu Jizọs abịa n’ụwa, ọ dị ike, nweekwa ọtụtụ ụzọ o si yie Chineke. Ihe a e kwuru gbasara ya dabara adaba n’ihi ọrụ pụrụ iche ọ na-arụ, ya bụ, ọnụ na-ekwuchitere Chineke. Ọ bụkwa Ọkpara Chineke, onye Chineke si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile.

Ihe Ndị Gbara Jọn 1:1 Gburugburu

 Akwụkwọ Jọn kọrọ otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa nakwa otú o si jee ozi ya. Amaokwu ndị malitere Jọn isi mbụ kọrọ otú Jizọs si bie ndụ n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, otú pụrụ iche ya na Chineke si dịrị ná mma, nakwa ọrụ dị mkpa ọ na-arụ n’ime ka Chineke na ụmụ mmadụ dịrị ná mma. (Jọn 1:​1-18) Ihe ndị a ọ kọọrọ anyị na-enyere anyị aka ịghọta ihe Jizọs kwuru na ihe ndị o mere mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa.​—Jọn 3:16; 6:38; 12:​49, 50; 14:28; 17:5.

Ihe Ndị Na-abụghị Eziokwu Gbasara Jọn 1:1

 Ụgha: Otú e kwesịrị isi asụgharị ebe ngwụcha Jọn 1:1 bụ “Okwu ahụ bụ Chineke.”

 Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị nsụgharị Baịbụl si otú a sụgharịa ya, ndị ọzọ chọpụtara na ọ ka mma isi otú ọzọ sụgharịa ya. N’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl, otú e si dee “Chineke” (Grik, the·osʹ) n’ebe abụọ ọ gbara na Jọn 1:1 dị iche iche. N’ebe mbụ “Chineke” gbara n’amaokwu ahụ, e nwere okwu e denyere n’ihu ya. Ma e denyeghị okwu ahụ n’ebe nke ọzọ ọ gbara. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na e nwere ihe gbara ọkpụrụkpụ mere otú e si dee ya na nke abụọ a ji dị iche. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ The Translator’s New Testament kwuru ihe mere e ji dee ya otú ahụ. Ọ sịrị: “Ihe mere e ji si otú ahụ dee ya bụ iji gosi na e nwere onye onye a na-ekwu okwu ya yiri. N’ihi ya, ihe e kwesịrị ide ebe ahụ bụ ‘Okwu ahụ dị ka Chineke.’” b Ihe a dabara n’ihe ndị ọkà mmụta c ndị ọzọ kwuru, dabakwa n’otú e si sụgharịa amaokwu a n’ụfọdụ Baịbụl ndị ọzọ.

 Ụgha: Ihe amaokwu a na-ekwu bụ na Okwu ahụ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile.

 Eziokwu: Okwu bụ́ “Okwu ahụ na Chineke nọkwa” gosiri na ọ bụghị otu onye ka a na-ekwu gbasara ya. Ọ dabaghị adaba ịsị na Okwu ahụ na ‘Chineke nọ,’ Okwu ahụ abụrụkwa Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. Okwu ndị gbara amaokwu a gburugburu gosikwara na Okwu ahụ abụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. Jọn 1:18 kwuru na “o nweghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” Ma, ndị mmadụ hụrụ Okwu ahụ, ya bụ Jizọs. Jọn 1:14 kwuru na “Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ́ ma bie n’etiti anyị. Anyị hụkwara ebube ya.”

 Ụgha: Okwu ahụ enweghị mmalite.

 Eziokwu: Okwu bụ́ “ná mmalite” e kwuru n’amaokwu a apụtaghị na Chineke nwere mmalite, n’ihi na Chineke enweghị mmalite. Jehova d Chineke na-adị “si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.” (Abụ Ọma 90:​1, 2) Ma, Okwu ahụ, ya bụ, Jizọs Kraịst nwere mmalite. Ọ bụ “onye mbụ Chineke kere.”​—Mkpughe 3:14.

 Ụgha: Ịkpọ Okwu ahụ “chi” na-akwado ife ọtụtụ chi.

 Eziokwu: Okwu Grik e si na ya nweta “Chineke” ma ọ bu “chi” (ya bụ, the·osʹ) na okwu Hibru abụọ bụ́ ʼel na ʼelo·himʹ pụtara otu ihe. Ọ bụ n’ebe ndị mmadụ na-akpọkarị Agba Ochie ka okwu Hibru abụọ a gbara. Ihe bụ́ isi ndị mmadụ ma okwu Hibru abụọ a pụtara bụ “Dike ma ọ bụ Onye Siri Ike. A na-ekwukwa ha mgbe a na-ekwu gbasara Chineke pụrụ ime ihe niile, chi ọzọ dị iche iche, nakwa mgbe a na-ekwudị gbasara ụmụ mmadụ. (Abụ Ọma 82:6; Jọn 10:34) Okwu ahụ bụ onye Chineke si n’aka ya kee ihe ọzọ niile. N’ihi ya, o ziri ezi ịkpọ ya dike. (Jọn 1:3) Ịkpọ Okwu ahụ “chi” dabara n’amụma e buru n’Aịzaya 9:​6, ebe kwuru na a ga-akpọ onye ga-abụ Mezaya ma ọ bụ Kraịst, ya bụ, onye Chineke họọrọ “Chineke bụ́ Dike” (na Hibru, ʼEl Gib·bohrʹ), ọ bụghị “Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” (ʼEl Shad·daiʹ, dị ka e si dee ya na Jenesis 17:1; 35:11; Ọpụpụ 6:3; Ezikiel 10:5).

 Baịbụl akwadoghị ife ọtụtụ chi. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi.” (Matiu 4:10) Baịbụl kwukwara, sị: “Ọ bụ eziokwu na e nwere chi dị iche iche, ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, nweekwa ọtụtụ ndị e weere na ha bụ chi nakwa ọtụtụ ndị e weere na ha bụ ndị nwe mmadụ, ma naanị otu Chineke ka anyị nwere. Ọ bụ Nna, onye kere ihe niile, ndụ anyị dị bụkwa maka ya. Otu Onyenwe anyị dịkwa, ya bụ, Jizọs Kraịst, onye Chineke si n’aka ya mee ka ihe niile dịrị, anyị sikwa n’aka ya dịwa ndụ.”​—1 Ndị Kọrịnt 8:​5, 6.

a Otú e si sụgharịa ya ebe a yikwara otú e si sụgharịa ya na Bible Nsọ nke Union Version.

b Akwụkwọ bụ́ The Translator’s New Testament, peeji nke 451.

c Ọkà mmụta bụ́ Jason David BeDuhn kwuru na okwu ahụ a na-edenyeghị na nke abụọ mere ka o doo anya na onye a na-ekwu na nke mbụ bụ “Chineke,” onye a na-ekwu na nke abụọ abụrụ ‘chi.’ O kwukwara, sị: “Na Jọn 1:1, ọ bụghị onye ahụ naanị ya bụ Chineke ka a kpọrọ Okwu ahụ, kama ọ bụ onye bụ́ chi, ma ọ bụ onye yiri Chineke.”​—Akwụkwuọ bụ́ Truth in Translation: Accuracy and Bias in English Translations of the New Testament, peeji nke 115, 122, na 123.

d Jehova bụ ezigbo aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.