Gaa n'Isiokwu

È KERE YA EKE?

Otú Ijiji A Na-akpọ Fruit Fly Si Efe Ngwa Ngwa

Otú Ijiji A Na-akpọ Fruit Fly Si Efe Ngwa Ngwa

 Onye ọ bụla chọtụrụla igbu ijiji ga-ama na ọ naghị adị mfe. Mmadụ chọọ igbu ya, ọ na-efepụ ngwa ngwa ka a ghara igbute ya.

 Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtala na o nwere ụdị ijiji na-enwe ike ịtụgharị ngwa ngwa ma ọ na-efe, otú ahụ ụgbọelu e ji alụ agha si atụgharị. Ma, ọ na-eji ihe na-erughị otu tịnkọm atụgharị. Ọ bụ ijiji a na-akpọ Fruit Fly. Otu ọkà mmụta aha ya bụ Michael Dickinson kwuru na mgbe a mụrụ ijiji ndị a ọhụrụ, “ha nwedịrị ike ife ka ndị ghọrọla aka ochie. Ọ dị ka ebe e kubara nwa a mụrụ ọhụrụ n’ime ụgbọelu e ji alụ agha, ya amara otú ọ ga-esi anya ya.”

 Ndị na-eme nchọnchọ setara ijiji a na vidio mgbe ọ na-efegharị ma chọpụta na ọ na-efe nku ya narị ugboro abụọ n’otu tịnkọm. Ma, naanị otu ugboro o fere nku ya ezuolara ya iji fepụ ma e nwee ihe chọrọ ime ya.

 Ọ̀ na-egbu ha oge iji fepụ? Ndị na-eme nchọnchọ chọpụtara na otú ijiji a si efepụ ngwa ngwa ma ihe chọọ ime ya ji okpukpu iri ise karịa otú mmadụ si atabi anya. Ọkà mmụta ahụ aha ya bụ Michael Dickinson kwukwara, sị: “Ọ naghị egbu ha oge ịmata ebe nsogbu si abịa na ebe ha ga-efega ka ihe ọ bụla ghara ime ha.”

 Otú ijiji a si eme ihe a n’agbanyeghị na ụbụrụ ya dị ntakịrị ka na-eju ndị na-eme nchọnchọ anya.

Ijiji a a na-akpọ fruit fly na-eji ihe na-erughị otu tịnkọm tụgharịa ma fepụ ma e nwee ihe chọrọ ime ya

 Gịnị ka i chere? Otú a ijiji a si efe ngwa ngwa ọ̀ nọkatara dịrị ka è nwere onye kere ya otú ahụ?