Gaa n'Isiokwu

È KERE YA EKE?

Otú Ahụ́ Azụ̀ Pilot Whale Si Eme Onwe Ya Ka Ọ Dị Ọcha

Otú Ahụ́ Azụ̀ Pilot Whale Si Eme Onwe Ya Ka Ọ Dị Ọcha

 E nwere ụmụ ihe ndị bi ná mmiri na-anyagide n’ahụ́ ụgbọ mmiri. Ha na-enye ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ezigbo nsogbu. Otú a ihe ndị a si anyagide n’ụgbọ mmiri na-eme ka ụgbọ mmiri ghara ịna-agbasi ike, ya ana-aṅụkwu mmanụ ụgbọ mmiri. Ọ na-emekwa ka a na-ebupụta ụgbọ mmiri ná mmiri mgbe afọ ole na ole gachara iji wepụsia ihe ndị ahụ nyagidejuru na ya. Ndị sayensị na-achọ iji otú ihe ụfọdụ bi na mmiri si edowe onwe ha ọcha mụta otú ha ga-esi kwụsị nsogbu a.

 Ihe i ga-echebara echiche: Nchọpụta ndị e mere na-egosi na ahụ́ otu ụdị azụ̀ a na-akpọ pilot whale nke ọdụ ya na-adị ogologo, nwere otú o si eme onwe ya ka ọ dị ọcha. O nwere ụmụ obere ihe ndị dị n’ahụ́ ya nwere ezé nke na-eme ka o siere ihe ndị na-anyado n’ahụ́ ụgbọ mmiri ike inyapara na ya. O nwere ihe dị ka mmanụ na-eju n’agbata oghere ndị dị n’ezé ndị ahụ dị n’ahụ́ ya. Ọ na-ejikwa ya achụ ụmụ ahụhụ ma ọ bụ nje ndị dị ná mmiri ndị ga-achọ inyagide n’ahụ́ ya. Ka oge na-aga, ahụ́ azụ̀ a na-ekpepụ, ya erute nke ọhụrụ. Azụ̀ a na-emepụtazi mmanụ ọhụrụ ga-etechi ahụ́ ya niile.

 Ndị sayensị na-achọ ilere anya n’otú a azụ̀ pilot whale si edebe onwe ya ọcha, rụọ ihe ga-eme ka ahụ́ ụgbọ mmiri na-adị ọcha. N’oge ndị gara aga, ha na-ete ụgbọ mmiri ágbá ndị ga-eme ka ihe ghara ịna-anyado na ya. Ma, n’oge na-adịbeghị anya, a machibidoro ndị mmadụ ite ụdị ágbá a n’ahụ́ ụgbọ mmiri n’ihi na ọ na-egbusi ihe ndị bi na mmiri. Ndị na-eme nchọpụta kwuru na ihe a ga-eme bụ iwere obere ígwè a kpara akpa machie ahụ́ ụgbọ mmiri ahụ, ma ebe e nwere oghere n’ahụ́ ụgbọ mmiri ahụ bụ́ ebe kemikal na-agaghị egbu ihe dị na mmiri ga-esi na-agbapụta. Kemikal ahụ mesa ná mmiri, ya akpụkọọ n’ahụ́ ụgbọ ahụ niile. Ka oge na-aga, ya ekpekapụ, daba ná mmiri. Ihe ọ bụla nyagidere n’ụgbọ ahụ ga-esokwa ya dapụ. Kemikal ọzọ na-esikwa n’oghere ndị ahụ gbapụta machiekwa ahụ́ ụgbọ ahụ niile.

Ụmụ ihe ndị bi ná mmiri na-anyagide n’ụgbọ mmiri na-eme ka ọ ghara ịna-agbasi ike, ọ na-esikwa ike iwepụ ha

 Nchọpụta ndị e mere gosiri na ihe ndị a a na-arụnye n’ụgbọ mmiri nwere ike ime ka otú ụmụ ihe ndị bi na mmiri si anyagide n’ụgbọ mmiri belata. Ihe ọhụrụ a ga-abara ụlọ ọrụ ndị nwere ụgbọ mmiri ezigbo uru, n’ihi na ọ na-efu nnukwu ego iji bupụta ụgbọ mmiri n’elu ala ma mee ka ọ dị ọcha.

 Gịnị ka i chere? Otú a azụ̀ pilot whale si eme ahụ́ ya ka ọ dị ọcha, ọ̀ nọkatara dịrị? Ka, è kere ya eke?