Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

TheCrimsonMonkey/E+ via Getty Images

MKPỌSA PỤRỤ ICHE

Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ihe Ndị Na-emebi Ụwa

Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ihe Ndị Na-emebi Ụwa

 N’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Julaị afọ 2023, Inge Andersen, bụ́ otu n’ime ndị odeakwụkwọ Òtù Mba Ụwa nakwa onyeisi na Ngalaba Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi, kwuru, sị: “Nsogbu ndị ihu ígwé na-akpata bụụrụ ndị mmadụ, obodo dị iche iche, na ihe niile dị ndụ nsogbu. N’ụwa niile, oké ifufe na-ala ụlọ dị iche iche na ihe ndị mmadụ ji akpa afọ ha n’iyi. Ọ na-akakwa njọ ka chi na-abọ. Oké osimiri na-ekpokwu ọkụ ka chi na-abọ, o nwekwara ike ime ka ọtụtụ n’ime ihe ndị dị ndụ dị n’ime ya nwụọ.”

 Ndị ọchịchị hà ga-agbakọtali aka mee ka nsogbu a zuru ụwa ọnụ kwụsị? Hà ga-emeli ka nsogbu a laa ka naị?

 Baịbụl kwuru na e nwere ọchịchị ga-akwụsịli ihe niile na-emebi ụwa nakwa na ọchịchị ahụ ga-akwụsị ha. Ọ sịrị na “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze. . . (ma ọ bụ ọchịchị) malite ịchị.” Alaeze a ga-achị ụwa niile ma kwụsị nsogbu niile dị na ya. (Daniel 2:44) Ọchịchị a malite ịchị, ndị mmadụ agaghị emerụ ibe ha ahụ́ ma ọ bụ mebie ihe ọ bụla n’ụwa.​—Aịzaya 11:9.