Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NA-ECHENỤ NCHE!

A Na-emebisị Ụwa​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

A Na-emebisị Ụwa​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’abalị 4 n’ọnwa Eprel 2022, otu ụlọ ọrụ na-eleru otú ikuku na mmiri ozuzu si akpa ike anya (Intergovernmental Panel on Climate Change) gwara Òtù Mba Ụwa ihe ha chọpụtara. Mgbe onyeisi Òtù Mba Ụwa, bụ́ António Guterres, lebachara ihe ahụ ha chọpụtara anya, ọ sịrị: “Ụmụ mmadụ na-eme ihe dị iche iche ga-akpatara ụwa anyị a nsogbu. Mmiri ga-etochi ọtụtụ obodo. Oké okpomọkụ a na-enwetụbeghị ụdị ya ga-adị. Nnukwu mmiri ga na-ezokwa. Mmiri ọṅụṅụ agaghị adị. Nde kwuru nde osisi na ụmụ anụmanụ ga-anwụkpọ. Ihe a m na-ekwu abụghị egwuregwu. Ihe ndị a bụ ihe ndị sayensị kwuru ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị emeghị ihe ngwa ngwa ka a kwụsị imebi ikuku na mmiri.”

 O nwere isiokwu gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times, nke Jun 15, 2022. Isiokwu ahụ bụ “Flooding Chaos in Yellowstone, a Sign of Crises to Come.” Ọ sịrị: “Ndị sayensị na-ekwu na n’ime afọ ole na ole na-abịa na oké okpomọkụ ga-akpa oké ọhịa ndị dị n’Amerịka dị narị anọ na iri abụọ na atọ [423] aka ọjọọ. Ihe ga-eme yiri ihe anyị na-agụta na Baịbụl: a ga-enwe ọkụ na idei mmiri, mmiri kpụkọrọ akpụkọ ga na-agbaze, mmiri dị n’oké osimiri ga na-eto, oké okpomọkụ ga-adịkwa.”

 À ga-akwụsịli oké okpomọkụ na oké mmiri ozuzo na-akpa ike n’ụwa anyị a? Ọ bụrụ na a ga-akwụsịli ha, ònye ga-akwụsị ha? Ka anyị hụ ihe Baịbụl kwuru.

E buru amụma na a ga-enwe ndị ga na-emebi ụwa

 Baịbụl kwuru na Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Amaokwu Baịbụl a na-akụziri anyị ihe atọ ndị a:

  1.  1. Ihe ndị mmadụ na-eme ga na-emebisị ụwa.

  2.  2. A ga-emecha kwụsị imebi ụwa.

  3.  3. Ọ bụ Chineke ga-eme ka nsogbu a kwụsị, ọ bụghị mmadụ.

O nweghị ihe ga-eme ụwa a

 Baịbụl kwuru na “ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.” (Ekliziastis 1:4) E nweghị mgbe ndị mmadụ na-agaghị ebi na ya.

  •   “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.”​—Abụ Ọma 37:29.

 A ga-emecha dozie ụwa anyị a, ya adịkwa mma obibi.

  •   “Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị. Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.”​—Aịzaya 35:1.