Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

FPG/The Image Bank via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Ndị Ọchịchị Na-ekwu na Agha Amagedọn Eruwela​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ndị Ọchịchị Na-ekwu na Agha Amagedọn Eruwela​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’ụtụtụ Mọnde, abalị 10 n’ọnwa Ọktoba 2022, ndị Rọshịa tụrụ bọmbụ na Yukren maka na ndị Yukren tụrụ nke mebiri nnukwu àkwà mmiri jikọrọ Krimia na Rọshịa abalị abụọ tupu ụbọchị ahụ. Ihe a mere obere oge ndị ọchịchị kwuchara na o nwere ike ịbụ na agha Amagedọn eruwela.

  •   N’abalị 6 n’ọnwa Ọktoba 2022, onye na-achị Amerịka, bụ́ Joe Biden, kwuru na kemgbe ndị Amerịka na ndị Kuba lụchara agha n’oge John F. Kennedy na-achị Amerịka, na e nwetụbeghị mgbe a tụrụ anya na agha Amagedọn eruwela karịa otú a na-atụ anya ya n’agha nke a a na-alụ ugbu a. Ọ sịrị na ya echeghị na e nwere otú a ga-esi jiri ngwá agha nuklia lụọ agha, agha Amagedọn aghara ịmalite.

  •   N’abalị 8 n’ọnwa Ọktoba 2022, mgbe ndị nta akụkọ BBC jụrụ onye na-achị Yukren bụ́ Volodymyr Zelensky nsogbu iji ngwá agha nuklia alụ agha nwere ike ịkpata, ọ sịrị na o nwere ike ịkpata agha Amagedọn nakwa na ọ ga-akpa ụwa niile aka ọjọọ.

 Iji ngwá agha nuklia alụ agha ọ̀ ga-eme ka agha Amagedọn bido? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Ọ̀ bụ iji ngwá agha nuklia alụ agha ga-eme ka agha Amagedọn bido?

 Mba. Okwu bụ́ “Amagedọn” gbara naanị otu ebe na Baịbụl. Ọ bụ ná Mkpughe 16:16. Amagedọn abụghị agha mba na mba ga-alụ kama ọ bụ agha Chineke na “ndị eze niile nọ n’ụwa” ga-alụ. (Mkpughe 16:14) Chineke ga-eji agha Amagedọn bibie ọchịchị ụmụ mmadụ.​—Daniel 2:44.

 Gụọ isiokwu bụ́ Gịnị Bụ Agha Amagedọn? ka ị mata uru agha ahụ ga-aba.

À ga-eji ngwá agha nuklia bibie ụwa na ndị bi na ya?

 Mba. N’agbanyeghị na ndị ọchịchị nwere ike iji ngwá agha nuklia lụọ agha n’ọdịnihu, Chineke agaghị ekwe ka e bibie ụwa. Baịbụl kwuru, sị:

  •   “Ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.”​—Ekliziastis 1:4.

  •   “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.”​—Abụ Ọma 37:29.

 Ma, amụma Baịbụl na ihe ndị na-eme n’oge a na-egosi na nnukwu ihe ga-agbanwe n’ụwa n’oge na-adịghị anya. (Matiu 24:3-7; 2 Timoti 3:1-5) Ka anyị na gị mụọ Baịbụl n’anaghị gị ego ka ị mata ihe Baịbụl kwuru ga-eme n’ọdịnihu.