Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ

Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ịkwụsị Ịna-eme Omume Na-adịghị Mma

Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ịkwụsị Ịna-eme Omume Na-adịghị Mma

Ọ bụ naanị ndị omume ha dị mma ka ha na Jehova ga-abụli enyi. (1 Pita 1:​14-16) Ndị ị na-amụrụ Baịbụl kwụsị àgwà ọjọọ ha na-akpa, o nwekwara ike ịbara ha uru n’ezinụlọ ha, n’ihe gbasara ahụ́ ike ha, nakwa n’ihe gbasara ego.

Kọwaara ha iwu Jehova nke ọma. Gwakwa ha ihe mere o ji nye iwu ndị ahụ, nakwa uru irube isi na ha bara. Nyere ha aka ka ha na-ele ihe anya otú Jehova si ele ya. Ọ ga-eme ka ọ dịrị ha mfe ịna-eme ihe Jehova chọrọ. (Efe. 4:​22-24) Mee ka obi sie ha ike na ha ga-akwụsịli àgwà ọjọọ riri ha ahụ́ n’enyemaka Jehova. (Fil. 4:13) Gwa ha ka ha na-arịọ Jehova ka o nyere ha aka ịghara ime ihe ọjọọ ma ime ihe ọjọọ bata ha n’obi. Nyere ha aka ịmụta otú e si ama mgbe ọnwụnwa bịara ma gbaara ya ọsọ. Gbaa ha ume ka ha kwụsị ihe ndị na-adịghị mma ha na-eme ma mewe ihe ndị dị mma. Ị ga-enwe ọṅụ ma ị hụ ka Jehova na-enyere ndị ị na-amụrụ Baịbụl aka ịgbanwe.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NYERE NDỊ Ị NA-AMỤRỤ BAỊBỤL AKA ỊKWỤSỊ ỊNA-EME OMUME NA-ADỊGHỊ MMA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe ndị okenye na Linda mere mgbe ha chọpụtara na Joy akwụsịbeghị àgwà ọjọọ ọ na-akpa?

  • Olee otú Linda si nyekwuoro Joy aka?

  • Olee ihe Joy mere ka Jehova nyere ya aka?