Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | ÒNYE GA-AKASILI GỊ OBI MA NSOGBU BỊARA GỊ?

Nkasi Obi Dị Anyị Niile Mkpa

Nkasi Obi Dị Anyị Niile Mkpa

Ì nwere ike icheta otu ụbọchị ị nọ na-agba ọsọ mgbe ị dị obere, daa, merụọ ahụ́ n’aka ma ọ bụ chihịa ikpere gị? Ì chetara otú mama gị si gụgụọ gị, hichaa ọnyá gị ma kee ya ákwà? Ka ị nọ na-ebe ákwá, ya ekuru gị, na-asị gị ndo. Obere oge, gị enwetatụ onwe gị. N’oge ahụ ị dị obere, ihe mee gị, a ga-enwerịrị onye ga-abịa gụgụọ gị.

Ma ihe na-agbanwe ka anyị na-etolite. Nsogbu anyị na-akakwu njọ. Ọ na-esikwa ike ịhụ onye ga-akasi anyị obi. Nsogbu anyị na-enwe mgbe anyị torola anaghị abụkarị ụdị nke mama anyị ga-ekuru anyị, kee anyị ákwà, anyị enweta onwe anyị. Ka anyị lee ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ahụ.

  • Ò nwetụla mgbe a chụrụ gị n’ọrụ, ya adị gị ka nke ị na-eme agwụla? Otu nwoke aha ya bụ Julian kwuru na obi gbawara ya mgbe a chụrụ ya n’ọrụ. O bidoro na-eche otú ọ ga-esi elekọta ezinụlọ ya. Ọ nọkwa na-ajụ onwe ya ihe mere ụlọ ọrụ ha ji chụọ ya n’ọrụ n’agbanyeghị na ya ji obi ya niile na-arụrụ ha ọrụ kemgbe ọtụtụ afọ.

  • O nwere ike ịbụ na obi gbawara gị mgbe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị gbasara. Otu nwaanyị aha ya bụ Raquel kwuru na iwe juru ya obi mgbe di ya hapụrụ ya ihe dị ka otu afọ na ọnwa isii gara aga. O kwuru, sị: “Obi gbawara m, ahụ́ ana-egbukwa m mgbu. Ihe a niile mere ka ezigbo ụjọ jide m.”

  • Ị̀ na-arịa ọrịa na-achọghị ịla ala? O nwere ike ịna-adị gị mgbe ụfọdụ otú ọ dị Job mgbe ọrịa ji ya aka ọjọọ. Job kwuru gbasara ndụ ọ dị, sị: “Ajụwo m ya; agaghị m adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” (Job 7:16) O nwekwara ike na-adị gị otú ọ dị otu nwoke aha ya bụ Luis. Nwoke a akarịala afọ iri asatọ, ya na ọrịa na-alụkwa. O kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka ọnwụ bịa gburu m.”

  • O nwekwara ike ịbụ na mmadụ nwụnahụrụ gị, gị ana-achọ onye ga-akasi gị obi. Otu nwoke aha ya bụ Robert kwuru otú obi dị ya mgbe ụgbọelu nwa ya nwoke nọ na ya kpọkara, nwa ya ahụ anwụọ. O kwuru, sị: “Ọ dịcha m ka ọ̀ bụ ná nrọ. Obi gbawara m, ya ana-adịkwa m ka onye a manyere ogologo mma agha n’ahụ́ otú ahụ Baịbụl kwuru.”—Luk 2:35.

Robert, Luis, Raquel na Julian mechara nweta Onye kasiri ha obi. Ọ bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Olee otú Chineke si akasi mmadụ obi? Ọ̀ ga-akasi gịnwa obi ma nsogbu bịara gị?