Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-achọ Ịnọ ná Nchebe

Ndị Na-achọ Ịnọ ná Nchebe

Ndị Na-achọ Ịnọ ná Nchebe

“Ngwụsị nke Narị Afọ nke 20 emebeghị ka mwụfu ọbara na mkpagbu ndị na-amanye ndị mmadụ ịgba ọsọ maka ndụ ha kwụsị. Ọtụtụ iri nde mmadụ anọrọwo n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ nakwa n’ebe ndị ọzọ bụ́ ebe obibi nwa oge malite Narị Afọ Iri ọhụrụ, na-atụ egwu na a ga-egbu ha ma ha nwaa anwaa laghachi n’ebe obibi ha.”—Bill Frelick, Kọmitii Na-ahụ Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ nke United States.

JACOB nwere ihe na-agụsi ya agụụ ike. Ebe ndị mmadụ pụrụ ibi n’udo, ebe bọmbụ na-agaghị egbu ewu ezinụlọ ha, nakwa ebe ọ pụrụ ịga akwụkwọ, na-agụsi ya agụụ ike.

Ndị obodo ya gwara ya na e nwere ebe dị otú ahụ n’ezie, ọ bụ ezie na o tere aka. Nna ya kwuru na ịga ebe ahụ dị oké ize ndụ, n’ihi na ụfọdụ ndị anwụwo n’ụzọ n’ihi akpịrị ịkpọ nkụ na agụụ. Ma mgbe onye agbata obi ha nke e gburu di ya kpọọrọ ụmụ ya abụọ zọlie ije, Jacob kpebiri na nanị ya ga-eme njem ahụ.

Jacob ejighị nri ma ọ bụ ákwà, n’ụbọchị nke mbụ kwa, ọ dịghị ihe ọzọ o mere ma ọ bụghị ịgba ọsọ. Ozu ụmụ mmadụ jupụtara n’ebe nile n’ụzọ ahụ ha si agbaga n’ebe dị nchebe. N’echi ya, o zutere otu nwanyị si n’obodo ya bụ́ onye kwuru na ọ pụrụ isonyere ya na ndị ibe ya. Ha jere ije ruo ọtụtụ ụbọchị, gafee ọtụtụ obodo nta ọ na-adịghị onye bi na ha. N’otu oge, ha aghaghị ịgafe ebe e ligasịrị ogbunigwe, bụ́ ebe e gburu otu onye so n’ìgwè ha. Ha jiri ahịhịa mere nri.

Mgbe ụbọchị iri gasịrị, ndị mmadụ malitere ịnwụ n’ihi agụụ na ike ọgwụgwụ. Ntakịrị oge mgbe e mesịrị, ụgbọelu tụrụ ha bọmbụ. N’ikpeazụ, Jacob gafere ókè mba ha ma ruo n’otu ogige ndị gbara ọsọ ndụ. Ọ na-aga akwụkwọ ugbu a, ụda ụgbọelu adịghịzi emenye ya ụjọ. Ụgbọelu nile ọ na-ahụ ugbu a na-ebu nri kama ibu bọmbụ. Ma agụụ ezinụlọ ya na-agụ ya, ọ ga-amasịkwa ya ịlaghachi n’ụlọ ha.

E nwere ọtụtụ ndị yiri Jacob gburugburu ụwa. Agha etisasịwo ndụ nke ọtụtụ n’ime ha, agụụ na-agụkwa ha, akpịrị na-akpọkwa ha nkụ. Ọ bụ ole na ole n’ime ha bitụworo ndụ ezinụlọ dị mma, ọtụtụ n’ime ha agaghịkwa alaghachi n’ụlọ ha ma ọlị. Ha bụ ndị kasị daa ogbenye n’ụwa.

Kọmishọna Ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ kewara ndị ogbenye a na-agagharị agagharị n’ìgwè abụọ. A na-akọwa onye gbara ọsọ ndụ dị ka onye si ná mba ya gbapụ n’ihi egwu kwesịrị ekwesị maka mkpagbu ma ọ bụ ime ihe ike. N’otu aka ahụkwa, onye na-enweghịzi ebe obibi n’obodo ya bụ onye a manyere ịhapụ ebe obibi ya n’ihi agha ma ọ bụ oké ihe ize ndụ ndị yiri ya, ma ọ ka bi ná mba ya. *

Ọ dịghị onye maara kpọmkwem mmadụ ole gbara ọsọ ndụ na ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha na-agbalị ịkpata ihe ha ji adị ndụ n’ogige ndị na-adịghị mma, ma ọ bụ ndị ole bụ́ na-awagharị n’enweghị enyemaka, na-achọ nchebe. Dị ka ndị ụfọdụ na-ekwu, ngụkọta ọnụ ọgụgụ ha n’ụwa nile nwere ike ịbụ ihe dị ka nde mmadụ 40, ọkara n’ime ha bụkwa ụmụaka. Olee ebe ha nile si?

Nsogbu nke Oge Anyị

Nsogbu nke ịgba ọsọ ndụ gbanwere ná ngwụsị nke Agha Ụwa Mbụ. Mgbe agha ahụ bisịrị, e tisasịrị alaeze ukwu dị iche iche, kpagbuokwa agbụrụ ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ. N’ihi ya, ọtụtụ nde ndị Europe gbagara ná mba ndị ọzọ maka nchebe. Agha Ụwa nke Abụọ—nke bibiri ihe karịa nke mbụ—mere ka ọtụtụ nde ndị ọzọ si n’ebe obibi ha gbapụ. Kemgbe 1945, agha aghọkwuola nke a kpaara ókè, ma ọ ka na-akpaghasịkwa ndụ ndị nkịtị bụ́ ndị agha ahụ na-emetụta.

“Ọ bụ ezie na agha na-eme mgbe nile ka e nwee ndị gbara ọsọ ndụ, ọ bụ nanị na narị afọ nke iri abụọ ka agha mba na mba metụtaworo ndị nile bi ná mba ndị ahụ,” ka Gil Loescher na-akọwa n’akwụkwọ ya e bipụtara n’afọ 1993 bụ́ Beyond Charity—International Cooperation and the Global Refugee Crisis. “Mwepụ e wepụrụ ịkpa ókè n’etiti ndị na-alụ ọgụ na ndị na-adịghị alụ ọgụ mere ka e nwee ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị gbara ọsọ ndụ bụ́ ndị chọsiri ike ka ha gbanahụ mbibi ndị ime ihe ike a na-akparaghị ókè na-akpata.”

Ọzọkwa, ọtụtụ n’ime agha ndị a na-alụ taa bụ agha obodo bụ́ ndị na-emetụta n’ụzọ dị ukwuu ọ bụghị nanị ndị ikom toruworo ije agha kamakwa ndị inyom na ụmụaka. N’ịbụ ndị esemokwu agbụrụ na nke okpukpe ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike meworo ka ha ka njọ, ụfọdụ n’ime ọgụ ndị a yiri ndị na-agaghị ebi ebi. N’otu mba Africa, bụ́ ebe agha obodo a na-alụ na ya ugbu a dịruworo afọ 18, e nwere nde mmadụ anọ na-enweghịzi ebe obibi n’obodo ha, ebe ọtụtụ narị puku ndị ọzọ gbagaworo ná mba ọzọ.

Dị ka ọ na-adị mgbe nile, nanị ụzọ ndị nkịtị agha meworo ka ike gwụ ha pụrụ isi gbanahụ ime ihe ike ahụ bụ isi n’ebe obibi ha gbapụ. “Ndị gbara ọsọ ndụ na-ahapụ ala nna ha ma chọọ ka a nabata ha ná mba ọzọ, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ ihe ha chọrọ ma ọ bụ n’ihi ịchọ ebe dị ha mma n’ahụ́, kama n’ihi na ọ dị mkpa,” ka akwụkwọ bụ́ The State of the World’s Refugees 1997-98 na-akọwa. Otú ọ dị, e nwere ike ọ gaghị adịcha mfe n’ụbọchị ndị a mmadụ ịbụ onye a nabatara ná mba ọzọ.

N’afọ ndị 1990, ọnụ ọgụgụ ndị gbara ọsọ ndụ n’ụwa nile si na nde 17 dalataruo nde 14. Otú ọ dị, ihe a yiri ka ọ bụ ọnọdụ ka mma abụghị otú ọ dị n’ezie. E mere atụmatụ na n’ime iri afọ ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghịzi ebe obibi n’obodo ha ruru n’agbata nde 25 na nde 30. Gịnị na-eme?

Ịbụ onye ndị ọchịchị nabatara dị ka onye gbara ọsọ ndụ na-esiwanyezi ike n’ihi ọtụtụ ihe. Ọtụtụ mba nwere ike ha agaghị adịcha njikere ịnabatakwu ndị gbara ọsọ ndụ, n’ihi na ha apụghị ịnagide ọnụ ọgụgụ buru ibu na-enubata ma ọ bụ n’ihi na ha na-enwe ezi nchegbu na ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị gbara ọsọ ndụ pụrụ iweta nsogbu akụ̀ na ụba na nke ọchịchị. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ndị nkịtị egwu ji adịghịdị enwe ume, nri, ma ọ bụ ego iji gaa ogologo ije ruo n’ókè mba ha. Nanị ihe ha pụrụ ime bụ ịgbaga n’ebe dị nchebe karị n’ime mba ha.

Ọnụ Ọgụgụ Na-arịwanye Elu nke Ndị Gbara Ọsọ Ndụ n’Ihi Ọnọdụ Akụ̀ na Ụba

Tinyere ọtụtụ nde ndị gbara ọsọ ndụ n’eziokwu, e nwere ọtụtụ nde ndị ọzọ dara ogbenye bụ́ ndị na-achọ ime ka ndụ ha ka mma site nanị n’otu ụzọ ha maara—ịkwaga ná mba ebe ọnọdụ ibi ndụ ka mma.

Na February 17, 2001, otu ụgbọ mmiri ochie tara nchara kpụrụ ikè n’ala mmiri n’ụsọ oké osimiri France. O bu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka, bụ́ ndị nọworo n’oké osimiri ruo ihe dị ka otu izu n’erighị nri. Ha kwụrụ $2,000 n’isi otu onye maka njem a dị ize ndụ, n’amaghịdị mba ha na-aga. Onyeisi ụgbọ mmiri ahụ na ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ gbafuru ozugbo ha kwụsịchara ụgbọ mmiri ahụ n’ụsọ oké osimiri ahụ. Ma ọ dabara nke ọma na a napụtara ndị ahụ ụgbọ mmiri ahụ bu bụ́ ndị ụjọ ji, gọọmenti France kwere nkwa ime ihe n’arịrịọ ha maka ichebe ha. Ọtụtụ nde ndị yiri ha na-anwa ime njem ndị dị otú ahụ kwa afọ.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị a na-akwapụ ná mba ha n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba ji ọchịchọ obi ha na-eche ihe isi ike ndị tara akpụ nakwa ọnọdụ amaghị ihe ga-adakwasị ha ihu. N’ụzọ ụfọdụ, ha na-atụtụkọta ego maka njem ahụ n’ihi na n’ala ha, ịda ogbenye, ime ihe ike, ịkpa ókè, ma ọ bụ ndị ọchịchị nchịgbu—nakwa mgbe ụfọdụ ha anọ—na-eme ka ndụ yie nke olileanya na-adịghị na ya.

Ọtụtụ mmadụ na-anwụ ná mgbalị ha ịdị ndụ ka mma. N’ime iri afọ gara aga, mmiri riri ihe dị ka mmadụ 3,500 na-akwaga ná mba ọzọ ka ha na-anwa ịgafe Ọwa Mmiri Gibraltar nke si Africa banye Spen. N’afọ 2000, ndị China 58 nwụrụ n’ihi ekutechaghị ume mgbe ha zoro n’otu gwongworo si Belgium buru ha na-aga England. Ọtụtụ ndị ọzọ na-akwaga mba ọzọ na-anwụ na Sahara n’ihi akpịrị ịkpọ nkụ mgbe nkịrịka gwongworo ha ndị na-ebu oké ibu mebiri n’etiti ọzara ahụ.

N’agbanyeghị ihe ize ndụ ndị dị na ya, ọnụ ọgụgụ ndị na-agba ọsọ ndụ n’ụwa n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba na-arị elu n’ike n’ike. A na-ebuba ihe dị ka ọkara nde mmadụ na nzuzo na Europe kwa afọ; na-ebubakwa 300,000 ndị ọzọ na United States. Laa azụ na 1993, Òtù Na-ahụ Maka Ụba Mmadụ nke Mba Ndị Dị n’Otu mere atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ndị si ná mba ha na-akwaga mba ọzọ n’ụwa nile dị 100 nde, bụ́ ndị ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ha biriwooro na Europe nakwa na United States. Kemgbe ahụ, obi abụọ adịghị ya na ọnụ ọgụgụ ahụ amụbawo nke ukwuu.

Ọtụtụ n’ime ndị a kwagara ná mba ọzọ adịtụghị achọta nchebe ahụ ha na-achọ. Ọ bụkwa mmadụ ole na ole gbara ọsọ ndụ na-achọta ebe mgbaba dị nchebe ma na-adịgide adịgide. Ọtụtụ mgbe, ndị a na-awagharị awagharị na-eji otu nsogbu agbanwere ọzọ. Isiokwu na-esonụ ga-elebakwu anya n’ụfọdụ n’ime nsogbu ndị a na ihe ndị bụ́ isi na-akpata ha.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 N’usoro isiokwu ndị a, mgbe anyị zoro aka ná ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha, anyị adịghị agụnye nde mmadụ 90 ruo 100 nde bụ́ ndị a manyeworo ịgbahapụ ebe obibi ha n’ihi atụmatụ ọrụ mmepe ndị dị ka iwu ihe mgbochi mmiri, igwupụta akụ̀ dị n’ime ala, ịkụ osisi, ma ọ bụ ọrụ ugbo.