Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Nsogbu Mgbanwe Mberede n’Ọnọdụ Uche

Inwe Nsogbu Mgbanwe Mberede n’Ọnọdụ Uche

Inwe Nsogbu Mgbanwe Mberede n’Ọnọdụ Uche

NSOGBU mgbanwe mberede n’ọnọdụ uche jupụtara ebe nile n’ụzọ dị ịtụnanya. Dị ka ihe atụ, a na-eme atụmatụ na ihe karịrị nde mmadụ 330 n’ụwa nile nwere oké ịda mbà n’obi, bụ́ nsogbu a na-eji oké obi mgbarụ na enweghịzi mmasị n’ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị amara. E mewo atụmatụ na n’ime afọ 20 n’ihu, ọ bụ nanị ọrịa obi na nke akwara bụ ọrịa ga-aka ịda mbà n’obi ejupụta ebe nile. Ka a sịkwa ihe mere ụfọdụ ndị ji ekwu na n’ime ọrịa uche ndị e nwere, ndị na-arịa ụdị ọrịa uche a dị ọtụtụ otú ndị na-enwe àzụ̀zụ̀ dị ọtụtụ.

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e lekwasịwo nsogbu nke ihe imetụ mmadụ n’isi anya n’ụzọ ka ukwuu. Ihe e ji ama ya bụ na onye nwere ya na-eme ya daa mbà n’obi n’oge a, n’oge ọzọ ya emewe ara ara. “N’oge ahụ ị dara mbà n’obi,” ka otu akwụkwọ nke Òtù Ọgwụ na Ahụ́ Ike nke America bipụtara n’oge na-adịbeghị anya na-ekwu, “ị pụrụ ịdị na-eche banyere igbu onwe gị. N’oge ị na-eme ara ara, e nwere ike ị gaghịzi na-eche echiche nke ọma, e nwekwara ike ị gaghị ahụ ihe ize ndụ ndị dị n’ihe ndị ị na-eme.”

Ọ dị ka ụdị nsogbu uche a ọ̀ na-emetụta pasent 2 nke ndị bi na United States, nke pụtara na e nwere ọtụtụ nde ndị nwere nsogbu ahụ ná mba ahụ nanị. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ nkịtị apụghị ịkọwa nhụsianya nke ndị nwere nsogbu mgbanwe mberede nke ọnọdụ uche.

Ịda Mbà n’Obi—Oké Obi Mgbarụ

Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị maara ihe inwe obi mgbarụ dị ka ya. Ka oge na-aga—ikekwe n’ime nanị awa ole na ole ma ọ bụ ụbọchị ole na ole—mmetụta ahụ na-adajụlata. Otú ọ dị, nsogbu nke ịda mbà n’obi na-adị njọ karị. N’ụzọ dị aṅaa? “Ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ndị na-adaghị mbà n’obi maara na obi mgbarụ anyị na-enwe na-emesị kwụsị,” ka Dr. Mitch Golant na-akọwa, “ma onye dara mbà n’obi na-eme obi dịtụ ya mma n’oge a, ọ̀ gbarụọ ya n’oge nke ọzọ, ọnọdụ uche ya na-agbanwe site n’oge ruo n’oge dị ka à ga-asị na ọ nọ n’ụgbọ okporo ígwè nke na-enweghị onye na-anya ya, n’amaghị otú ọ ga-esi pụta na ya ma ọ bụ mgbe ọ ga-apụta na ya—ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ ga-apụtadị apụta.”

Nsogbu nke ịda mbà n’obi pụrụ ịdị n’ụdị n’ụdị. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-ada mbà n’obi kpọmkwem n’oge ụfọdụ n’afọ—ọ na-abụkarị n’oge oyi. “Ndị nwere ụdị ịda mbà n’obi a na-akọ na ọnọdụ ha na-aka njọ ma ha biri ná mgbago mgbago nke ebe ugwu ụwa nakwa ma ọ bụrụ na ihu igwe agbachikwuo agbachi,” ka otu akwụkwọ nke òtù bụ́ People’s Medical Society dere, na-ekwu. “N’agbanyeghị na a na-ekwu na ọ bụ oge oyi mgbe ihu igwe na-agbachapụghị agbachapụ na-akpata ịda mbà n’obi nke a na-enwe kpọmkwem n’oge ụfọdụ n’afọ, n’ọnọdụ ụfọdụ, e kwuwo na ebe ọrụ gbara ọchịchịrị, ihu igwe gbachiri agbachi n’oge ọ na-ekwesịghị, nakwa ahụchaghị ụzọ nke ọma, na-eso akpata ya.”

Gịnị na-akpata nsogbu nke ịda mbà n’obi? Azịza ya edoghị anya. Ọ bụ ezie na n’ọnọdụ ụfọdụ, o yiri ka à na-eketa ya eketa, n’ọnọdụ ka ukwuu, ahụmahụ ndị mmadụ nwere ná ndụ yiri ka ọ̀ na-ekere òkè dị ukwuu. A chọpụtawokwa na ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị a na-ahụ nwere nsogbu a ji okpukpu abụọ karịa ọnụ ọgụgụ nke ụmụ nwoke. * Ma nke a apụtaghị na ụmụ nwoke adịghị enwekebe nsogbu ahụ. Kama nke ahụ, a na-eme atụmatụ na ndị ikom dị agbata pasent 5 na 12 ga-enwe nsogbu nke ịda mbà n’obi n’oge ụfọdụ ná ndụ ha.

Mgbe ụdị ịda mbà n’obi a jidere mmadụ, ọ na-emetụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ ya. Ọ “na-esite n’isi kpaghasịa ndụ gị,” ka otu onye nwere nsogbu ahụ nke aha ya bụ Sheila na-ekwu, “jiri nwayọọ na-eme ka ị gharazie inwe obi ike, ùgwù onwe onye, na ikike nke iche echiche nke ọma ma mee mkpebi, mgbe o jisikwara gị ike, ọ na-akpa gị aka ọjọọ iji mara ma ị ga-anagideli ya.”

E nwere oge ndị onye nwere nsogbu ahụ pụrụ inwetatụ onwe ya site n’ịkọrọ onye na-eji ọmịiko aṅa ntị mmetụta ndị ọ na-enwe. (Job 10:1) N’agbanyeghị nke ahụ, a ghaghị ikweta na mgbe ọ bụ mmiri ọgwụ ahụ́ kpatara ya, ịda mbà n’obi adịghị ebi nnọọ n’inwe nchekwube. N’ezie, n’ọnọdụ dị otú ahụ, onye na-arịa ọrịa a apụghị ịchịkwa obi mgbarụ ọ na-enwe. Ọzọkwa, ọnọdụ ahụ pụrụ iri onye na-arịa ya ọnụ dị nnọọ ka o riri ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya.

Tụlee banyere Paula, * bụ́ Onye Kraịst nke nagidere obi mgbarụ kpụ ọkụ n’ọnụ tupu a chọpụta na o nwere nsogbu nke ịda mbà n’obi. “Mgbe ụfọdụ, e nwesịa nzukọ Ndị Kraịst,” ka ọ na-ekwu, “m na-eji ọsọ gbaga n’ụgbọala m ma malite ibe ákwá, n’enweghị nnọọ ihe kpatara ya. M na-adị enwe nnọọ mmetụta siri ike nke owu ọmụma na ihe mgbu. N’agbanyeghị na ihe àmà nile na-egosi na m nwere ọtụtụ ndị enyi bụ́ ndị hụrụ m n’anya, achọpụtaghị m ya.”

Ihe yiri nke ahụ mere Ellen, bụ́ onye ịda mbà n’obi ya mere ka e nye ya àkwà n’ụlọ ọgwụ. “Enwere m ụmụ ndị nwoke abụọ, ndị nwunye ụmụ m abụọ bụ́ ndị mara mma, nakwa di m—ndị m maara na ha nile hụrụ m n’anya nke ukwuu,” ka ọ na-ekwu. Ezi uche kwesịrị ime ka Ellen mara na ndụ dị ụtọ nakwa na ndị ezinụlọ ya ji ya kpọrọ oké ihe. Ma mgbe mmadụ na ịda mbà n’obi na-alụ, echiche ọjọọ—n’agbanyeghị otú ọ bụruru nke ezi uche na-adịghị na ya—pụrụ ijupụta onye ahụ n’obi.

A gaghị eleghara mmetụta dị ukwuu ịda mbà n’obi nke otu onye pụrụ inwe n’ebe ndị ezinụlọ ya ndị ọzọ nọ anya. “Mgbe onye ị hụrụ n’anya dara mbà n’obi,” ka Dr. Golant na-ede, “ị pụrụ ịnọgide na-enwe echiche nke amaghị ihe echi ga-abụ, n’amaghị n’ezie mgbe onye ị hụrụ n’anya ga-esi n’ọnọdụ ịda mbà n’obi ya pụta, ma ọ bụ mgbe ọzọ ọ ga-ada mbà n’obi. Ị pụrụ inwe oké mwute—ọbụna ị pụrụ ịdị na-eru újú ma na-ewe iwe—na ndụ adịghịzikwa otú ọ dịbu, ma eleghị anya, na ọ ga-adịgide otú ahụ.”

Mgbe mgbe, ụmụaka pụrụ ịchọpụta mgbe nne ma ọ bụ nna ha dara mbà n’obi. “Nwa nke nne ya dara mbà n’obi na-aghọta nnọọ otú obi dị nne ya, ọ na-ejikwa nlezianya na-achọpụta obere mgbanwe ọ bụla,” ka Dr. Golant na-ede. Dr. Carol Watkins na-ekwu na ụmụaka ndị nne ma ọ bụ nna ha dara mbà n’obi “yiri ka hà ga-aka enwe nsogbu nke akparamàgwà, ihe isi ike n’ịmụta ihe, na nsogbu n’iso ndị ọgbọ na-emekọ ihe. E nwere ohere dị ukwuu na ha onwe ha ga-adakwa mbà n’obi.”

Nsogbu nke Ihe Imetụ Mmadụ n’Isi —Ọnọdụ nke Na-agbanwe Mgbe Nile

Ịda mbà n’obi bụ n’ezie nsogbu siri ike. Ma nsogbu ahụ na-aka njọ ma ọ bụrụ na ime ara ara esonyere ya. * ‘Otu ihe doro anya banyere onye ihe na-emetụ n’isi bụ na ọnọdụ uche ya na-agbanwe mgbe nile,’ ka otu onye nwere nsogbu ahụ nke aha ya bụ́ Lucia, na-ekwu. N’oge ndị nwere nsogbu a na-eme ara ara, ka obere akwụkwọ akụkọ bụ́ The Harvard Mental Health Letter na-ekwu, ha “pụrụ ịbụ ndị na-etinyekarị ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha na ndị na-achọkarị ịchịkwa ndị ọzọ, obi ụtọ gabigara ókè ha nwere pụrụ ịgbanwe na mberede gaa n’ahụ́ mgbakasị ma ọ bụ ọnụma.”

Lenore na-echeta ahụmahụ o nwere mgbe ọnọdụ uche ya mere ka ọ malite ime ara ara. “Ike bịara jupụta m nnọọ n’ahụ́,” ka ọ na-ekwu. “Ọtụtụ ndị na-akpọ m odogwu nwanyị. Ndị mmadụ na-asị, ‘Ọ dị m ka m bụrụ gị.’ Ana m enwekarị nnọọ ike dị ka à ga-asị na m pụrụ ịrụzu ihe ọ bụla. Anọ m na-enwe mmega ahụ́ ike ike. Ana m arụ nnọọ ọrụ dịịrị m n’ụbọchị n’agbanyeghị na m na-ehi nanị obere ụra—awa abụọ ma ọ bụ atọ n’abalị. N’agbanyeghị nke ahụ, ana m anọgide na-enwe ike dị ukwuu ma m teta.”

Otú ọ dị, ka oge na-aga, Lenore malitere inwe obi mgbarụ. “N’oge obi ụtọ m ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasịnụ,” ka ọ na-ekwu, “ana m amalite inwe ahụ́ mgbakasị, dị ka injin ụgbọala nke a na-apụghị ịgbanyụ agbanyụ. N’otu ntabi anya, ana m akwụsị inwe omume enyi ma malite ime ike ike na imebi ihe. Ana m agwakasị ndị ezinụlọ m okwu ahụ́ n’enweghị nnọọ ihe kpatara ya. Oké iwe na-amalite iwe m, m wee kpọọ ihe ọ bụla asị, adịghịkwa m ekwe nchịkwata ma ọlị. Mgbe m kpasịrị àgwà n’ụzọ a na-emenye ụjọ, ike na-abịa gwụ m na mberede, m bewe ákwá, ma daa nnọọ mbà n’obi. Ana m enwe mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe na onye dị obi ọjọọ. N’aka nke ọzọ, apụrụ m ịlaghachi n’ọnọdụ uche mbụ m nke inwe nnọọ oké obi ụtọ, dị ka à ga-asị na o nweghị ihe merenụ ma ọlị.”

Mgbanwe akparamàgwà nke onye ihe na-emetụ n’isi na-agbagwoju ndị òtù ezinụlọ ya anya. Mary, bụ́ onye ihe na-emetụ di ya n’isi, na-ekwu, sị: “Ọ pụrụ ịbụ ihe na-agbagwoju anya ịhụ ka di m nwere obi ụtọ ma na-ekwu nnọọ okwu ugbu a, na mberede, ya adaa mbà n’obi ma nọọrọ onwe ya. O siiri anyị nnọọ ike ikweta na o nwechaghị ike ịchịkwa nke a.”

N’ụzọ dị ịtụnanya, ụdị nsogbu uche a na-ewutekarị onye nwere ya otú o si ewute ndị ezinụlọ ya—ma ọ bụrụdị na ọ kaghị ewute onye ahụ nwere nsogbu ahụ. “Ọ na-adị m ka m bụrụ ndị ahụ m na-ahụ bụ́ ndị nwere ike ịchịkwa ndụ ha nakwa ndị ndụ ha kwụ chịm,” ka otu onye ihe na-emetụ n’isi nke aha ya bụ Gloria, na-ekwu. “Ịkwụ chịm bụ ebe ndị ihe na-emetụ n’isi na-aga nleta. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị bi ebi n’ebe ahụ n’ezie.”

Gịnị na-akpata nsogbu nke ihe imetụ mmadụ n’isi? Mkpụrụ ndụ ihe nketa pụrụ iso akpata ya—mkpụrụ ndụ ihe nketa nke siri ike karịa nke na-akpata ịda mbà n’obi. “Dị ka nnyocha ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị mere, na-egosi,” ka Òtù Ọgwụ na Ahụ́ Ike nke America na-ekwu, “ndị òtù ezinụlọ—nne na nna, ụmụnne, ma ọ bụ ụmụ—nke ndị nwere ụdị ịda mbà n’obi nke na-eso ụdị nsogbu uche a, yikarịrị ka hà ga-enwe ụdị nsogbu uche a n’ụzọ ji okpukpu 8 ruo 18 karịa ndị òtù ezinụlọ nke ndị ahụ́ dị mma. Tụkwasị na nke ahụ, inwe onye òtù ezinụlọ nke ihe na-emetụ n’isi, pụrụ ime ka ohere e nwere na ị ga-enwe oké ịda mbà n’obi rịkwuo elu.”

N’adịghị ka ịda mbà n’obi, nsogbu nke ihe imetụ mmadụ n’isi yiri ka ọ̀ na-emetụta ma ndị ikom ma ndị inyom n’ụzọ hà nhata. Mgbe mgbe karị, ọ na-ebido mgbe mmadụ katatụwara ahụ́, ma a hụwo ndị nọ n’afọ iri na ụma na ọbụnakwa ụmụaka ndị ihe na-emetụ n’isi. Ka o sina dị, ịtụle ihe mgbaàmà ya ma mara kpọmkwem na ọ bụ ụdị nsogbu uche a pụrụ ịbụ nnọọ ihe ịma aka ọbụna nye onye dọkịta. “N’ime ọrịa uche ndị e nwere, nsogbu nke ihe imetụ mmadụ n’isi, yiri ogwumagala, ọ na-agbanwe ihe mgbaàmà ya n’ahụ́ ndị na-arịa ya, nakwa n’oge nke ọ bụla o jidere mmadụ,” ka Dr. Francis Mark Mondimore nke nọ na Mahadum Nkà Mmụta Ọgwụ nke Johns Hopkins, dere. “Ọ bụ ihe na-eyi egwu nke a na-amaghị mgbe ọ ga-ewere ọnọdụ, bụ́ nke pụrụ ijide mmadụ na mberede ma mee ka ọ daa mbà n’obi, e mesịakwa ya akwụsị ruo ọtụtụ afọ—ma bịaghachizie n’ụdị na-eme ka onye ahụ mewe ara ara.”

N’ụzọ doro anya, nsogbu mgbanwe mberede n’ọnọdụ uche na-esi ike nchọpụta, ọ pụkwara ọbụna isi ike nnagide karị. Ma olileanya dịịrị ndị nwere nsogbu a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 N’otu akụkụ, nke a pụrụ ịbụ n’ihi ịda mbà n’obi ha na-enwekarị mgbe ha mụsịrị nwa nakwa mgbanwe mmiri ọgwụ ahụ́ ha na-enwe n’oge ha kwụsịrị ịhụ nsọ. Ọ pụkwara ịbụ n’ihi na ndị inyom na-agakarị ka e lebara ahụ́ ike ha anya, n’ihi ya kwa, a na-achọpụta mgbe ha nwere nsogbu ahụ.

^ par. 11 A gbanwewo aha ụfọdụ pụtara n’usoro isiokwu a.

^ par. 16 Ndị dọkịta na-akọ na mgbe mgbe, mgbanwe ọnọdụ uche nke ọ bụla na-adịgide ruo ọtụtụ ọnwa. Otú ọ dị, ha na-ekwu na ụfọdụ ndị “ọnọdụ uche ha na-agbanwe ngwa ngwa” na-eme ha datụ mbà n’obi, ha emetụ ara ara ọtụtụ ugboro n’afọ. N’ọnọdụ ndị a na-adịghị ahụkebe, ndị nwere nsogbu ahụ pụrụ isi n’otu ọnọdụ uche gaa n’ọzọ n’ime awa 24.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Ịkwụ chịm bụ ebe ndị ihe na-emetụ n’isi na-aga nleta. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị bi ebi n’ebe ahụ n’ezie.”—GLORIA

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Ihe Mgbaàmà nke Oké Ịda Mbà n’Obi *

Ịda mbà n’obi, n’oge ka ukwuu n’ụbọchị, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị, ruo ma ọ dịkarịa ala izu abụọ

Mmadụ enweghịzi mmasị n’ihe omume ndị na-atọbu ya ụtọ

Ibu ibu ma ọ bụ ịta ahụ́ nke ukwuu

Ihi oké ụra ma ọ bụ nsogbu nke ehighị ụra nke ọma

Ime ihe oké ọkụ ọkụ ma ọ bụ n’ụzọ jụrụ nnọọ oyi

Oké ike ọgwụgwụ, n’enweghị nnọọ ihe a ma kpatara ya

Mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe na/ma ọ bụ inwe obi amamikpe na-ekwesịghị ekwesị

Enwechaghịzi ike itinye uche n’ihe

Mmadụ iche echiche mgbe mgbe banyere igbu onwe ya

Ụfọdụ n’ime ihe mgbaàmà ndị a pụkwara ịbụ ihe mgbaàmà nke dysthymia—ụdị ịda mbà n’obi na-adịghị ala ala bụ́ nke na-adịghị esiru ike ka oké ịda mbà n’obi

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 31 Ihe a e depụtara n’ebe a bụ iji nye ihe ọmụma dị nkenke banyere nsogbu a, ọ bụghị ihe mmadụ ga-agbakwasị ụkwụ kwuo na ya nwere nsogbu a. Ọzọkwa, ụfọdụ n’ime ihe mgbaàmà ndị a n’onwe ha pụrụ ịbụ ihe mgbaàmà nke nsogbu ndị ọzọ na-abụghị ịda mbà n’obi.