Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Afọ Ole Ka Ị Pụrụ Ịdịrụ Ndụ?

Afọ Ole Ka Ị Pụrụ Ịdịrụ Ndụ?

Afọ Ole Ka Ị Pụrụ Ịdịrụ Ndụ?

“Anụ ahụ́ ya ga-adị ọhụrụ karịa nke nwata; ọ na-alaghachiru ụbọchị okorobịa ya.”—JOB 33:25.

NKỊTA nwụọ mgbe ọ dị afọ 10 ma ọ bụ afọ 20, ikekwe, o mechaala ihe ka ukwuu n’ihe nkịta na-eme ná ndụ. Ọ pụrụ ịbụ na ọ zụọla ụmụ, chụọ nwamba, zoo ọkpụkpụ, ma chebe onye nwe ya. Ma, mmadụ nwụọ mgbe ọ dị afọ 70 ma ọ bụ 80, ọ bụ nanị ihe ole na ole n’ime ihe ndị ọ pụrụ ime ka afọ ole ahụ zuuru ya ime. Ọ bụrụ na o nwere mmasị n’egwuregwu, ikekwe ọ bụ nanị otu ụdị egwuregwu ma ọ bụ abụọ ka ọ mụtara nke ọma n’ime oge ahụ. Ọ bụrụ na o nwere mmasị n’ịkpọ egwú, ikekwe ọ bụ nanị otu ngwá egwú ma ọ bụ abụọ ka ọ mụtara ịkpọ nke ọma. Ọ bụrụ na ọ na-amasị ya iji asụsụ ndị mmadụ na-agwa ha okwu, o nwere ike ịbụ nanị asụsụ abụọ ma ọ bụ atọ ka ọ mụtara ịsụ nke ọma. A sị nnọọ na ọ dịtekwuru ndụ aka, ọ gaara anụwo ụtọ ọtụtụ ihe—ịmatakwu ndị mmadụ, ịmata ihe ndị ọ na-amabeghị, na ịbịaru Chineke nso.

Ị pụrụ iche, sị, ‘Gịnị mere Chineke ga-eji kenye mmadụ ụbụrụ nke ga-eme ka o nwee ike ịnụ ụtọ ọtụtụ ihe ma nyezie ya afọ ndụ nke na-agatụghị ezuru ya ịnụ ụtọ ihe ndị ahụ?’ Ọ bụrụ na mmadụ enyochaa ihe ndị e kere eke, ọ ga-ahụ nnọọ na a sara anya mmiri kee ha. Ma, ndụ dị mkpụmkpụ mmadụ na-ebi yiri ka ò kwekọghị n’ihe a sara anya mmiri kee. Ị pụkwara iche, sị, ‘Gịnị mere Chineke ga-eji kenye mmadụ àgwà ọma ndị dị ka ikpe ziri ezi na ọmịiko, ma n’otu mgbe ahụ, kenye ha ọchịchọ ime ihe ọjọọ?’

Ị hụ ọmarịcha ụgbọala ahụ́ ya kụkpọrọ akụkpọ, obi gị ọ̀ na-agwa gị na ọ bụ otú ahụ ka e si rụọ ya? Mbanụ! Obi abụọ adịghị ya na obi gị ga-agwa gị, sị, ‘Ihe a abụghị otú a chọrọ ka ụgbọala a dịrị. Ọ ga-abụrịrị na a rụrụ ya nke ọma, e mesịa, mmadụ emebie ya.’ N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe anyị chebaara ndụ a dị ịtụnanya anyị ketara echiche, ọ dịghị ihe ọzọ obi anyị pụrụ ịgwa anyị ma ọ́ bụghị na otú ọ dị ugbu a abụghị otú e zubere ka ọ dịrị. Ndụ dị mkpụmkpụ anyị na-adị na ọchịchọ anyị na-enwe ime ihe ọjọọ yiri nkụkpọ a kụkpọrọ ụgbọala ahụ. O doro anya na ọ dị onye mebiri ihe nketa ụmụ mmadụ. Ònye mebiri ya? Ihe àmà ndị e nwetara na Bible na-atụ otu onye aka.

Ọ bụrụ na e kere ụmụ mmadụ ịdị ndụ ebighị ebi, olee onye mesịziri mebiere mmadụ nile ihe nketa ha a? Ọ dịghị onye ọzọ ọ ga-abụ ma ọ́ bụghị nna mbụ nke mmadụ, bụ́ onye anyị nile si n’agbụrụ ya pụta. Ihe onye ọ bụla ọzọ nwere ike imebi bụ nanị ihe nketa nke otu agbụrụ—ya bụ, nke ụmụ nke ya. N’ihi ya, Okwu Chineke, bụ́ Bible, kwekọrọ n’ihe ndị a chọpụtarala, mgbe o kwuru, sị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ [Adam, bụ́ mmadụ mbụ] bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile.” (Ndị Rom 5:12) Ya mere, Akwụkwọ Nsọ mara Adam ikpe dị ka onye ọ bụ ya mebiri ihe nketa anyị. Mgbe Chineke kere mmadụ, afọ ole ka o kere ya ka ọ dịruo ndụ?

Ịghọta Afọ Ole Chineke Kere Mmadụ Ka Ọ Dịruo Ndụ

Mgbe Bible kwuru na ọnwụ ‘batara n’ụwa,’ ọ na-egosi na mgbe e kere mmadụ, e keghị ya ịnwụ anwụ. Ihe mere ụmụ mmadụ ji aka nká, na-anwụkwa anwụ bụ n’ihi na nwoke mbụ ahụ nupụụrụ Chineke isi. N’aka nke ọzọ, e keghị ụmụ anụmanụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.—Jenesis 3:21; 4:4; 9:3, 4.

E kere ụmụ mmadụ ịdị iche n’ebe ụmụ anụmanụ dị. Anyị dị elu karịa ụmụ anụmanụ, dị nnọọ ka ndị mmụọ ozi si dị elu karịa ụmụ mmadụ. (Ndị Hibru 2:7) Ụmụ mmadụ adịghị ka ụmụ anụmanụ. E kere ụmụ mmadụ “n’onyinyo Chineke.” (Jenesis 1:27) Ọzọkwa, Bible kpọrọ Adam “nwa Chineke,” ma ọ dịghị anụmanụ a kpọrọ nwa Chineke. (Luk 3:38) N’ihi ya, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji kwere na e keghị mmadụ ịka nká na ịnwụ anwụ. Chineke adịghị anwụ anwụ, o keghịkwa ụmụ ya ịnwụ anwụ.—Habakuk 1:12; Ndị Rom 8:20, 21.

Ihe ọzọ mere ka anyị ghọta afọ ole Chineke kere mmadụ ka ọ dịruo ndụ bụ ihe ndị e dekọrọ banyere mmadụ ndị mbụ dịrị ndụ. Ndị mmadụ n’oge ahụ dịrị ndụ ruo ọtụtụ narị afọ tupu ha akawa nká. Adam dịrị ndụ ruo narị afọ itoolu na iri atọ. Narị afọ ole na ole mgbe Adam nwụsịrị, nwa Noa bụ́ Shem dịruru nanị narị afọ isii, nwa nwa Noa bụ́ Apakshad adịruokwa narị afọ anọ na iri atọ na asatọ. * (Jenesis 5:5; 11:10-13) Mgbe e mesịrị, Ebreham dịruru otu narị afọ na iri asaa na ise. (Jenesis 25:7) O yiri ka mmehie ò ji nwayọọ nwayọọ na-enwe mmetụta dị njọ n’afọ ndụ ụmụ mmadụ. Site n’oge Adam gawa, ka a na-enwekwu ọgbọ ọhụrụ ka afọ ndụ ụmụ mmadụ na-ebelatakwu. Ma, ná mmalite, e kere ụmụ mmadụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ya mere, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị ịjụ, sị, ‘Chineke ọ̀ ka chọrọ ka ụmụ mmadụ dịgide ndụ n’anwụghị anwụ n’ụwa a?’

Nnwere Onwe Pụọ n’Ịka Nká

Ebe ọ bụ na Jehova Chineke ekwuola na onye ọ bụla na-enupụrụ ya isi ga-akwụ ụgwọ mmehie ya site n’ịnwụ, ọ bịara yie ka ụmụ Adam hà nọ n’ọnọdụ olileanya na-adịghị na ya. (Jenesis 2:17) Ma, Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ mere ka e nwee olileanya site n’ikwu na ọ dị onye ga-akwụ ụgwọ iji tọpụ anyị n’agbụ nke ịka nká. Anyị na-agụ, sị: “Dọpụta ya n’ịrịda n’olulu, achọtawo m ihe mgbapụta. Anụ ahụ́ ya ga-adị ọhụrụ karịa nke nwata; ọ na-alaghachiru ụbọchị okorobịa ya.” (Job 33:24, 25; Aịsaịa 53:4, 12) N’ebe a, Bible mere ka anyị nwee olileanya dị ebube—olileanya na ọ dị onye ga-abịa kwụọ ihe mgbapụta iji tọpụ anyị n’agbụ nke ịka nká!

Olee onye ga-akwụli ihe mgbapụta a? Ọnụ ahịa ya karịrị ihe ego ga-azụtali. Mgbe Bible na-ekwu banyere ihe ụmụ mmadụ na-ezughị okè ga-emeli n’akụkụ a, ọ sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla ga-agbapụta nwanne ya ma ọlị, ọ gaghị enye Chineke ihe mgbapụta ya: . . . ka o wee dịgide ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 49:7-9) Otú ọ dị, Jizọs Kraịst nwere ihe dị oké ọnụ ahịa karịa ego. Mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ bụ mmadụ zuru okè n’ihi na ebe ọ bụ Ọkpara Chineke, e chebere ya ka ọ ghara iketa mmehie Adam. Jizọs kwuru na ya bịara ‘inye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ N’oge ọzọ, o kwuru, sị: “Abịawo m ka ha wee nwee ndụ, ka ha wee nweekwa ya n’ụba.”—Matiu 20:28; Jọn 10:10.

Olileanya nke ndụ ebighị ebi bụ otu ihe Jizọs kwusiri okwu ya ike mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma. Pita, bụ́ onye ji ikwesị ntụkwasị obi soo ụzọ Ya, gwara ya n’otu oge, sị: “I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:68) Gịnị ka Bible bu n’uche mgbe ọ na-ekwu banyere ndụ ebighị ebi?

Ndụ nke Na-agaghị Agwụ Agwụ

Ndịozi Jizọs tụrụ anya ibi ndụ na-agaghị agwụ agwụ n’eluigwe dị ka ndị ha na Jizọs ga-eso chịa n’Alaeze ya. (Luk 22:29; Jọn 14:3) Ma, ọtụtụ mgbe, Jizọs kwuru banyere nzube Chineke maka ụwa. (Matiu 5:5; 6:10; Luk 23:43) Ya mere, ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ na ihe ndị ọ kụziri banyere ndụ ebighị ebi na-agba akaebe na nkwa ahụ Chineke kwere site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma ọtụtụ narị afọ tupu Jizọs abịa n’ụwa, ga-emezurịrị. Aịzaịa dere, sị: “O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.” (Aịsaịa 25:8) Ndụ ụmụ mmadụ na-adị agaghịzi abụ nke mmadụ ga-anọ n’ùjú ndụ ya nanị afọ ole na ole ma malite gbadawa ruo mgbe ọ ga-aka nká.

N’ime ụwa ọhụrụ Chineke, mgbe ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi bịara zuo okè, ha ga-enwere onwe ha pụọ n’agbụ nke ịka nká. Bible na-ekwu, sị: “A ga-emekwa ka ihe e kere eke n’onwe ya nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:21) Chegodị echiche! Ndị mmadụ ga-anọgide na-enwetakwu amamihe na ahụmahụ. Ha ga-anọgidekwa na-abụ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ n’agbanyeghị na ha ebiela ndụ ruo ọtụtụ narị afọ. Ị̀ ga-adị ndụ ịhụ oge ahụ?

Afọ Ole Ka Ị Ga-adịru Ndụ?

Dị ka Jizọs si kwuo, ndị ga-anwụ n’ụbọchị ikpe Chineke ga-akarị akarị, na-eme ka nanị mmadụ ole na ole fọdụ n’ụwa. (Matiu 24:21, 22) Jizọs kwuru, sị: “Okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.”—Matiu 7:13, 14.

Ka i wee soro ná ndị ga-adị ndụ ebighị ebi, ọ dị mkpa ka i mee ka gị na Chineke dị ná mma. Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịbịa mara Chineke. Jizọs kọwara, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ.” (Jọn 17:3) N’ezie, ka i wee mata Chineke nke ọma, ị ghaghị ime mgbalị; ma mgbalị dị otú ahụ kwesịrị ekwesị. N’otu aka ahụ, ka i wee kpata ego nri kwa ụbọchị, ị ghaghị ime mgbalị. Jizọs ji ihe ọmụma banyere Chineke tụnyere nri, ma gbaa ume, sị: “Rụọnụ ọrụ, ọ bụghị maka nri nke na-ala n’iyi, kama maka nri nke na-adịgide adịgide maka ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:27) Inweta ndụ nke na-agaghị agwụ agwụ ó rughị mgbalị ọ bụla ị pụrụ imere ya?—Matiu 16:26.

Jizọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ya mere, afọ ole ị ga-adịru ndụ dabeere n’otú i si nabata ịhụnanya Chineke.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ụfọdụ na-ekwu na afọ ndị ahụ Bible kwuru banyere ha n’ebe a bụ ọnwa n’ezie. Ma, akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ kwuru na Apakshad mụrụ Shela mgbe ọ dị afọ 35. Ọ bụrụ na e were ya na afọ 35 ahụ bụ ọnwa 35, ọ pụtara na Apakshad ghọrọ nna mgbe ọ na-erubeghị afọ atọ—bụ́kwanụ ihe doro anya na ọ gaghị ekwe omume. Tụkwasị na nke ahụ, isiakwụkwọ ndị mbụ nke Jenesis gosiri ọdịiche dị n’etiti afọ, bụ́ nke e ji anyanwụ agụ, na ọnwa, bụ́ nke e ji ọnwa agụ.—Jenesis 1:14-16; 7:11.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]

Mmadụ dịruo afọ 80, ọ bụ nanị ihe ole na ole n’ime ihe ndị ọ pụrụ ime ka afọ ole ahụ zuuru ya ime

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

E kere mmadụ ịdị elu karịa ụmụ anụmanụ

[Foto dị na peeji nke 23]

Ụgbọala a ọ̀ kụkpọrọ akụkpọ mgbe a rụrụ ya?

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Okwu Chineke na-ekwu na ụmụ mmadụ ga-alaghachiru ‘ụbọchị okorobịa ha’