Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Isii Ga-enyere Mmadụ Aka Inwe Ezigbo Ihe Ịga nke Ọma

Ihe Isii Ga-enyere Mmadụ Aka Inwe Ezigbo Ihe Ịga nke Ọma

Ihe Isii Ga-enyere Mmadụ Aka Inwe Ezigbo Ihe Ịga nke Ọma

EZI ihe ịga nke ọma bụ mmadụ ibi ụdị ndụ kasị mma o nwere ike ibi, ụdị ndụ onye na-ebi ya na-eme ihe Chineke na-achọ, na-emekwa ihe kwekọrọ ná nzube ya maka anyị. Baịbụl kwuru na onye na-ebi ụdị ndụ ahụ ga-adị “ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi, nke na-amị mkpụrụ ya n’oge ya, akwụkwọ ya adịghịkwa akpọnwụ akpọnwụ, ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”Abụ Ọma 1:3.

Ee, ọ bụ ezie na anyị ezughị okè, na anyị na-emehiekwa ihe, anyị nwere nnọọ ike inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ anyị! Ọ̀ na-agụ gị agụụ ibi ụdị ndụ ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, ụkpụrụ Baịbụl isii ndị dị n’okpuru ebe a nwere ike inyere gị aka ibi ụdị ndụ ahụ, nke a ga-emekwa ka o doo anya na ihe ndị Baịbụl na-akụzi bụ amamihe sitere n’aka Chineke n’ezie.—Jems 3:17.

Debe Ego n’Ọnọdụ Ya

“Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile. Site n’ịchụso ụdị ịhụnanya a, [ụfọdụ ejirila] ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.” (1 Timoti 6:10) Ghọta na ihe bụ́ nsogbu abụghị ego n’onwe ya—n’ihi na ọ dị anyị niile mkpa iji lekọta onwe anyị na ezinụlọ anyị—kama ebe nsogbu dị bụ n’ịhụ ego n’anya. N’eziokwu, ịhụ ego n’anya na-eme ka ego ghọọrọ mmadụ nna ukwu, ma ọ bụ chi.

Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu nke mbụ, ndị na-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ n’ihi na ha chere na ọ bụ ya ga-eme ka ha nwee ihe ịga nke ọma na-achọ nnọọ ijide ifufe. Ọ bụghị naanị na ha anaghị enweta ihe ha na-achọ, kama, ha na-akpatara onwe ha ọtụtụ ihe mgbu. Dị ka ihe atụ, ka ndị mmadụ na-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ, ha na-elegharakarị mmekọrịta ha na ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha anya. Ndị ọzọ anaghị ehiru ụra ala—ma ọ́ bụghị n’ihi ọrụ, ya abụrụ n’ihi nchegbu. Ekliziastis 5:12 kwuru, sị: “Ụra onye na-eje ozi na-atọ ya ụtọ, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe ukwu ka o riri; ma ọtụtụ ihe onye ọgaranya nwere adịghị ekwe ya ka ọ rahụ ụra.”

Ọ bụghị naanị na ego bụ nna ukwu obi tara mmiri, kama, ọ bụkwa nna ukwu dị aghụghọ. Jizọs Kraịst kwuru banyere “ike dị aghụghọ nke akụnụba.” (Mak 4:19) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, akụnụba na-eyi ka ọ̀ ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ, ma ọ naghị enye obi ụtọ. Naanị ihe ọ na-eme bụ ime ka mmadụ na-achọ inwetakwu ihe. Ekliziastis 5:10 kwuru, sị: “Afọ emekataghị ju onye hụrụ ego n’anya.”—The New English Bible.

N’igbu ya nkenke, onye hụrụ ego n’anya na-emegide onwe ya, ịhụ ego n’anya na-emesịkwa kpata obi mgbawa, obi ọjọọ, ma ọ bụ ọbụna duje n’ime mpụ. (Ilu 28:20) Ihe ndị ga-aka mee ka anyị nwee obi ụtọ na ihe ịga nke ọma bụ imesapụ aka, ịgbaghara ndị mmadụ, ịdị ọcha n’omume, ịhụ ndị ọzọ n’anya, na mmadụ na Chineke ịdị ná mma.

Mụta Imesapụ Aka

“A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ọ bụ ezie na inye ihe mgbe ụfọdụ nwere ike ime ka mmadụ nwetụ obi ụtọ, imesapụ aka mgbe niile nwere ike ime ka mmadụ na-enwe obi ụtọ mgbe niile. O doro anya na e nwere ọtụtụ ụzọ e nwere ike isi mesapụ aka. Otu n’ime ụzọ ndị kasị mma mmadụ ga-esi eme ya bụ iwepụta onwe ya imere ndị ọzọ ihe, mgbe mgbe kwa, ọ bụ ya ka ndị ọzọ na-akasị eji akpọrọ ihe.

Mgbe onye na-eme nchọpụta bụ́ Stephen G. Post nyochasịrị ihe ọmụmụ dị iche iche e mere banyere imesapụ aka, obi ụtọ, na ahụ́ ike, o kwubiri na mmadụ imesapụ aka na inyere ndị ọzọ aka na-eme ka onye ahụ dịkwuo ogologo ndụ, nwekwuo obi ụtọ n’ime onwe ya, nwekwuo ezigbo ahụ́ ike, mee ka obi kpakọkwuo ya ọnụ, nakwa na ọ na-ebelata ịda mbà n’obi.

Ọzọkwa, mmadụ imesapụ aka dabere n’otú ihe o nwere hà anaghị eme ka ọ nọrọ n’ụkọ. Ilu 11:25 kwuru, sị: “Onye na-emesapụ aka ga-enwe ihe ịga nke ọma; onye na-eme ka obi ruo ndị ọzọ ala, a ga-eme ka obi ruo ya onwe ya ala.” (New International Version) Dị ka e kwuru n’ebe a, ụmụ mmadụ, nakwa karịsịa Chineke, na-eji ndị nwere nnọọ obi imesapụ aka akpọrọ ihe ma na-ahụ ha n’anya—ma ọ bụrụ na ha anaghị eme ya ka e wee nyeghachi ha.—Ndị Hibru 13:16.

Na-agbaghara Ndị Mmadụ Kpamkpam

“Na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:13) N’oge a, ndị mmadụ anaghị achọkarị ịgbaghara ibe ha; ha na-achọ imegwara ihe e mere ha kama ime ebere. Gịnị ka ọ na-akpata? Onye a gwara okwu ọjọọ ya agwagwara, onye a kụrụ ihe ya akụgwara.

Ihe ọjọọ ọ na-akpata nwere ike ịkarị nke ahụ. Otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ a na-akpọ The Gazette nke Montreal, Canada, kwuru, sị: “Ná nnyocha e ji puku mmadụ anọ na narị isii nọ n’agbata afọ iri na asatọ na iri atọ mee,” ndị na-eme nchọpụta “chọpụtara [na] otú mmadụ nweruru obi ọjọọ na ahụ́ mgbakasị” bụ otú akpa ume ya na-emebiru. Ụfọdụ nsogbu ndị ọ na-akpata karịdịrị nke sịga na-akpatara onye na-ese ya! N’ezie, ọ bụghị naanị na ịgbaghara ndị ọzọ na-eme ka anyị na ha na-adị ná mma, ọ bụkwa ezigbo ọgwụ!

Olee otú i nwere ike isi na-agbagharakwu ndị mmadụ? Malite site n’inyocha onwe gị nke ọma ma ghọta ebe i nwere nsogbu. Ị́ naghị akpasu ndị ọzọ iwe mgbe ụfọdụ? Ọ́ naghị agụ gị agụụ ka ha gbaghara gị? Ebe ọ dị otú ahụ, ọ́ gaghị adị mma ka ị mụta imesapụ aka site n’ịgbaghara ndị ọzọ? (Matiu 18:21-35) A bịa n’ihe metụtara ịgbaghara ndị ọzọ, ọ dịkwa mkpa ka ị mụta ịdị na-ejide onwe gị. Mgbe ọ bụla iwe bịara gị, wetuo obi, kusịa, ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ọzọ ga-eme ka obi gị dajụọ. Ghọtakwa na inwe njide onwe onye bụ ihe na-egosi na ị dị ike. Ilu 16:32 kwuru, sị: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike.” Amaokwu ahụ sịrị na onye ahụ “dị mma karịa dike”—nke ahụ na-egosinụ na onye ahụ nwere ihe ịga nke ọma, ọ́ bụghị ya?

Na-eme Ihe Ndị Chineke Nyere n’Iwu

“Ihe Jehova nyere n’iwu dị ọcha, na-eme ka anya na-enwu gbaa.” (Abụ Ọma 19:8) N’igbu ya nkenke, ihe ndị Chineke nyere n’iwu bụ maka ọdịmma anyị—ma n’anụ ahụ́ ma n’echiche anyị. E nwere ụzọ ndị ha si echebe anyị, otu n’ime ha bụkwa na ha na-eme ka anyị ghara itinye aka n’omume ọjọọ ndị dị ka ịṅụ ọgwụ ọjọọ, aṅụrụma, mmekọahụ rụrụ arụ, na ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. (2 Ndị Kọrịnt 7:1; Ndị Kọlọsi 3:5) Ihe ọjọọ ndị ihe ndị a na-akpata nwere ike ịbụ mpụ, ịda ogbenye, atụkwasịghị mmadụ obi, ntisa ezinụlọ, isi ezughị okè, obi erughị ala, ọrịa, na ọbụna nnwụchu ọnwụ.

N’aka nke ọzọ, ndị na-eme ihe ndị Chineke nyere n’iwu na-eme ka ha na ndị mmadụ na-adị n’udo, ha na-enwe afọ ojuju n’ụdị ndụ ha na-ebi, obi na-erukwa ha ala. N’Aịzaya 48:17, 18 Chineke kwuru na ya bụ “Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.” O kwukwara, sị: “A sị nnọọ na ị ga-aṅa ntị n’ihe m nyere n’iwu! Mgbe ahụ, udo gị ga-adị nnọọ ka osimiri, ezi omume gị ga-adịkwa ka ebili mmiri nke oké osimiri.” Ee, Onye Okike anyị na-achọ ihe ga-akasị abara anyị uru. Ọ chọrọ ka anyị “jee ije n’ụzọ” nke ga-eme ka anyị nwee ezigbo ihe ịga nke ọma.

Na-ahụ Ndị Ọzọ n’Anya n’Achọghị Ọdịmma Onwe Gị Naanị

“Ịhụnanya na-ewuli elu.” (1 Ndị Kọrịnt 8:1) Ì chetụla otú ndụ ga-adị ma ịhụnanya adịghị? Ọ ga-abụ nnọọ ndụ na-enweghị isi nke obi ụtọ na-adịghị na ya! Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi ji ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ọ bụrụkwa na [enweghị m ịhụnanya n’ebe ndị ọzọ nọ], ọ dịghị ihe m bụ. . . . Ọ baghịrị m uru ọ bụla.”—1 Ndị Kọrịnt 13:2, 3.

Ụdị ịhụnanya e kwuru okwu ya ebe a abụghị ịhụnanya mmekọahụ, nke ahụ n’onwe ya adịghịkwa njọ. Kama nke ahụ, ọ bụ ụdị ịhụnanya siri ike karịa ya, nke na-adịtekwa aka karịa ya, bụ́ nke ụkpụrụ Chineke na-achịkwa. * (Matiu 22:37-39) Ọzọkwa, ọ bụghị ụdị ịhụnanya nke na-eme ka mmadụ na-achọ naanị ka a na-emere ya ihe mgbe niile, kama nke ahụ, ọ na-eme ka mmadụ na-agba mbọ imere ndị ọzọ ihe. Pọl kwukwara na ịhụnanya a nwere ndidi na obiọma. Ọ naghị ekwo ekworo, ọ naghị etu ọnụ, ma ọ bụ dị mpako. Ọ na-akpali onye nwere ya ime ihe ga-abara ndị ọzọ uru, ọ na-emekwa ka onye nwere ya ghara ịdị na-ewe iwe ọsọ ọsọ, kama nke ahụ, ọ na-agbaghara onye mejọrọ ya. Ụdị ịhụnanya ahụ na-ewuli mmadụ elu. Ọzọkwa, ọ na-eme ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma, karịsịa ndị ezinụlọ anyị.—1 Ndị Kọrịnt 13:4-8.

Otú ndị mụrụ ụmụ ga-esi gosi na ha hụrụ ụmụ ha n’anya bụ inwe ezi mmasị n’ebe ha nọ na inye ha iwu ndị doro anya dabeere na Baịbụl, bụ́ ndị ga na-achịkwa omume ha, akparamàgwà ha, na akụkụ ndị ọzọ nke ndụ ha. Obi na-eru ụmụaka a zụlitere n’ezinụlọ dị otú ahụ ala, ezinụlọ ha na-esikwa ike, ha na-amakwa na a hụrụ ha n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe n’ezie.—Ndị Efesọs 5:33–6:4; Ndị Kọlọsi 3:20.

A nọ n’ezinụlọ na-agbaso ụkpụrụ Baịbụl zụọ Jack, bụ́ nwa okorobịa bi na United States. Mgbe Jack biiri nke ya, o degaara ndị mụrụ ya akwụkwọ ozi. Ụfọdụ n’ihe ndị o kwuru bụ: “Ihe m na-agbalị ime mgbe niile bụ irube isi n’iwu [Baịbụl] bụ́: ‘Sọpụrụ nna gị na nne gị . . . ka ihe wee gaziere gị.’ (Diuterọnọmi 5:16) Ihe agazierela m. Aghọtala m ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ na ọ bụ n’ihi ezigbo ọzụzụ unu ji ịhụnanya zụọ m. Unu emeela maka mbọ niile unu gbara n’ịzụ m.” Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, olee otú obi ga-adị gị ma i nweta akwụkwọ ozi dị otú ahụ? Ọ́ gaghị eme ka obi jupụta gị n’ọṅụ?

Ịhụnanya nke ụkpụrụ na-achịkwa ‘na-esokwa eziokwu aṅụrị ọṅụ’—ya bụ, eziokwu banyere Chineke bụ́ nke dị na Baịbụl. (1 Ndị Kọrịnt 13:6; Jọn 17:17) Iji maa atụ: Ka e were ya na di na nwunye na-enwe nsogbu kpebiri ịgụkọta ihe Jizọs kwuru na Mak 10:9 ọnụ, nke bụ́: “Ihe Chineke kekọtara [n’alụmdi na nwunye], mmadụ ọ bụla atọsala ya.” Ugbu a, ha aghaghị inyocha obi ha. Hà ‘na-eso eziokwu Baịbụl aṅụrị ọṅụ’ n’ezie? Hà ga na-ele alụmdi na nwunye anya dị ka ihe dị nsọ otú Chineke si ele ya, ma mee ihe gosiri na ha si otú ahụ ele ya anya? Hà dị njikere ịgba mbọ idozi nsogbu ha n’ịhụnanya? Ya bụrụ otú ahụ, ha ga-enwe ike ime ka alụmdi na nwunye ha gaa nke ọma, ha ga-enwekwa ọṅụ n’ihi ihe ndị ọ ga-arụpụta.

Jiri Mmekọrịta Gị na Chineke Kpọrọ Ihe

“Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Ụmụ mmadụ adịghị ka ụmụ anụmanụ n’ihi na ụmụ mmadụ nwere ike ịghọta ihe ndị metụtara Chineke. Ọ bụ ya mere anyị ji ajụ ajụjụ ndị dị ka, Gịnị bụ nzube nke ndụ? È nwere Onye Okike? Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ? Gịnị bụ ọdịnihu anyị?

N’ụwa niile, ọtụtụ nde ndị nwere obi eziokwu achọpụtala na Baịbụl zara ajụjụ ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, ajụjụ nke ikpeazụ ahụ metụtara nzube Chineke maka ụmụ mmadụ. Gịnị bụ nzube ahụ? Ọ bụ ka ụwa bụrụ paradaịs ebe ụmụ mmadụ ndị hụrụ ma Chineke ma ụkpụrụ ya n’anya ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. Abụ Ọma 37:29 kwuru, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”

O doro anya na Onye Okike anyị chọrọ ka anyị nwee ihe ịga nke ọma ruo ihe karịrị naanị afọ iri asaa ma ọ bụ iri asatọ. Ọ chọrọ ka anyị nwee ihe ịga nke ọma ruo mgbe ebighị ebi! N’ihi ya, ugbu a bụ oge i kwesịrị iji mụọ banyere Onye Okike gị. Jizọs kwuru, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ka ị na-amatakwu Chineke na Ọkpara ya ma na-ebi ndụ gosiri na ị maara ha nke ọma, ị ga-achọpụta n’onwe gị na “ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.”—Ilu 10:22.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na n’ebe niile “ịhụnanya” pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Grik, ma ọ bụ “n’Agba Ọhụrụ,” ihe e ji ya sụgharịa bụ a·gaʹpe. A·gaʹpe bụ ezi ịhụnanya nke mmadụ kpebiri inwe n’ebe ndị ọzọ nọ n’ihi na ọ maara na ọ bụ ihe ziri ezi na ọrụ dịịrị ya ime otú ahụ. Nke ahụ apụtakwanụghị na a·gaʹpe bụ ịhụnanya nke na-anaghị echebara ndị ọzọ echiche, kama nke ahụ, mgbe ụfọdụ, ọ na-esi nnọọ ike.—1 Pita 1:22.

[Igbe dị na peeji nke 7]

ỤKPỤRỤ NDỊ ỌZỌ NA-EME KA MMADỤ NWEE IHE ỊGA NKE ỌMA

Na-atụ Chineke egwu ziri ezi. “Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe.”—Ilu 9:10.

Meta ezigbo ndị enyi. “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”—Ilu 13:20.

Emebigala ihe ókè. “Onye aṅụrụma na onye na-eribiga nri ókè ga-ada ogbenye.”—Ilu 23:21.

Abọla ọ́bọ̀. “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.”—Ndị Rom 12:17.

Na-arụsi ọrụ ike. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya erila ihe.”—2 Ndị Tesalonaịka 3:10.

Na-emere ndị ọzọ ihe i chọrọ ka ha meere gị. “Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—Matiu 7:12.

Kwaa ire gị nga. “Onye chọrọ ịhụ ndụ n’anya, chọọkwa iji anya ya hụ ezi ụbọchị, ya gbochie ire ya ikwu ihe ọjọọ.”—1 Pita 3:10.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

ỊHỤNANYA BỤ EZIGBO ỌGWỤ

Dean Ornish bụ́ dọkịta na onye edemede, dere, sị: “Inwe ịhụnanya na mkpakọrịta chiri anya ma ọ bụ enweghị ha so n’isi ihe ndị na-eme ka anyị na-arịa ọrịa na ndị na-eme ka ahụ́ dị anyị mma, ihe ndị na-akpasu anyị iwe na ndị na-enye anyị obi ụtọ, ihe ndị na-eme ka anyị na-ata ahụhụ na ndị na-eme ka anyị kwụsị ịta ahụhụ. Ọ bụrụ na ọgwụ ọhụrụ si otú a akpa ike, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị dọkịta niile nọ ná mba a ga na-agwa ndị ọrịa ha ka ha na-aṅụ ya. Ọ ga-abụ ime ihe na-ezighị ezi ịghara ịgwa onye ọrịa ka ọ na-aṅụ ya.”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]

ONYE IKE ỤWA GWỤRỤ GHỌRỌ ONYE NWERE IHE ỊGA NKE ỌMA

Mgbe agha bidoro n’obodo otu nwoke a na-akpọ Milanko, bụ́ onye bi n’ógbè Balkan, o sonyere ná ndị agha. N’ihi otú o si kata obi gbuo ndị mmadụ n’agha ahụ, a malitere ịkpọ ya Rambo, bụ́ aha e ji mara otu dike na-eme fim ebe a na-alụ ọgụ. Ma ka oge na-aga, àgwà ndị agha bịara gwụ Milanko ike n’ihi nrụrụ aka ha na omume ihu abụọ ọ hụrụ n’ebe ha nọ. O dere, sị: “Nke ahụ dujere m n’ime ọtụtụ ihe ọjọọ—ịṅụ mmanya na-aba n’anya, ise sịga, ịṅụ ọgwụ ike, ịgba chaa chaa, na ịkwa iko aghara aghara. Ndụ m nọ na-aghasa, ma amaghị m ihe m ga-eme banyere ya.”

N’oge a Milanko na-eche ihe ọ ga-eme, ọ malitere ịmụ Baịbụl. Ka e mesịrị, mgbe ọ gara ileta otu onye ikwu ya, ọ hụrụ magazin Ụlọ Nche, bụ́ nke Ndịàmà Jehova na-ebipụta. Ihe ọ gụrụ na ya masịrị ya, n’oge na-adịghịkwa anya, ya na Ndịàmà malitere ịmụ Baịbụl. Eziokwu Baịbụl mere ka ọ chọta obi ụtọ na ezi ihe ịga nke ọma. O kwuru, sị: “O nyere m ike. Akwụsịrị m ihe ọjọọ niile ahụ m na-emebu, ghọọ ụdị mmadụ ọhụrụ, ma ghọọ Onyeàmà Jehova e mere baptizim. Ndị mabu m anaghịzi akpọ m Rambo, kama ha na-akpọzi m Bunny—bụ́ aha e ji mara m mgbe m dị obere—n’ihi otú m sizi dị umeala n’obi.”