Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekwe ntị, tiivi ma ọ bụ kọmputa ò riela m ahụ́?

Ekwe ntị, tiivi ma ọ bụ kọmputa ò riela m ahụ́?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Ekwe ntị, tiivi ma ọ bụ kọmputa ò riela m ahụ́?

Gịnị jikọrọ mmadụ atọ a?

“Izigara ndị ọzọ ozi n’ekwe ntị na-atọgbu m atọgbu! O nweghị ihe na-atọ m ka ya. E nwere ike ịsị na o riela m isi.”—Alan. *

“Mgbe mama m zụtaara m tiivi, ọ tọgburu m atọgbu! Ma kama ịrahụ ụra abalị, ana m amụgide anya na-ekiri tiivi ruo mgbe chi bọwara. Ọ na-akakwara m mma ikiri tiivi karịa mụ na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi m ịnọ.”—Teresa.

“O nwere mgbe m na-anaghị ekwe apụ apụ ma ọ bụ mee ihe ọ bụla n’ihi na ọ na-adị m ka ọ̀ bụ m pụọ, otu onye ezitere m ozi n’Ịntanet. M teta ụra n’ime abalị, m na-agbanye kọmputa m ka m mara ma è nwere onye ziteere m ozi n’Ịntanet. M na-eji ohere ọ bụla m nwere etinye ihe ọhụrụ n’Ịntanet.”—Anna.

N’ime mmadụ atọ a, olee onye nke ị ga-asị na ihe ahụ ọ na-eme eriela ya ahụ́?

Alan Teresa Anna

MGBE ndị mụrụ gị ka na-eto eto, redio bụ ngwá elektrọniks bụ́ isi e ji agbasa ozi. Telefon ndị e nwere mgbe ahụ buchara ibu. Naanị ihe a na-eji ya eme bụ ịgwa mmadụ okwu, mgbe ụfọdụkwa, anaghị anụcha olu onye na-ekwu okwu nke ọma. Ihe a e kwuru, ọ̀ dara gị ka ihe ndị mgbe ochie? Ọ bụ ihe otu nwa agbọghọ aha ya bụ Anna chere. Ọ sịrị, “Ndị mụrụ m toro mgbe ụwa na-amabeghị nke a na-akọ ná ngwá elektrọniks. Ọ na-esidịrị ha ike ịma ihe ihe ụfọdụ dị n’ekwe ntị ha na-arụ!”

Taa, i nwere ike iji ekwe ntị ị ga-etinyeli n’akpa uwe kpọọ mmadụ, gere egwú, lee tiivi, gwuo egwuregwu vidio, zigara ndị enyi gị ozi iimel, see foto, ma ọ bụdị chọọ ihe n’Ịntanet. Ebe ọ bụ na e nweziri kọmputa, ekwe ntị, tiivi, na Ịntanet n’oge a, i nwere ike iche na o nweghị ihe o mere ma i jiri ha na-eme ihe n’oge niile. Ma, ndị mụrụ gị nwere ike iche na ihe ndị ahụ na-agbazi gị ara. Ọ bụrụ na ha agwa gị ụdị ihe a, ewerela na ihe ha na-ekwu enweghị isi. Eze Sọlọmọn, bụ́ nwoke maara ihe, sịrị: “Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu.”—Ilu 18:13.

Ọ̀ na-eju gị anya ihe mere ihe a ị na-eme ji echu ndị mụrụ gị ụra? Gụọ ihe ndị na-esonụ ma zaa ajụjụ ndị ha na ya so iji mara ma ekwe ntị, tiivi ma ọ bụ kọmputa ò riela gị ahụ́.

‘Ò Riela M Ahụ́?’

Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru na onye ihe riri ahụ́ bụ onye “na-emebiga otu ihe ókè mgbe niile, nke na ọ na-esiziri ya ike ịkwụsị ya ma ọ bụ na ọ chọghịzi ịkwụsị ya n’agbanyeghị nsogbu ọ na-akpatara ya.” Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe a akwụkwọ a kwuru leba anya n’ihe ahụ a kọrọ ná mmalite isiokwu a banyere ndị na-eto eto atọ ahụ, ọ pụtara na ihe ndị ahụ ha na-eme eriela ha ahụ́. Ò riela gịnwa ahụ́? N’okpuru ebe a, e kerisịrị ihe ahụ akwụkwọ ahụ kwuru ma lebara ha anya otu otu. Gụọ ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru ma lee ma ò nweela mgbe i kwuru ma ọ bụ mee ụdị ihe ndị ahụ. Zazie ajụjụ ndị so ha.

Ọ na-eme ya mgbe niile. “Ana m eji ọtụtụ awa egwu egwuregwu vidio. Ọ na-eme ka m ghara ihi ụra, ọ bụkwa ihe ndị gbasara egwuregwu ahụ ka m na-akọkarị ma mụ na ndị mmadụ kparịtawa ụka. Anaghị m achọzi ka mụ na ndị ezinụlọ anyị nọrọ. Ihe m na-achọkarịzi bụ ka naanị m nọrọ na-egwu egwuregwu vidio.”—Andrew.

A sị gị kwuo, awa ole n’ụbọchị ka i kwesịrị iji kirie tiivi, gwuo egwuregwu vidio, chọọ ihe n’Ịntanet, kpọọ mmadụ n’ekwe ntị ma ọ bụ zigara mmadụ ozi n’ekwe ntị gị? ․․․․․

Awa ole ka ndị mụrụ gị chere na i kwesịrị iji na-eme ihe ndị ahụ? ․․․․․

Awa ole n’eziokwu ka i ji eme ha? ․․․․․

Lee anya n’ihe ndị ị zara. Ì chere na oge i ji eme ihe ndị ahụ karịrị akarị?

□ Ee □ Ee e

Ọ na-esiri ya ike nkwụsị ma ọ bụ ọ naghị achọ ịkwụsị ya. “Ndị mụrụ m na-ahụ ka m na-ejikarị ekwe ntị ezigara ndị ọzọ ozi. Ha na-agwakwa m na m na-emebiga ya ókè. Ma e jiri m tụnyere ndị ọgbọ m, m ga-asị na nke m enweghịdị ihe ọ bụ. Anaghị m ekwu na e kwesịrị iji m tụnyere ndị mụrụ m n’ihi na m ka ha eme ya. Iji m tụnyere ha dị ka iji apụl tụnyere oroma. E kwuwedị, ha dị afọ iri anọ ma mụnwa dị afọ iri na ise.”—Alan.

Ọ̀ dịtụla mgbe ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị enyi gị gwara gị na ị na-ekirikarị tiivi, na ị na-anọkarị n’Ịntanet ma ọ bụ na aka gị na-atọ n’ekwe ntị?

□ Ee □ Ee e

Ò siiri gị ike ikweta ihe ahụ ha kwuru? Ka ò siiri gị ike iselata aka n’otú i si eme ihe ndị ahụ?

□ Ee □ Ee e

Ọ na-akpatara ya nsogbu. “Mgbe ọ bụla ị hụrụ ndị enyi m, ha ji ekwe ntị ezipụ ozi, ha na-emedị ya ma mgbe ha na-anya ụgbọala. Nke ahụ nwedịrị ike ịta isi ha!”—Julie.

“Mgbe mbụ m nwetara ekwe ntị, aka m anaghị apụ apụ na ya. O nweghị ihe ọzọ m na-arụ ma e wezụga ịkpọ ndị mmadụ na izipụ ozi. Ihe ahụ m mere seere mụ na ndị ezinụlọ anyị okwu. O sedịịrị mụ na ụfọdụ ndị enyi m okwu. Ugbu a, achọpụtala m na mụ na ndị enyi m nọrọ na-akparịta ụka, ha nọtụ obere ha asị m: ‘Chere ka m zaa ozi a e ziteere m n’ekwe ntị.’ Nke a so n’ihe mere ndị ahụ abụghịzi ezigbo ndị enyi m.”—Shirley.

Ò nwere mgbe ọ na-abụ ị na-anya ụgbọala ma ọ bụ a na-akụziri unu ihe na klas, gị ana-agụ ozi e ziteere gị n’ekwe ntị ma ọ bụ na-ezipụrụ mmadụ ozi n’ekwe ntị?

□ Ee □ Ee e

Gị na ndị ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị enyi gị nọrọ na-akparịta ụka, ọ̀ na-abụ ị nọtụ obere gị asị ha chere ka ị zaa onye kpọrọ gị n’ekwe ntị, ka i zipụrụ mmadụ ozi n’ekwe ntị gị ma ọ bụ ka ị gaa zaa ozi iimel e ziteere gị?

□ Ee □ Ee e

Tiivi, ekwe ntị, ma ọ bụ Ịntanet ọ̀ na ana-apụ gị ụra abalị ma ọ bụ na-adọpụ gị uche mgbe ị na-amụ ihe?

□ Ee □ Ee e

Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ka Ị Ghara Imefe Ya Ókè

Ọ bụrụ na i nwere kọmputa, ekwe ntị, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ yiri ha, jụọ onwe gị ajụjụ anọ ndị a dị n’okpuru ebe a. Ndụmọdụ si na Baịbụl a kọwara ebe a na ihe ụfọdụ ndị e kwuru ka i mee, ya na ndị nke a sị gị emela, ga-enyere gị aka ka ị ghara imefe ya ókè nakwa ka ị ghara ime ya otú ọ ga-ebutere gị nsogbu.

1. Gịnị dị na ya? “Meenụ ka obi ụnụ jupụta n’ihe niile bụ eziokwu, ihe niile kwesịrị ekwesị, ihe ziri ezi, ihe niile dị ọcha, ihe niile kwesịrị ịhụnaanya na ihe niile e jiri amara mee.”—Ndị Filipaị 4:8, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe ị ga-eme. Na-akpọ ndị enyi gị na ndị ezinụlọ unu, na-akọkwara ha ihe ga-agba ha ume na ihe ndị ga-eme ka obi tọọ ha ụtọ.—Ilu 25:25; Ndị Efesọs 4:29.

Ihe ị na-agaghị eme. Akọsala asịrị, ezipụla ozi ma ọ bụ foto rụrụ arụ, ejikwala ekwe ntị gị ekiri foto ma ọ bụ fim rụrụ arụ.—Ndị Kọlọsi 3:5; 1 Pita 4:15.

2. Olee mgbe m na-eji ha eme ihe? “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.”—Ekliziastis 3:1.

Ihe ị ga-eme. Kpebie awa ole ị ga-eji lee tiivi, gwuo egwuregwu vidio, kpọọ mmadụ n’ekwe ntị, zaa onye kpọrọ gị n’ekwe ntị, ma ọ bụ jiri ekwe ntị zipụ ozi. Gosi na a zụrụ gị azụ. Gbanyụọ ekwe ntị gị ma ọ bụ ihe ọzọ yiri ya ma ị gaa ihe ndị dị mkpa, dị ka ebe a na-efe Chineke. Ọ bụrụ na mmadụ ezitere gị ozi n’ekwe ntị, hapụ ya. I nwere ike ịza ya ma e mechaa.

Ihe ị na-agaghị eme. Ekwela ka ekwe ntị gị ma ọ bụ ihe ọzọ yiri ya dọpụ gị uche mgbe gị na ndị ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị enyi gị nọ, mgbe ị na-amụ ihe, ma ọ bụ mgbe ị na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke.—Ndị Efesọs 5:15-17; Ndị Filipaị 2:4.

3. Olee ndị mụ na ha na-akpa? “Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”—1 Ndị Kọrịnt 15:33.

Ihe ị ga-eme. Jiri ekwe ntị ma ọ bụ kọmputa na-ezigara ndị na-enyere gị aka ịkpa àgwà ọma ozi, ka unu nwee ike bụrụkwuo ezigbo ndị enyi.—Ilu 22:17.

Ihe ị na-agaghị eme. Eduhiekwala onwe gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị ga-amụta ịkpa àgwà ka ndị ị na-ekirikarị na tiivi, ndị gị na ha na-akparịtakarị n’Ịntanet nakwa n’ekwe ntị. Ị ga-amụta otú ha si ekwu okwu, bidokwa iche echiche otú ha si eche echiche.—Ilu 13:20.

4. Awa ole ka m ji eme ihe ndị a? “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”—Ndị Filipaị 1:10.

Ihe ị ga-eme. Na-edetu awa ole ị na-eji eme ihe ndị ahụ.

Ihe ị na-agaghị eme. Ọ bụrụ na ndị enyi gị agwa gị na oge i ji eme ihe ndị a karịrị akarị ma ọ bụ ndị mụrụ gị agwa gị ka i belata oge i ji eme ihe ndị a, ewekwala ya ka okwu ndị nzuzu.—Ilu 26:12.

Mgbe a na-ekwu ihe mere o ji dị mma ka mmadụ ghara imefe ihe ndị a ókè, Andrew, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, chịkọtara okwu a otú dị mma. Ọ sịrị: “Ekwe ntị, tiivi, na kọmputa dị mma, ma e kwesịghị iji ha eme ihe gafee ókè. Ugbu a, anaghịzi m ekwe ka ihe ndị a na-eri oge mụ na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi m ji anọkọ.”

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 25]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“O nwere mgbe ndị mụrụ m na-agwa m, ‘Mgbe ọ bụla a hụrụ gị i ji ekwe ntị n’aka. Ọ dị ka ànyị ga-eji ihe nyapagide ya n’aka gị!’ Mgbe ha bidoro ịgwa m ihe a, ọ na-atọ m ọchị ma emechara m chọpụta na ha ejighị ya egwu egwu. Ugbu a, anaghị m apịkarịzi ekwe ntị m. Obi dịkwa m ụtọ ugbu a karịa mgbe mbụ!”

“Mgbe mbụ, ọ na-adị m ka ọ̀ bụ iwu na m ga na-aga n’Ịntanet mgbe niile iji mara ma è nwere ozi e ziteere m. Anaghị m amụ ihe, anaghịkwa m eme ihe omume ndị nkụzi anyị nyere m mee n’ụlọ. Ugbu a m na-anaghị agakarịzi n’Ịntanet, ọ dị m ka è buturu m ibu dị ezigbo arọ. Ihe nyeere m aka bụ icheta na ọ dịghị mma imefe ihe ókè.”

[Foto]

Jovarny

Mariah

[Igbe dị na peeji nke 26]

“IZIRỊTA OZI N’ỊNTANET RIRI M AHỤ́”

“Afọ ole na ole gara aga, mụ na ndị ezinụlọ anyị kwagara obodo ọzọ. Ebe ọ bụ na m chọrọ ka mụ na ndị enyi m nwere n’ebe ahụ anyị si kwapụ ka na-akparịta, ha gwara m ka anyị si n’Ịntanet na-ezigara ibe anyị foto. Ihe a ha kwuru tọrọ m ụtọ, n’ihi na ọ ga-eme ka mụ na ha na-akparịta mgbe niile. Ihe m chere n’oge ahụ bụ: Ebe ọ na-abụghị ndị m na-amaghị ka mụ na ha ga-akparịta kama ọ bụ ndị enyi m, ò nwekwaranụ ihe ọjọọ dị ya?

“Ná mmalite, ihe niile na-aga nke ọma. Mgbe ahụ, ọ na-abụ otu ugboro n’izu ka m na-aga ele foto ndị enyi m ziteere m n’Ịntanet ma zigara ha ihe m chere banyere foto ndị ahụ. M na-agụkwa ihe ndị hanwa kwuru banyere foto ndị nke m zigaara ha. Ma ka oge na-aga, ịga n’Ịntanet jiri nwayọọ nwayọọ na-eri m ahụ́. Tupu m mara ihe na-eme, ana m anọzi n’Ịntanet oge niile. Ebe ọ bụkwa na m na-anọkarịzi n’Ịntanet, ndị bụ́ enyi ndị enyi m bịara chọọ ka mụ na ha kparịtawakwa. Ị manụ otú ụdị ihe ahụ na-adị, otu enyi gị gwa gị na e nwere enyi ya ọzọ chọrọ ka gị na ya mata, ị ga-ekwetanụ. Tupu ị mara ihe na-eme, i nweela ndị enyi iri ise gị na ha na-akparịta n’Ịntanet.

“E mechara m chọpụta na o nweghịzi ihe ọzọ m na-eche ma ọ́ bụghị mụ na ndị mmadụ ịnọ na-akparịta n’Ịntanet. Mụ na ha na-akparịtagodị, ihe m ga na-eche bụ mgbe ọzọ m ga-abịa lee ma è nweela onye ziteere m ozi n’Ịntanet ma ọ bụ oge ọzọ m ga-ezipụrụ mmadụ foto m n’Ịntanet. Ihe m na-eme bụ, m gụọ otu ozi e ziteere m ebe a, mụ ezigara mmadụ foto n’ebe ọzọ. Tupu m mara ihe na-eme, ọtụtụ awa agafeela.

“Emegidere m ihe a ruo otu afọ na ọnwa isii, ma mechaa chọpụta na ihe a eriela m ahụ́. Ma ugbu a, ana m agbalịsi ike ka m ghara ịna-atọ n’Ịntanet, kama nke ahụ, ana m agbasizi mbọ ike ịna-emete ndị mụ na ha na-ahụ ihu na ihu enyi, bụ́ ndị m maara na àgwà ha dị mma. Ụfọdụ ndị enyi m amaghị ihe mere m ji gbanwee, ma amụtala m ihe n’ihe mere m.”—Ellen, ọ dị afọ iri na asatọ.

[Igbe dị na peeji nke 26]

JỤỌ NDỊ MỤRỤ GỊ IHE HA CHERE

Mgbe ụfọdụ ọ ga-eju gị anya ma ị nụ ihe ndị mụrụ gị ga-ekwu ma gị na ha kparịta ihe banyere ihe ndị i ji atụrụ ndụ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Cheryl, sịrị: “O nwere oge papa m chere na egwú ndị m na-ege adịghị mma. Ihe m mere bụ ịgwa ya ka o soro m gee egwú ndị ahụ. O kwetara ige ha. Mgbe o gechara ha, ọ gwara m na o nweghị ihe ya hụrụ dị njọ n’egwú ndị ahụ!”

N’okpuru ebe a, dee otu ajụjụ ị ga-achọ ịjụ ndị mụrụ gị banyere egwú ndị ị na-ege, ekwe ntị ma ọ bụ kọmputa.

[Igbe dị na peeji nke 27]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

Nwa gị ọ̀ na-atọ n’Ịntanet? Ọ̀ na-ejikarị ekwe ntị ya ezipụ ozi ma ọ bụ na-agụkarị nke e ziteere ya n’ekwe ntị? Ọ̀ na-akara ya mma ịkwụnye ihe o ji egere egwú ná ntị karịa gị na ya ịkparịta ụka? Ọ bụrụ na ọ na-eme ihe ndị a, gịnị ka i nwere ike ime?

Ihe nwere ike ịgbata gị n’obi bụ ịnapụ ya ihe ahụ. Ma i kwesịghị ile ihe ndị ahụ anya ka ihe ọjọọ. A sị ka e kwuwe, o nwere ike gịnwa nwere ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ma ndị mụrụ gị enweghị ha n’oge nke ha. N’ihi ya, kama ịnapụ nwa gị ihe ahụ—ọ gwụkwala ma è nwere ezigbo ihe mere ị ga-eji mee otú ahụ—í cheghị na ọ ga-aka mma iji ohere ahụ kụziere nwa gị otú e si eji ihe ahụ eme ihe bara uru nakwa ihe ọ ga-eme ka ọ ghara iricha oge ya? Olee otú ị ga-esi eme ya?

Gị na nwa gị nọdụ ala kwurịta okwu ahụ. Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịgwa ya ihe mere ihe ahụ ọ na-eme ji echegbu gị. Nke abụọ bụ ige ya ntị ma o kwuwe okwu. (Ilu 18:13) Nke atọ bụ ịgwa ya ihe ndị ga-enyere ya aka ka ọ kwụsị imefe ya ókè. Gwa ya hoo haa ihe ndị ị chọrọ ka o mee, ma gosi na i nwere ezi uche. (Ndị Filipaị 4:5) Ellen, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, sịrị: “Mgbe izigara ndị mmadụ ozi n’ekwe ntị na-agba m ara, ndị mụrụ m anapụghị m ekwe ntị m; ihe ha mere bụ ịgwa m otú m ga-esi eselata aka. Otú ha si gwa m okwu nyeere m aka ịkwụsịlata ime ya, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ndị mụrụ m anọghị nso.”

Ọ́ bụrụkwanụ na nwa gị agwa gị na o nweghị ihe ọjọọ ya hụrụ n’ihe ahụ ya na-eme? Echekwala na ndụmọdụ ahụ i nyere ya bụ mmiri a wụsara n’elu okwute. Kama nke ahụ, nwee ndidi ma nyetụ nwa gị ohere ichebara ihe ahụ ị gwara ya echiche. O nwere ike bụrụ na o kwetara ihe ahụ i kwuru, ọ ga-agbanwekwa ka oge na-aga. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-eme ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Hailey. Ọ sịrị: “Iwe were m mgbe ndị mụrụ m gwara m na kọmputa m na-agbazi m ara. Ma mgbe e mechara, echebaara m ihe ahụ ha gwara m echiche. Ka m na-eche ya, m bịara chọpụta na ihe ahụ ha gwara m bụ eziokwu.”

[Foto dị na peeji nke 27]

Ọ̀ bụ gị na-agwa ekwe ntị gị ihe ọ ga-eme ka ọ̀ bụ ya na-agwa gị ihe ị ga-eme?