Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BAỊBỤL KWURU

The Mesaya

The Mesaya

Baịbụl buru amụma na Mesaya ga-abịa n’ụwa. Ya bịa, ọ ga-anapụta ụmụ mmadụ n’ọrịa, ahụhụ, na ọnwụ. Ọ̀ bụ Jizọs Kraịst bụ Mesaya ahụ?

Olee otú ndị mmadụ ga-esi mata onye bụ́ Mesaya?

Baịbụl buru amụma na Mesaya ma ọ bụ Kraịst ga-arụ ụzọ ọrụ abụọ, ma ọ gaghị abụ otu mgbe. Ya rụchaa nke mbụ, ogologo oge ga-aga tupu ya arụọ nke abụọ. * Ka o nwee ike ịrụ ọrụ nke mbụ ahụ, ọ ga-abụ mmadụ. Ndị dere Baịbụl buru amụma gbasara ụdị ndụ ọ ga-ebi ma ọ bịa n’ụwa nakwa otú ọ ga-esi jee ozi ya ka ndị mmadụ nwee ike ịmata onye ọ bụ. Ọ bụ “ịgba àmà banyere Jizọs” bụ isi ihe mere e ji buo amụma ndị dị na Baịbụl.—Mkpughe 19:10.

Ihe niile Jizọs mere mgbe ọ bịara n’ụwa gosiri ihe ọ ga-eme ma ọ malite ịchị ụwa. N’oge ahụ, ọ ga-eme ya n’ụwa niile

IHE BAỊBỤL KWURU

Mesaya ga-esi . . .

Amụma a niile nakwa ọtụtụ amụma ndị ọzọ mezuru n’isi Jizọs. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. O si otú a mee ka anyị ghọtakwuo na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ, meekwa ka obi sie anyị ike na nkwa Baịbụl kwere na ọ ga-eme ihe ndị a n’ụwa niile ga-emezu. (Luk 7:21-23; Mkpughe 21:3, 4) Mgbe Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ gara nọdụ ala “n’aka nri” Chineke, na-eche ka oge ruo ka ọ rụchaa ọrụ ya.—Abụ Ọma 110:1-6.

“Mgbe Kraịst bịara, ọ̀ ga-eme ihe ịrịba ama karịa nke nwoke a na-eme?”Jọn 7:31.

Olee otú Mesaya ga-esi rụchaa ọrụ ya?

Oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị Juu chere na Mesaya ga-anapụta ha n’aka ndị Rom ma chịwa ha. (Ọrụ Ndịozi 1:6) Ọ bụ ka oge na-aga ka ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs ghọtara na ọ ga-anọ n’eluigwe rụchaa ọrụ ya mgbe ọ ghọrọla mmụọ ozi dị ike nke e nyerela ikike ịchị eluigwe na ụwa.—Matiu 28:18.

IHE BAỊBỤL KWURU

Mgbe Mesaya ga-arụ ọrụ nke abụọ ahụ, . . .

Ọ bụ Jizọs rụrụ ọrụ nke mbụ ahụ e kwuru na Mesaya ga-arụ. Ọ ga-arụkwa nke abụọ a. Onye ọ bụla ma ihe kwesịrị ileru anya ala mụọ gbasara Jizọs n’ihi na o kwuru, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ.”—Jọn 14:6.

““N’oge ọchịchị ya, onye ezi omume ga na-ama pokopoko, udo ga-adịkwa ebe niile ruo mgbe ọnwa na-agakwaghị adị. Ọ ga-enwe ndị ọ na-achị . . . ruo ná nsọtụ ụwa.”Abụ Ọma 72:7, 8.

^ para. 5 “Mesaya” bụ okwu Hibru. Ihe ọ pụtara n’asụsụ Grik bụ “Kraịst.”—Jọn 1:41.

^ para. 7 Amaokwu Baịbụl ndị nke mbụ kwuru banyere amụma ndị e buru gbasara Mesaya, ndị nke abụọ ekwuo otú ha si mezuo.