Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

TETA! Nke 1 n'Afọ 2022 | N’ụwa A Nsogbu Juru​—Olee Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka?

Ka ihe na-akakwu njọ n’ụwa a, ọtụtụ ndị na-atagbu onwe ha n’ahụhụ n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha na nsogbu ndị mmadụ na-akpata. Chọpụta otú ị ga-esi na-edi nsogbu ndị a ma chebe onwe gị na ndị ị hụrụ n’anya.

 

N’ụwa A Nsogbu Juru, Olee Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka?

E nwee nsogbu, mee ihe ozugbo iji chebe onwe gị na ndị ezinụlọ gị.

1 | Na-agba Mbọ Ka Ahụ́ Sie Gị Ike

Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ sie gị ike, ọ ga-adịrị gị mfe idi nsogbu ọ bụla tara akpụ bịaara gị.

2 | Ghara Ịna-emefusị Ego Gị

Ọ bụrụ na ị naghị emefusị ego gị, ọ ga-adịrị gị mfe ịma ihe i kwesịrị iji ego nke i nwere enwe na-eme n’oge nsogbu.

3 | Na-ahụ Ndị Gị na Ha Dị ná Mma n’Anya

Leba anya n’ihe ga-enyere gị aka ka ị na-ahụ di gị ma ọ bụ nwunye gị, ndị enyi gị, na ụmụ gị, n’anya.

4 | Na-enwe Olileanya

Baịbụl na-enyere anyị aka idi nsogbu juru n’ụwa, ọ na-emekwa ka anyị nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.

Isiokwu Ndị Dị na Teta! A

Gụọ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a. Ha ga-enyere gị na ndị ezinụlọ gị aka idi nsogbu juru n’ụwa taa.