Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-emeta Ndị Si Ebe Dị Iche Iche Enyi

Na-emeta Ndị Si Ebe Dị Iche Iche Enyi

Nsogbu Emetaghị Ndị Si Ebe Dị Iche Iche Enyi Nwere Ike Ịkpata

Ọ bụrụ na anyị anaghị akpa ndị si n’agbụrụ anyị na-ele anya ọjọọ nso, o nwere ike ime ka anyị kpọkwuo ha asị. Ọ bụrụkwa na ọ bụ naanị ndị si n’agbụrụ anyị ka anyị na-emeta enyi, o nwere ike ime ka anyị chewe na ọ bụ otú ndị agbụrụ anyị si eche echiche na otú ha si akpa àgwà kacha mma.

Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka

“Megheenụ obi unu.” —2 NDỊ KỌRỊNT 6:13.

Olee ihe amaokwu a na-akụziri anyị? “Obi” anyị e kwuru okwu ya ebe a nwere ike ịpụta ịhụ mmadụ n’anya. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ndị anyị na ha si n’otu agbụrụ ka anyị hụrụ n’anya, ọ ga-eme ka obi anyị mechie. Iji zere ya, anyị kwesịrị ịna-emeta ndị si ebe dị iche iche enyi.

Otú Imeta Ndị Si Ebe Dị Iche Iche Enyi Si Enye Aka

Ọ bụrụ na anyị amatakwuo ndị ọzọ, anyị ga-aghọta ihe mere otú ha si eme ihe ji dị iche na nke anyị. Ka anyị na ha na-adịkwu ná mma, anyị ga-echefu na ha si n’agbụrụ ọzọ. Anyị ga-ejikwu ha kpọrọ ihe, ihe na-eme ha obi ụtọ ana-eme anyị obi ụtọ, ihe na-ewute ha ana-ewutekwa anyị.

Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị aha ya bụ Nazaré. Ọ kpọburu ndị mbịarambịa nọ n’obodo ha asị. O kwuru ihe nyeere ya aka ịkwụsị ya. Ọ sịrị: “Mụ na ha na-anọkọ, na-arụkọkwa ọrụ. M chọpụtara na ha dị nnọọ iche n’ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ha. Ọ bụrụ na i meta ndị si n’agbụrụ ọzọ enyi, ị ga-akwụsị iwere ha ka ndị ajọ mmadụ. Ị ga-ahụ ha n’anya, jirikwa ha kpọrọ ihe.”

Ihe I Nwere Ike Ime

Na-achọ otú gị na ndị si n’obodo ọzọ, agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ndị na-asụ asụsụ ọzọ ga-esi na-akpakọrịta. I nwere ike

  • Ịgwa ha ka ha kọọrọ gị gbasara onwe ha.

  • Ịkpọ ha ka ha soro gị rie nri.

  • Ige ntị ma ha gwawa gị gbasara onwe ha, chọpụtakwa ihe ndị ha ji kpọrọ ihe.

Ọ bụrụ na ị gbalịa chọpụta ihe ndị mere ná ndụ ha, ị ga-aghọta ihe mere ha ji akpa àgwà otú ha si akpa. O nwere ike ime ka ị hụ ha na ndị agbụrụ ha ndị ọzọ n’anya.