Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BAỊBỤL KWURU

War

War

N’oge ochie, ndị Izrel busoro mba dị iche iche agha n’aha Chineke ha bụ́ Jehova. Nke ahụ ọ̀ pụtara na Chineke na-akwado agha ndị a a na-alụ taa?

Gịnị mere ndị Izrel oge ochie ji na-aga agha?

IHE ỤFỌDỤ NDỊ KWURU

 

Ndị Izrel oge ochie fere chi hụrụ ịkwafu ọbara n’anya.

IHE BAỊBỤL KWURU

 

Mba ndị ahụ Izrel meriri n’agha n’oge ochie bụ mba ndị e ji ime ihe ike na omume ọjọọ mara, omume ndị dị ka: idina anụmanụ, nwanne idina nwanne ya na iji ụmụaka ha achụ àjà. Mgbe Chineke nyechara ogologo oge ka ha chegharịa, o kwuru, sị: “Ọ bụ ihe ndị a niile ka mba ndị m na-achụpụ n’ihu unu ji mee onwe ha ka ha bụrụ ndị na-adịghị ọcha.”​—⁠Levitikọs 18:​21-25; Jeremaya 7:31.

“Ọ bụ n’ihi ajọ omume nke mba ndị a ka Jehova bụ́ Chineke gị ji achụpụ ha n’ihu gị.”​—⁠Diuterọnọmi 9:⁠5.

Ò nwere ndị Chineke na-akwado n’agha taa?

Ọ GA-ABỤ NA Ị CHỌPỤTALA NA

 

N’ọtụtụ agha mba na mba na-alụ taa, ndị ndú okpukpe nke mba nke ọ bụla na-ekwu na ọ bụ hanwa ka Chineke nọnyeere. Akwụkwọ aha ya bụ The Causes of War kwuru na “ndị okpukpe na-etinyekarị aka n’agha ọ bụla a na-alụ.”

IHE BAỊBỤL KWURU

 

Iwu Chineke megidere Ndị Kraịst ibuso ndị iro ha agha. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraist ibe ya sị: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo. Unu abọrọla onwe unu ọbọ.”​—⁠Ndị Rom 12:​18, 19.

Kama Jizọs idunye ndị na-eso ụzọ ya agha, ọ gwara ha, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu, ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe.” (Matiu 5:​44, 45) Ọ bụrụgodị na ndị obodo ha na ndị obodo ọzọ na-alụ agha, Ndị Kraist kwesịrị ịnọpụ iche, n’ihi na ‘ha abụghị nke ụwa.’ (Jọn 15:19) Ebe ọ bụ na Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya nọ ná mba dị iche iche, hụ ndị iro ha n’anya, nọpụkwa iche n’ụwa, olee otú ọ ga-esi bịakwa na-akwado otu n’ime mba abụọ na-alụ agha taa?

“Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Otú ọ dị, alaeze m esighị n’ebe a.”​—⁠Jọn 18:⁠36.

Ò nwere mgbe agha ga-akwụsị?

IHE ỤFỌDỤ NDỊ KWURU

 

O nweghị ihe ga-eme ka agha kwụsị. Otu akwụkwọ aha ya bụ War and Power in the 21st Century kwuru, sị: “Olileanya adịghị na agha ga-akwụsị. O nweghị mgbe udo ga-adịgide n’ụwa a.”

IHE BAỊBỤL KWURU

 

Agha ga-akwụsị mgbe ọ na-enweghị onye ga-enwe mmasị n’ịlụ agha. N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe, ga-ebido ịchị ụwa a. Ọ ga-alakwa ngwá agha ndị e ji ebu agha n’ụwa n’iyi. Ọ ga-akụzikwara ndị mmadụ otú e si eme udo. Baịbụl gwara anyị na Chineke ‘ga-edoziri mba dị iche iche dị ike, ndị dị n’ebe dị anya, okwu ha. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi. Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.’​—⁠Maịka 4:⁠3.

Baịbụl na-eme ka anyị mata na n’Alaeze Chineke, agaghị enwe ndị ọchịchị ga na-achọ ọdịmma nke mba ha na-achị naanị, ma ọ bụ iwu ndị ga-eme ka ndị obodo nupụrụ ọchịchị isi. Ile mmadụ anya n’ihu nke na-akpata ịkpa oké agbụrụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a ga-eme ka agha bụrụ ihe akụkọ. Chineke kwere anyị nkwa n’akwụkwọ Aịzaya 11:​9, sị: “Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́, . . . n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.”

“Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube; Ọ na-agbakwa ụgbọ agha ọkụ.”​—⁠Abụ Ọma 46:⁠9.