Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỤLỌ NCHE Nke 1 n'Afọ 2023 | Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ, Olee Otú Baịbụl Ga-esi Nyere Ha Aka?

N’ebe niile n’ụwa, e nwere ọtụtụ nde mmadụ isi na-akpakọchaghị ọnụ. Ụdị ọrịa a na-arịa ndị si n’agbụrụ dị iche iche na ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, ma ndị nwere ego ma ndị na-enweghị ego, ma ndị gụrụ akwụkwọ ma ndị na-agụghị akwụkwọ. Olee mgbe e nwere ike ikwu na isi akpakọchaghị mmadụ ọnụ? Oleekwa otú ọrịa a si akpa ndị mmadụ aka ọjọọ? Magazin a ga-ekwu ihe mere o ji dị mkpa ka a gwọọ onye nwere ụdị ọrịa a otú kwesịrị ekwesị. Ọ ga-ekwukwa ụzọ dị iche iche Baịbụl nwere ike isi nyere ndị nwere ụdị nsogbu a ezigbo aka.

 

Isi Akpakọghịzi Ọtụtụ Ndị Ọnụ n’Ụwa A

Ọrịa isi mgbaka nwere ike ịbịa onye ọ bụla n’agbanyeghị afọ ole ọ dị ma ọ bụ ebe o si. Chọpụta otú Baịbụl nwere ike isi nyere ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ aka.

Ihe Banyere Gị Na-emetụ Chineke n’Obi

Gịnị mere obi kwesịrị iji sie gị ike na Jehova Chineke ghọtara ihe ị na-eche n’echiche nakwa otú obi dị gị karịa onye ọ bụla ọzọ?

1 | Ekpere—“Na-akọrọnụ Ya Ihe Niile Na-echegbu Unu”

Ọ̀ bụ eziokwu na i nwere ike ikpe ekpere gwa Chineke ihe na-echegbu gị ma ọ bụ ihe na-echu gị ụra? Ò nwere ezigbo uru ekpere ga-abara ndị na-echegbukarị onwe ha?

2 | “Nkasi Obi Anyị Na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ”

Ihe Baịbụl kwuru na-eme ka anyị nwee olileanya na n’oge na-adịghị anya, ihe ndị na-eme ka anyị nọrọ ná mwute ga-abụ ihe mgbe ochie.

3 | Otú Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl Nwere Ike Isi Baara Gị Uru

Obi jọwa anyị njọ, ihe Baịbụl kọrọ banyere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị bụ́ mmadụ ibe anyị nwere ike inyere anyị aka ịmata na ọ bụghị anyị bụ ndị mbụ nwere nsogbu anyị na-enwe.

4 | Ndụmọdụ Baịbụl Na-enye Na-aba Ezigbo Uru

Chọpụta otú ichebara amaokwu ndị dị na Baịbụl echiche na ikpebi ihe ndị ị ga-emeli ga-esi enyere gị aka ka ị na-edi nsogbu ndị ị na-enwe maka na isi akpakọchaghị gị ọnụ.

Otú Ị Ga-esi Enyere Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ Aka

Inyere enyi gị isi na-akpakọchaghị ọnụ aka nwere ike ime ka ihe katụrụ ya mma.