Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

M Na-akwanyeziri Onwe M na Ụmụ Nwaanyị Ùgwù

M Na-akwanyeziri Onwe M na Ụmụ Nwaanyị Ùgwù
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1960

  • ABỤ M ONYE: FRANS

  • NDỤ M BIRI: M NA-EME IHE IKE, NA-AṄỤ ỌGWỤ IKE, NA-AKPARỊKWA ỤMỤ NWAANYỊ

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

A mụrụ m n’obodo Mọluuz dị́ n’ebe ugwu Frans. Ndị bi na ya na-arụ ọrụ aka, na-alụkarịkwa ọgụ. Naanị ihe m na-echeta na-eme n’obodo a n’oge m dị obere bụ ọgụ ezinụlọ dị iche iche na-alụ. O nweghị ihe e ji ụmụ nwaanyị kpọrọ n’ezinụlọ anyị. E nweekwa ihe dị mkpa a na-ekwu, ọ na-esi ike ụmụ nwoke ajụọ ụmụ nwaanyị ihe ha chere. A kụziiri m na naanị ọrụ ụmụ nwaanyị nwere bụ isi nri, ilekọta ụmụ nwoke na ụmụaka ha.

Ahụsiri m anya mgbe m dị obere. Papa m bụ onye aṅụrụma. Ọ bụkwa ya gburu ya mgbe m dị afọ iri. Afọ ise ọ nwụchara, otu n’ime ụmụnne m ndị nwoke tọrọ m gburu onwe ya. N’otu afọ ahụ kwa, eji m anya m hụ ka e gburu otu onye ezinụlọ anyị mgbe ya na ibe ya na-alụ ọgụ. Ihe a merenụ wụrụ m akpata oyi n’ahụ́. Ndị ezinụlọ anyị kụziiri m otú e si eji égbè na mma alụso onye ọ bụla chọrọ m okwu ọgụ. M bịara gbukasịa egbugbu n’ahụ́ m, bidokwa ịṅụ oké mmanya.

Mgbe m dị afọ iri na isii, ebidoro m ịṅụ ihe dị ka ololo mmanya biya iri ma ọ bụ iri na ise n’ụbọchị. O teghịkwa aka, mụ ebido ṅụwa ọgwụ ike. M bidoro na-atụtụkọta ihe ndị dị ka alụminiọn ma na-ere ha iji nweta ego mmanya na ọgwụ ike ndị m na-aṅụ. Ebidokwara m izu ohi. Mgbe m na-erule afọ iri na asaa, agaala m mkpọrọ. A gụkọta ugboro ole a mara m ikpe ma taa m ahụhụ maka izu ohi na ime ihe ike, ọ bụ ugbo iri na asatọ.

Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri abụọ na abụọ, ndụ m bịara ka njọ. M bidoro ịna-aṅụ ìgbó iri abụọ n’ụbọchị, na-aṅụkwa ọgwụ ike a na-akpọ heroin na ọgwụ ike ndị ọzọ. O nwere oge ndị ọ fọrọ obere ka m nwụọ n’ihi na ọgwụ ike m ṅụrụ karịrị akarị. M bidoro rewe ọgwụ ike. N’ihi ya, m na-ejikarị mma na égbè aga ebe ọ bụla m na-aga. E nwedịrị otu ụbọchị m gaara agbagbu otu nwoke, ma, mgbọ égbè m gbara ya tụrụ n’isi belt ya, gbapụ. Mgbe m dị afọ iri abụọ na anọ, mama m nwụrụ, nsogbu m na-enye akakwuo njọ. Ọ na-abụ m na-aga n’ụzọ, ụfọdụ ndị hụ m n’akụkụ ụzọ ha si abịa, ụjọ ejide ha, ha agafee n’akụkụ ụzọ nke ọzọ. N’ọtụtụ ngwụcha izu, ma ọ́ bụghị na ndị uwe ojii kpọchiri m maka ọgụ m lụrụ, ya abụrụ na m nọ n’ụlọ ọgwụ, a na-adụchi ahụ́ e merụrụ m.

Alụrụ m nwaanyị mgbe m dị afọ iri abụọ na asatọ. O nweghị ihe m ji nwunye m kpọrọ. M na-agwakasị ya okwu ahụ́, na-akụkwa ya ihe. Anyị anaghị eme ka di na nwunye. Eche m na obi ga na-adị ya mma ma m na-enye ya ọla ndị m zutere n’ohi. Ma, ihe m na-atụghị anya ya mere otu ụbọchị. Nwunye m na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. N’ụbọchị mbụ ya na ha mụrụ ihe, ọ kwụsịrị ịṅụ sịga, kwụsị ịnara m ego m zutere n’ohi, nyeghachikwa m ọla niile m nyere ya. Ezigbo iwe jidere m. M gbalịrị ka ọ kwụsị ịmụ Baịbụl. M na-eme, m kpụrụ sịga, mụ afụọ ya anwụrụ ọkụ ya n’ihu. M na-ejikwa ya eme akaje n’ihu ndị agbata obi anyị.

N’otu abalị, m ji anya mmanya tinye ụlọ anyị ọkụ. E wezụga nwunye m, ọkụ gaara agbagbu mụ na nwa anyị nwaanyị dị́ afọ ise. Mgbe m mechara nweta onwe m, ghọta ihe merenụ, ihere onwe m mewere m. N’obi m, echere m na Chineke agaghị agbagharali m. Echetara m ụbọchị otu ụkọchukwu kwuru na ndị ọjọọ ga-aga ọkụ mmụọ. Otu dọkịta gwadịrị m na mụ enweghịzi mmekwata.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

Mgbe ọkụ gbachara ụlọ anyị, anyị kwagara n’ụlọ ndị ọgọ m. Mgbe Ndịàmà Jehova bịara ileta nwunye m, m jụrụ ha, sị, “Chineke ò nwere ike ịgbaghara m mmehie m niile?” Ha gosiri m ihe Baịbụl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11. Ebe ahụ kwuru àgwà dị iche iche Chineke kpọrọ asị, ma, kwuo, sị: “Nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu.” Obi bịara sie m ike na m ga-agbanweli. Ndịàmà Jehova ahụ gosikwara m ihe Baịbụl kwuru na 1 Jọn 4:8 iji mee ka obi sie mụ ike na Chineke hụrụ m n’anya. N’ihi ya, m gwaziri ha ka ha na-abịa akụziri m Baịbụl ugboro abụọ n’izu. Ebidokwara m ịga ọmụmụ ihe ha, na-ekpekwa ekpere mgbe niile.

N’ime otu ọnwa Ndịàmà Jehova kụziweere m Baịbụl, akwụsịrị m ịṅụ ọgwụ ike na mmanya. O teghị aka, ahụ́ akpaghasịa m. M bịara na-arọ nrọ ọjọọ, isi ana-awa m, ụta ngwere ana-eme m, mụ ana-enwekwa nsogbu ndị ọzọ ndị kwụsịrị ịṅụ ọgwụ ike na-enwe. Ma, m chọpụtara na Jehova na-enyere m ezigbo aka. Ọ bịara dị m otú ọ dị Pọl onyeozi n’otu oge Chineke nyeere ya aka ná nsogbu ya. Pọl sịrị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Emechara m kwụsị ịṅụ sịga na ìgbó.—2 Ndị Kọrịnt 7:1.

Baịbụl agbanweela ndụ m, meekwa ka ezinụlọ anyị kakwuo mma. Anaghịzi m agwakasị nwunye m okwu ahụ́. M na-akwanyeziri ya ùgwù, na-asị ya “biko” na “i meela.” M na-emesokwa nwa anyị nwaanyị otú nna kwesịrị isi emeso nwa ya. Mgbe m mụrụ Baịbụl ruo otu afọ, enyefere m Jehova onwe m, meekwa baptizim otú nwunye m mere.

URU NDỊ M RITERELA:

O doro mụ anya na ime ihe Baịbụl kwuru mere m ka ji dịrị ndụ. Ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova makwa na e wezụga Baịbụl, a gaara akụgbu m n’ebe m na-alụ ọgụ, ma ọ bụkwanụ ọgwụ ike egbuo m.

Ihe m mụtara na Baịbụl gbasara ihe bụ́ ọrụ di na ọrụ nna n’ezinụlọ mere ka m ghọọ ezigbo di na ezigbo nna. (Ndị Efesọs 5:25; 6:4) Mụ na ezinụlọ m na-emekọzi ihe ọnụ. Anaghịzi m agwa nwunye m na ọrụ ya bụ naanị isi nri, kama, m na-akwado ya n’ozi ọma ọ na-eji ihe dị ka awa iri asaa ezi ndị mmadụ kwa ọnwa. Ebe m bụ okenye n’ọgbakọ anyị, ọ na-akwadokwa m n’ọrụ m na-arụrụ ọgbakọ.

Ọ bụ otú Jehova Chineke m si hụ m n’anya ma meere m ebere mere ka ndụ m gbanwee. M hụ ndị e weere na ha enweghịzi mmekwata otú e sibu were m, ọ na-agụsi m ike ịkọrọ ha ụdị onye Jehova bụ. O doola m anya na Baịbụl ga-enyeliri onye ọ bụla aka ibi ndụ dị mma na nke bara uru. Baịbụl enyerela m aka ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya ma na-akwanyekwara ha ùgwù, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. Amụtakwala m ịna-akwanyere onwe m ùgwù.