Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị nọ n’ọtụtụ okpukpe a ma ama kweere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU GBASARA NDỤ NA ỌNWỤ?

È Nwere Ebe Mmadụ Na-aga Ma Ọ Nwụọ?

È Nwere Ebe Mmadụ Na-aga Ma Ọ Nwụọ?

NDỊ MMADỤ na-ekwu ihe dị iche iche banyere ndụ na ọnwụ. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụrụ na ha anwụọ na ha ga-aghọ ihe ọzọ ma ọ bụ gaa ebe ọzọ biri. Ndị ọzọ na-eche na ha ga-alọ ụwa ma ha nwụọ. E nwekwara ndị na-ekwu na mmadụ nwụọ, nke ya agaala.

E nwere ike inwe ihe gịnwa kweere banyere ebe mmadụ na-aga ma ọ nwụọ. O nwere ike ịbụ n’ihi otú e si zụlite gị ma ọ bụ ebe a mụrụ gị mere i ji kwere ihe i kweere. Ma, ebe ọ bụ na ndị mmadụ na-ekwu ihe dị iche iche banyere ebe mmadụ na-aga ma ọ nwụọ, è nwere ebe anyị ga-aga mata azịza ajụjụ a ka ò nwere onye ga-agwali anyị nke bụ́ eziokwu?

Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị isi okpukpe na-akụziri ndị mmadụ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ndị nọ n’ọtụtụ okpukpe a ma ama kweere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ha na-ekwu na mmadụ nwụọ, mkpụrụ obi ya ga-aghọ mmụọ gaa eluigwe ma ọ bụ gaa ebe ọzọ biri. Ụfọdụ okpukpe ndị ahụ bụ ndị Hindu, ndị Juu, ndị Alakụba, ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst, nakwa ndị ọzọ. Ndị Buda na-ekwukwanụ na mmadụ na-alọ ụwa ọtụtụ ugboro. Ha kwuru na mmadụ ga-alọgide ụwa ruo mgbe ọ ga-enwere onwe ya, ọ gaghịzi na-ata ahụhụ. Ha na-akpọ ọnọdụ a Nirvana.

Ihe a ha na-akụzi emeela ka ọtụtụ ndị kwere na ọnwụ na-emepere mmadụ ụzọ ịga biwe ndụ ebe ọzọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-elezi ọnwụ anya ka ihe dị mkpa ná ndụ nke na ha na-ekwu na o yiri ka Chineke ò kere anyị ka anyị na-anwụ anwụ. Ma, olee ihe Baịbụl kwuru banyere ya? Biko, gụọ isiokwu na-esonụ ka ị hụ ihe Baịbụl kwuru. Ihe o kwuru nwere ike iju gị anya.