Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara Shefan na Ezinụlọ Ya?

Ị̀ Maara Shefan na Ezinụlọ Ya?

Ị̀ Maara Shefan na Ezinụlọ Ya?

MGBE ị na-agụ Bible gị, ọ̀ dịtụwo mgbe ị hụrụ ebe ndị a kpọtụrụ Shefan na ụfọdụ ndị ezinụlọ ya a na-akwanyere ùgwù aha? Hà bụ ole ndị? Gịnị ka ha mere? Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta n’aka ha?

Bible mere ka anyị mata “Shefan nwa Azalaịa, nwa Meshulam” mgbe ọ na-akọ banyere mweghachi Josaịa weghachiri ezi ofufe n’ihe dị ka 642 T.O.A. (2 Ndị Eze 22:3) N’ime afọ 36 sochirinụ, ruo mgbe e bibiri Jeruselem na 607 T.O.A., e mere ka anyị mata ụmụ ya anọ, Ahaịkam, Elasa, Gemaraịa, na Jeazanaịa, nakwa ụmụ ụmụ ya abụọ, Maịkaịa na Gedalaịa. (Lee chaatị.) “Ọtụtụ ndị ezinụlọ Shefan nọ n’ọchịchị [n’alaeze Juda] ma jiri ọkwá odeakwụkwọ eze site n’oge Josaịa ruo Oge Ije Biri n’Ala Ọzọ,” ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica na-akọwa. Ịtụle ihe Bible na-ekwu banyere Shefan na ezinụlọ ya ga-enyere anyị aka ịghọta otú ha si kwado Jeremaịa na ezi ofufe nke Jehova.

Shefan Akwado Ezi Ofufe

Shefan na-eje ozi dị ka odeakwụkwọ eze na 642 T.O.A., bụ́ mgbe Eze Josaịa dị ihe dị ka afọ 25. (Jeremaịa 36:10) Gịnị ka nke ahụ gụnyere? Akwụkwọ ahụ a kpọtụrụ aha n’elu na-ekwu na odeakwụkwọ eze bụ onye ndụmọdụ na-anọ eze nso, onye okwu ego dị n’aka, aka ochie n’iso mba ọzọ ekwurịta okwu udo, ọkà n’ihe banyere ihe ndị na-eme ná mba ọzọ, iwu mba ọzọ, na nkwekọrịta azụmahịa. Ya mere, dị ka odeakwụkwọ eze, Shefan bụ otu n’ime ndị ikom a kasị akwanyere ùgwù n’alaeze ahụ.

Afọ iri tupu mgbe ahụ, Josaịa na-eto eto ‘amalitewo ịchọ Chineke nke Devid nna ya.’ Ihe àmà gosiri na Shefan tọrọ Josaịa nke ọma, n’ihi ya kwa, ọ pụrụ ịbụrụ ya ezi onye ndụmọdụ ime mmụọ, ọ pụkwara isowo kwado Josaịa ná mgbalị mbụ o mere iweghachi ezi ofufe. *2 Ihe E Mere 34:1-8.

Mgbe a na-arụzigharị ụlọ nsọ ahụ, a chọtara “akwụkwọ iwu ahụ,” Shefan malitekwara ‘ịgụ ya n’ihu eze.’ Akpata oyi wụrụ Josaịa n’ahụ́ mgbe ọ nụrụ ihe dị n’ime ya, o zigakwara ndị nnọchianya a tụkwasịrị obi na nke Hulda bụ́ onye amụma nwanyị iji jụọ Jehova ase banyere akwụkwọ ahụ. Eze ahụ tụkwasịrị Shefan na nwa ya bụ́ Ahaịkam obi site n’ịgụnye ha ná ndị nnọchianya ahụ.—2 Ndị Eze 22:8-14; 2 Ihe E Mere 34:14-22.

Ọ bụ nanị n’ebe a ka e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ ihe Shefan n’onwe ya mere. N’amaokwu ndị ọzọ nke Bible, e kwuru banyere ya nanị dị ka nna ma ọ bụ nna nna. Ụmụ Shefan sooro Jeremaịa onye amụma kpachie anya.

Ahaịkam na Gedalaịa

Dị ka anyị rịbaworo ama, mgbe mbụ a kpọtụrụ nwa Shefan bụ́ Ahaịkam aha bụ n’ihe banyere ndị nnọchianya ahụ e zigara na nke onye amụma nwanyị bụ́ Hulda. Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na e kwughị ọkwá Ahaịkam nọ na ya na Bible Hibru, ihe àmà na-egosi na ọ nọ n’ọkwá dị elu.”

Ihe dị ka afọ 15 ka ihe omume ahụ gasịrị, Jeremaịa bara n’ihe ize ndụ. Mgbe ọ dọrọ ndị ahụ aka ná ntị banyere nzube Jehova ibibi Jeruselem, “ndị nchụàjà na ndị amụma na ndị [Izrel] nile jidere ya, sị, Ị ghaghị ịnwụ anwụ.” Gịnịzi mere? Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu, sị: “Aka Ahaịkam nwa Shefan dị n’akụkụ Jeremaịa, ka ha wee ghara inye ya n’aka ndị [Izrel] ime ka ọ nwụọ.” (Jeremaịa 26:1-24) Gịnị ka nke a na-egosi? Akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary na-ekwu, sị: “Ọ bụghị nanị na ihe a merenụ na-egosi ùgwù Ahaịkam nwere, kamakwa ọ na-egosi na, dị ka ndị ọzọ so n’ezinụlọ Shefan, o nwere obiọma n’ahụ́ Jeremaịa.”

Ihe dị ka afọ 20 ka e mesịrị, mgbe ndị Babilọn bibisịrị Jeruselem na 607 T.O.A. ma dọrọ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ahụ n’agha laa, a họpụtara nwa nwa Shefan bụ́ Gedalaịa, nwa Ahaịkam, ilekọta ndị Juu fọdụrụnụ. Ò lekọtara Jeremaịa dị ka Shefan na ndị ọzọ so n’ezinụlọ ya mere? Ihe ndekọ Bible ahụ na-agụ, sị: “Jeremaịa wee bịakwute Gedalaịa nwa Ahaịkam ruo Mizpa, ya na ya wee biri.” N’ime ọnwa ole na ole, e gburu Gedalaịa, ndị Juu fọdụrụnụ kpọkwaara Jeremaịa mgbe ha kwagara Ijipt.—Jeremaịa 40:5-7; 41:1, 2; 43:4-7.

Gemaraịa na Maịkaịa

Nwa Shefan bụ́ Gemaraịa na nwa nwa ya bụ́ Maịkaịa keere òkè pụtara ìhè n’ihe omume ahụ a kọwara na Jeremaịa isi 36. Ọ bụ n’ihe dị ka 624 T.O.A., n’afọ nke ise nke Eze Jehoịakim. Beruk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaịa, gụpụtara n’akwụkwọ ahụ okwu Jeremaịa n’ụlọ Jehova, “n’ime ụlọ Gemaraịa nwa Shefan.” N’ihi ya, “Maịkaịa nwa Gemaraịa, nwa Shefan, wee nụrụ okwu nile nke Jehova nke sitere n’akwụkwọ ahụ.”—Jeremaịa 36:9-11.

Maịkaịa gwara nna ya na ndị isi ndị ọzọ nile banyere akwụkwọ mpịakọta ahụ, ha nile chọkwara ịnụ ihe e kwuru n’ime ya. Olee otú ha si meghachi omume? “O ruo, mgbe ha nụsịrị okwu ndị a nile, na ha tụrụ oké egwu, onye na ibe ya, ha wee sị Beruk, Anyị aghaghị igosi eze okwu ndị a nile.” Otú ọ dị, tupu ha agwa eze banyere ya, ha dụrụ Beruk ọdụ, sị: “Jee, zobe onwe gị, gị onwe gị na Jeremaịa; ekwekwala onye ọ bụla mara ebe unu onwe unu nọ.”—Jeremaịa 36:12-19.

Dị ka a tụrụ anya ya, eze jụrụ ozi dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ ma dọrie ya gbaa ya ọkụ. Ụfọdụ ndị isi, gụnyere nwa Shefan bụ́ Gemaraịa, “rịọrọrịị eze arịrịọ ka ọ ghara isure akwụkwọ mpịakọta ahụ: ma o geghị ha ntị.” (Jeremaịa 36:21-25) Akwụkwọ bụ́ Jeremiah—An Archaeological Companion na-ekwubi, sị: “Gemaraịa bụ onye nọ n’obí Eze Jehoịakim nke kwadosiri Jeremaịa ike.”

Elasa na Jeazanaịa

Na 617 T.O.A., Babilọn malitere ịchị alaeze Juda. E mere ka ọtụtụ puku ndị Juu, “ndị isi nile, na ndị dike nile bụ́ dimkpa . . . onye ọkà ọ bụla na ụzụ́ ọ bụla,” gụnyere Izikiel onye amụma, jee biri n’ala ọzọ. Matanaịa, bụ́ onye ndị Babilọn gbanwere aha ya ịbụ Zedekaịa, ghọrọ eze ọhụrụ nọ n’okpuru. (2 Ndị Eze 24:12-17) Mgbe e mesịrị, Zedekaịa zigara ndị nnọchianya nke gụnyere nwa Shefan bụ́ Elasa na Babilọn. Jeremaịa nyere Elasa akwụkwọ ozi nke nwere ozi dị mkpa sitere n’aka Jehova maka ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ.—Jeremaịa 29:1-3.

Ihe ndekọ Bible si otú a na-egosi na Shefan, ụmụ ya atọ, na ụmụ ụmụ ya abụọ, ji ọkwá ha dị ùgwù kwado ezi ofufe na onye amụma ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Jeremaịa. Gịnị banyere nwa Shefan, bụ́ Jeazanaịa? N’adịghị ka ndị ọzọ so n’ezinụlọ Shefan, ihe àmà gosiri na o keere òkè n’ikpere arụsị. N’afọ nke isii e mere ka Izikiel jee biri na Babilọn, ma ọ bụ n’ihe dị ka 612 T.O.A., onye amụma ahụ hụrụ ọhụụ nke ọ nọ na ya hụ ndị ikom 70 ka ha na-achụrụ arụsị àjà nsure ọkụ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Otu n’ime ha bụ Jeazanaịa, bụ́ nanị onye a kpọrọ aha n’ime ha. Nke a pụrụ ịpụta na o so ná ndị a ma ama n’ìgwè ahụ. (Ezikiel 8:1, 9-12) Ihe nlereanya Jeazanaịa na-egosi na mmadụ ịbụ onye a zụlitere n’ezinụlọ na-atụ egwu Chineke adịghị eme ka e jide n’aka na ọ ghaghị ịghọ onye ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova ofufe. Onye ọ bụla ga-aza ajụjụ banyere omume ya.—2 Ndị Kọrint 5:10.

Ịbụ Eziokwu nke Akụkọ Banyere Shefan na Ezinụlọ Ya

Ka ọ na-erule oge Shefan na ezinụlọ ya keere òkè n’ihe ndị mere na Jeruselem, ịka akara n’ihe abụrụwo ihe a ma ama na Juda. E ji akara gbaa akaebe ma ọ bụ bịanye aka n’akwụkwọ, e jikwa nkume ndị dị oké ọnụ ahịa, ọla, ọdụ́, ma ọ bụ ugegbe mee ha. Ihe a na-edekarị n’akara na-abụ aha onye nwe akara ahụ, aha nna ya, na mgbe ụfọdụ, ọkwá onye ahụ.

A chọtawo ọtụtụ narị akara ndị e ji asụsụ Hibru kanye n’ụrọ. Prọfesọ Nahman Avigad, bụ́ ọkà mmụta n’ihe odide Hibru oge ochie, kwuru, sị: “Ihe ndị e ji akara dee bụ nanị ihe odide Hibru oge ochie ndị a hụrụ aha ndị e kwuru banyere ha na Bible.” À chọtawo ihe ọ bụla e ji akara dee banyere Shefan ma ọ bụ ndị ezinụlọ ya? Ee, aha Shefan na nke nwa ya bụ́ Gemaraịa dị n’akara e gosiri na peeji nke 19 na 21.

Ndị ọkà mmụta na-ekwukwa na ma eleghị anya e dere aha mmadụ anọ ndị ọzọ so n’ezinụlọ ahụ n’ihe ndị e ji akara dee—Azalaịa, nna Shefan; Ahaịkam nwa Shefan; Gemaraịa nwa Shefan; na Gedelaịa, bụ́ onye ihe àmà na-egosi na e zoro aka n’ebe ọ nọ n’otu akara dị ka ‘onye na-elekọta Ezinụlọ ahụ.’ E weere ya na nke anọ n’ime akara ndị a bụ nke Gedelaịa, bụ́ nwa nwa Shefan, ọ bụ ezie na a kpọghị nna ya, bụ́ Ahaịkam, aha. Ọkwá ya nke e dere n’akara ahụ na-egosi na o so ná ndị nọ n’ọkwá kasị elu n’obodo ahụ.

Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịmụta?

Lee ihe nlereanya magburu onwe ya Shefan na ezinụlọ ya setịpụrụ n’iji ọkwá ha dị ùgwù kwado ma ezi ofufe ma Jeremaịa kwesịrị ntụkwasị obi! Anyị onwe anyị pụkwara iji ihe onwunwe anyị na ọnọdụ anyị kwado nzukọ Jehova na ndị anyị na ha na-efekọ ofufe.

Ọ bụụrụ anyị ihe na-enye afọ ojuju ma na-ewusi okwukwe ike ịghara nanị ịdị na-agụchi Bible anya, kamakwa, ime nnyocha n’ime ya na ịmara ndị àmà nke Jehova n’oge ochie dị ka Shefan na ndị ezinụlọ ya. Ha sokwa ‘n’oké ìgwè ndị àmà’ bụ́ ndị anyị pụrụ iṅomi ihe nlereanya ha.—Ndị Hibru 12:1.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ọ ghaghị ịbụ na Shefan tọrọ Josaịa nke ọma, n’ihi na Ahaịkam nwa Shefan etoruwo ogo mmadụ mgbe Josaịa dị ihe dị ka afọ 25.—2 Ndị Eze 22:1-3, 11-14.

[Igbe dị na peeji nke 22]

Hulda—Onye Amụma Nwanyị A Na-akwanyere Ùgwù

Ozugbo Eze Josaịa nụsịrị ihe dị ‘n’akwụkwọ iwu ahụ’ a chọtara n’ụlọ nsọ, o nyere Shefan na mmadụ anọ ndị ọzọ nọ n’ọkwá dị elu iwu ka ha gaa ‘jụọ Jehova ase’ banyere akwụkwọ ahụ. (2 Ndị Eze 22:8-20) Ebee ka ndị nnọchianya ahụ ga-eje nweta azịza? Jeremaịa, na ma eleghị anya Nehum na Zefanaịa, bụ́cha ndị amụma na ndị so dee Bible, bi na Juda n’oge ahụ. Otú ọ dị, ndị nnọchianya ahụ jekwuuru Hulda bụ́ onye amụma nwanyị.

Akwụkwọ bụ́ Jerusalem—An Archaeological Biography na-ekwu, sị: “Ihe dị ịrịba ama banyere ihe a merenụ bụ na ihe metụtara ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị n’akụkọ ahụ eyitụghị nnọọ ihe ọhụrụ. Ọ dịghị onye lere ya anya ma ọlị dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị na ìgwè nanị ndị ikom mejupụtara weere Akwụkwọ Mpịakọta nke Iwu ahụ jekwuru nwanyị iji mara ihe ọ na-ekwu. Mgbe o kwuru na ọ bụ okwu Onyenwe anyị, ọ dịghị onye gbaghara ihe o kwuru banyere okwu ahụ. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta bụ́ ndị na-achọ ịmata mkpa nke òkè ndị inyom keere n’Izrel oge ochie dị na-elegharakarị ihe a merenụ anya.” N’ezie, ozi a natara sitere n’aka Jehova.

[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 21]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Usoro Ọmụmụ nke Ezinụlọ Shefan

Meshulam

Azalaịa

Shefan

↓ ↓ ↓ ↓

Ahaịkam Elasa Gemaraịa Jeazanaịa

↓ ↓

Gedalaịa Maịkaịa

[Foto dị na peeji nke 20]

Gemaraịa na ndị ọzọ rịọrọ Jehoịakim ka ọ ghara ịgba akwụkwọ mpịakọta ahụ sitere n’aka Jeremaịa ọkụ

[Foto dị na peeji nke 22]

Ọ bụ ezie na Jeazanaịa so n’ezinụlọ Shefan, a hụrụ ya n’ọhụụ ebe ọ nọ na-ekpere arụsị

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]

Site n’aka Israel Antiquities Authority

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 21]

Site n’aka Israel Antiquities Authority