Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

MGBE Ọpụpụ ha site n’Ijipt gasịrị, a haziri ụmụ Izrel ịbụ mba. Nwa oge ka nke ahụ gasịrị, ha pụrụ ịbaworị n’Ala Nkwa ahụ, ma ha abaghị. Kama nke ahụ, ha aghaghị ịwagharị ruo ihe dị ka iri afọ anọ “n’ọzara ukwu ahụ nke dị egwu.” (Deuterọnọmi 8:15) N’ihi gịnị? Akụkọ ihe mere eme dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Ọnụ Ọgụgụ na-agwa anyị ihe merenụ. O kwesịrị ime ka anyị mata mkpa ọ dị irubere Jehova Chineke isi na ịkwanyere ndị nnọchiteanya ya ùgwù.

N’ịbụ nke Mozis dere n’ọzara na n’Ala Ihe Na-adịghị nke Moab, akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ bu ihe ndị mere n’ime afọ 38 na ọnwa 9—site na 1512 T.O.A. ruo 1473 T.O.A. (Ọnụ Ọgụgụ 1:1; Deuterọnọmi 1:3) E nwetara aha ya site ná ngụkọta abụọ nke ụmụ Izrel, e mere nke abụọ afọ 38 ka e mesịrị nke mbụ. (Isi nke 1-4, 26) E kere ihe a kọrọ na ya ụzọ atọ. Akụkụ nke mbụ na-akọ ihe ndị mere n’Ugwu Saịnaị. Nke abụọ na-akọ ihe ndị mere n’oge Izrel na-awagharị n’ọzara. Akụkụ nke ikpeazụ na-atụle ihe ndị mere n’Ala Ihe Na-adịghị nke Moab. Ka ị na-agụ ihe ndekọ a, ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ihe ndị a merenụ na-akụziri m? È nwere ụkpụrụ ndị dị n’akwụkwọ a ndị pụrụ ịbara m uru taa?’

N’UGWU SAỊNAỊ

(Ọnụ Ọgụgụ 1:1–10:10)

Nke mbụ ná ngụkọta abụọ ahụ e mere weere ọnọdụ mgbe ndị Izrel ka nọ n’ala ala Ugwu Saịnaị. Ndị nwoke gbara site n’afọ 20 gbagowe, ma e wezụga ndị Livaị, dị 603,550. Ihe àmà na-egosi na e mere ngụkọta ahụ n’ihi agha. Ọmụma ụlọikwuu ahụ dum, gụnyere ndị inyom, ụmụaka na ndị Livaị, pụrụ iru ihe karịrị nde mmadụ atọ.

Ka ngụkọta ahụ gasịrị, ụmụ Izrel anata ntụziaka banyere usoro isi eme njem, nkọwa zuru ezu nke ọrụ ndị Livaị na ozi ụlọikwuu, iwu nke mmechibido, na iwu ndị metụtara ekworo na nkwa ndị Naziraịt kwere. Isi nke 7 na-ekwu banyere àjà ndị isi ebo chụrụ n’ihe banyere ịrara ebe ịchụàjà nye, isi nke 9 na-atụlekwa ihe banyere ememe Ngabiga. E nyekwa nzukọ ahụ ntụziaka n’ihe banyere ịma ụlọikwuu na ibuli ije.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:1, 2—Gịnị bụ “ihe ịrịba ama” ndị nkewasị ebo atọ ndị ahụ ga-ama ụlọikwuu ha gburugburu ha n’ọzara? Bible akọwaghị ihe ihe ịrịba ama ndị a bụ. Otú ọ dị, e wereghị ha dị ka ihe oyiyi ndị dị nsọ ma ọ bụ jiri ha mee ihe n’ofufe. E ji ihe ịrịba ama ndị ahụ mee ihe bara uru—inyere mmadụ aka ịchọta ebe ụlọikwuu ya kwesịrị ịdị n’ọmụma ụlọikwuu ahụ.

5:27—Gịnị ka ‘apata ụkwụ nke nwanyị lụrụ dị kwara iko ịbụ arụ’ pụtara? E ji okwu bụ́ “apata ụkwụ” mee ihe n’ebe a ịpụta akụkụ ahụ́ ndị e ji amụ nwa. (Jenesis 46:26) Ya ‘ịbụ arụ’ na-enye echiche nke akụkụ ahụ́ ndị a iretọ, ka ịtụrụ ime wee ghara ikwe omume.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

6:1-7. Ndị Naziraịt ga-ezere ihe ndị sitere na vaịn na ihe ọṅụṅụ nile na-aba n’anya, bụ́ ihe na-achọ mmadụ ịnapụ onwe ya ihe. Ha ga-ahapụ ntutu isi ha ka o too ogologo—ihe àmà nke ido onwe ha n’okpuru Jehova, dị nnọọ ka ndị inyom si edo onwe ha n’okpuru di ma ọ bụ nna ha. Ndị Naziraịt ga-anọgide na-adị ọcha site n’ịghara imetụ ozu aka, ọbụna nke onye ikwu ha. Ndị ozi oge nile taa na-egosi otu mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà ahụ mgbe a bịara n’ịnapụ onwe onye ihe na ido onwe ha n’okpuru Jehova na ndokwa ya. Ọrụ ha ụfọdụ pụrụ ịgụnye ịga ala dị anya, bụ́ nke pụrụ ọbụna ime ka o sie ike ma ọ bụ ghara ikwe omume ha ịla ụlọ maka olili nke onye òtù ezinụlọ ha nwụrụ anwụ.

8:25, 26. Iji rụọ ọrụ ndị Livaị nke ọma, nakwa n’ihi nchebara echiche maka ndị agadi, e nyere ndị ikom meworo agadi iwu ịla ezumike nká site n’ịrụ ọrụ bụ́ iwu. Otú ọ dị, ha pụrụ inye onwe ha n’afọ ofufo iji nyere ndị Livaị ndị ọzọ aka. Ọ bụ ezie na a dịghị ala ezumike nká n’ịbụ onye nkwusa Alaeze taa, ụkpụrụ dị n’iwu a na-akụziri anyị ihe bara uru. Ọ bụrụ na n’ihi ime agadi Onye Kraịst apụghịzi ịrụ ọrụ ụfọdụ, ọ pụrụ ije ụdị ozi ndị ike ya kwere ya jee.

ỊGA SITE N’OTU EBE GAA N’EBE ỌZỌ N’ỌZARA

(Ọnụ Ọgụgụ 10:11–21:35)

Mgbe igwe ojii nọ n’elu ụlọikwuu ahụ mesịrị gbagoo, ụmụ Izrel amalite njem ga-eduga ha n’ọzara ihe na-adịghị nke Moab afọ 38 na otu ọnwa ma ọ bụ abụọ ka e mesịrị. Ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe bara uru ịtụle ụzọ ha si mee njem na map dị na peeji nke 9 nke broshuọ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ,’ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ka ha nọ n’ụzọ na-aga Kedesh, n’Ọzara Peran, ha emee mkpesa ọ dịkarịa ala ugboro atọ. A bịanyụọ nke mbụ mgbe Jehova zitere ọkụ iji gbuo ụfọdụ n’ime ndị ahụ. Ka nke ahụ gasịrị, ụmụ Izrel ebee ákwá maka anụ, Jehova ezitekwara ha nnụnụ quail. Miriam na Erọn emee mkpesa megide Mozis nke dugara na Miriam ịbụ onye e tiri ekpenta ruo nwa oge.

Ka ha mara ụlọikwuu na Kedesh, Mozis ezipụ ndị ikom 12 ịga ledo Ala Nkwa ahụ. Ha alọghachi ụbọchị 40 ka e mesịrị. N’ikwere akụkọ ọjọọ nke iri n’ime ndị nledo ahụ, ha achọọ ịtụgbu Mozis, Erọn na ndị nledo ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Jọshụa na Keleb. Jehova ekwuo na ya ga-eti ndị ahụ ọrịa na-efe efe, Mozis arịọchitere ha, Chineke ekwuokwa na ha ga-awagharị n’ọzara ruo afọ 40—ruo mgbe ndị ahụ a gụrụ ọnụ nwụsịrị.

Jehova enyekwuo iwu nchịkwa ndị ọzọ. Kora na ndị ọzọ enupụrụ Mozis na Erọn isi, ma e jiri ọkụ bibie ndị nnupụisi ahụ, ala elookwa ụfọdụ n’ime ha. N’echi ya, nzukọ ahụ dum atamuo ntamu megide Mozis na Erọn. N’ihi ya, mmadụ 14,700 nwụrụ n’ihi ihe otiti Jehova tiri ha. Iji mee ka a mata onye ọ họọrọ ịbụ nnukwu onye nchụàjà, Chineke emee ka mkpanaka Erọn waa okooko osisi. Jehova enyekwuo iwu ndị metụtara ọrụ ndị Livaị na nke ime ka a dị ọcha. Iji ntụ ehi na-acha uhie uhie eme ihe na-ese onyinyo ime ka a dị ọcha site n’ọbara Jizọs.—Ndị Hibru 9:13, 14.

Ụmụ Izrel alaghachi Kedesh, bụ́ ebe Miriam nwụrụ. Nzukọ ahụ emee mkpesa ọzọ megide Mozis na Erọn. Gịnị kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na mmiri adịghị. N’ihi na Mozis na Erọn edoghị aha Jehova nsọ mgbe ha mere ka mmiri pụta n’ụzọ ọrụ ebube, ha abaghị n’Ala Nkwa ahụ. Izrel ebulie ije site na Kedesh, Erọn anwụọkwa n’Ugwu Họọ. Ka ha na-aga gburugburu Idọm, ike agwụ ụmụ Izrel, ha ekwugide Chineke na Mozis. Jehova ezite agwọ ọjọọ iji nye ha ntaramahụhụ. Mozis arịọchitekwara ha ọzọ, Chineke enyekwa ya ntụziaka ime agwọ ọla ma kwụba ya n’elu osisi ka e wee gwọọ ndị agwọ ọjọọ ndị ahụ tara site na ha ile ya anya. Agwọ ahụ na-ese onyinyo mkpọgbu a kpọgburu Jizọs Kraịst maka abamuru ebighị ebi anyị. (Jọn 3:14, 15) Izrel emerie ndị Eze Amọn bụ́ Saịhọn na Ọg ma weghara ala ha.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

12:1—N’ihi gịnị ka Miriam na Erọn ji mee mkpesa megide Mozis? Isi ihe mere ha ji mee mkpesa bụ ikekwe ọchịchọ Miriam nwere inwetakwu ike. Mgbe nwunye Mozis, bụ́ Zipora, sonyeere Mozis n’ọzara ahụ, Miriam pụrụ ịtụwo ụjọ na a gaghịzi na-ele ya anya dị ka onyeisi ndị inyom n’ọmụma ụlọikwuu ahụ.—Ọpụpụ 18:1-5.

12:9-11—N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị Miriam ka e tiri ekpenta? O yikarịrị ka ọ̀ bụ ya kwalitere mkpesa ahụ ma rụgide Erọn isonyere ya. Erọn gosipụtara àgwà ziri ezi site n’ikwupụta mmejọ ya.

21:14, 15—Gịnị bụ akwụkwọ ahụ a kpọtụrụ aha ebe a? Akwụkwọ Nsọ zoro aka n’akwụkwọ dịgasị iche iche bụ́ ebe ndị dere Bible si nweta ihe ndị ha dere. (Joshua 10:12, 13; 1 Ndị Eze 11:41; 14:19, 29) ‘Akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova’ bụ otu n’ime ihe odide ndị ahụ. O nwere ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme nke agha ndị Jehova lụrụ.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

11:27-29. Mozis gosiri ihe nlereanya magburu onwe ya n’ihe banyere otú anyị kwesịrị isi meghachi omume mgbe ndị ọzọ nwetara ihe ùgwù n’ozi Jehova. Kama iji ekworo na-achọrọ onwe ya otuto, Mozis nwere obi ụtọ mgbe Eldad na Midad malitere ime ka ndị amụma.

12:2, 9, 10; 16:1-3, 12-14, 31-35, 41, 46-50. Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya ofufe na-egosi nkwanye ùgwù maka ikike sitere n’aka Chineke.

14:24. Otu ụzọ isi guzogide nrụgide ụwa nke ime ihe ọjọọ bụ ịzụlite ‘mmụọ ma ọ bụ ụzọ iche echiche dị iche.’ Ọ ghaghị ịbụ nke na-adịghị ka nke ụwa.

15:37-41. E mere ka ọnụ ọnụ uwe ụmụ Izrel pụọ iche iji chetara ha na ha bụ ndị e wepụrụ iche maka ofufe Chineke na irubere iwu ya isi. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghịkwa ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke ma nọpụ iche n’ụwa?

N’ALA IHE NA-ADỊGHỊ NKE MOAB

(Ọnụ Ọgụgụ 22:1–36:13)

Ka ụmụ Izrel mara ụlọikwuu n’ọzara ihe na-adịghị nke Moab, ụjọ ha atụọ ndị Moab. N’ihi ya, Eze Belak nke Moab egoo Belam ka ọ kọchaa ụmụ Izrel. Jehova amanye Belam ịgọzi ha. E jirizie ndị inyom Moab na Midian raba ndị ikom Izrel n’omume rụrụ arụ na ikpere arụsị. N’ihi ya, Jehova ebibie mmadụ 24,000 mere ihe ọjọọ. Ihe otiti ahụ abịa ná njedebe mgbe Finihas kwooro Jehova ekworo.

Ngụkọta nke abụọ egosi na ọ dịghịzi otu onye n’ime ndị ikom ahụ a gụrụ ná ngụkọta nke mbụ ka dị ndụ, ma e wezụga Jọshụa na Keleb. E nye Jọshụa ọrụ nke ịnọchi Mozis. A gwa ụmụ Izrel otú ha ga-esi na-achụ àjà dịgasị iche iche, nyekwa ha ntụziaka n’ihe banyere ikwe nkwa. Ndị Izrel abọọkwa ọ́bọ̀ n’ahụ́ ndị Midian. Ebo Ruben, Gad, na ọkara nke Manase ebiri n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan. E nye Izrel ntụziaka otú ha ga-esi gafee Jọdan ma weghara ala ahụ. E nye nkọwa zuru ezu nke ókè nke ala ndị ahụ. A ga-ekpebi ihe nketa ha site n’ife nza. E kenye ndị Livaị obodo 48, 6 n’ime ha ga-abụ obodo mgbaba.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

22:20-22—N’ihi gịnị ka iwe Jehova ji dị ọkụ megide Belam? Jehova ebuwo ụzọ gwa onye amụma bụ́ Belam ka ọ ghara ịkọcha ụmụ Izrel. (Ọnụ Ọgụgụ 22:12) Otú ọ dị, onye amụma ahụ sooro ndị ikom Belak n’ebumnobi nke ịkọcha Izrel. Belam chọrọ ime ihe ga-atọ eze Moab ahụ ụtọ ma nata ụgwọ ọrụ n’aka ya. (2 Pita 2:15, 16; Jud 11) Ọbụna mgbe a manyere Belam ịgọzi kama ịkọcha Izrel, ọ chọsiri ike inweta ihu ọma eze ahụ site n’ịtụ aro ka e jiri ndị inyom na-efe Bel rata ndị ikom Izrel. (Ọnụ Ọgụgụ 31:15, 16) Ya mere, ihe mere Chineke ji weso Belam iwe bụ oké anyaukwu nke onye amụma ahụ.

30:6-8—Di Onye Kraịst ọ̀ pụrụ iwezụga nkwa nwunye ya? N’ihe banyere nkwa, Jehova na-emesozi ndị na-efe ya ofufe ihe n’otu n’otu. Dị ka ihe atụ, mmadụ ịrara onwe ya nye Jehova bụ ihe mmadụ na-eme n’onwe ya. (Ndị Galeshia 6:5) Di enweghị ike iwezụga ma ọ bụ kagbuo nkwa dị otú ahụ. Otú ọ dị, nwunye kwesịrị izere ikwe nkwa ga-emegide Okwu Chineke ma ọ bụ ibu ọrụ o nwere n’ebe di ya nọ.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

25:11. Lee ihe nlereanya nke ịnụ ọkụ n’obi maka ofufe Jehova Finihas setịpụụrụ anyị! Ọ̀ bụ na ọchịchọ nke ime ka ọgbakọ dị ọcha ekwesịghị ịkpali anyị ịkọrọ ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst omume rụrụ arụ jọgburu onwe ya nke anyị maara?

35:9-29. Eziokwu bụ́ na onye gburu mmadụ n’amaghị ama aghaghị ịhapụ ebe obibi ya ma gbaga n’obodo mgbaba ruo oge ụfọdụ na-akụziri anyị na ndụ dị nsọ nakwa na anyị aghaghị ịkwanyere ya ùgwù.

35:33. Ọ bụ nanị ọbara nke ndị wụsịrị ọbara ndị aka ha dị ọcha ka a pụrụ iji kpuchie mmehie nke iji nkwafu nke ọbara ndị aka ha dị ọcha merụọ ala. Lee ka o si kwesị ekwesị na Jehova ga-ebibi ndị ajọ omume tupu a na-eme ka ụwa ghọọ paradaịs!—Ilu 2:21, 22; Daniel 2:44.

Okwu Chineke Na-akpa Ike

Anyị aghaghị ịkwanyere Jehova na ndị a họpụtara ibu ibu ọrụ n’etiti ndị ya ùgwù. Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ na-eme ka eziokwu a pụtakwuo nnọọ ìhè. Lee ka nke ahụ si bụrụ ihe mmụta dị mkpa n’ime ka a nọgide na-enwe udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ taa!

Ihe ndị a kọrọ banyere ha n’Ọnụ Ọgụgụ na-egosi otú ọ pụrụ isi dị mfe ndị na-eleghara ọnọdụ ime mmụọ ha anya ịdaba n’omume ọjọọ, ndị dị ka ntamu, omume rụrụ arụ, na ikpere arụsị. A pụrụ iji ụfọdụ ihe nlereanya na ihe mmụta ndị sitere n’akwụkwọ Bible a mee ihe maka mkpa ọgbakọ ná Nzukọ Ije Ozi n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. N’ezie, “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike” ná ndụ anyị.—Ndị Hibru 4:12.

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

Site n’igwe ojii ọrụ ebube nke dị n’elu ụlọikwuu ahụ, Jehova duziri ọmụma ụlọikwuu Izrel na mbuli ije ha

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Jehova ruru eru ka anyị rubere ya isi, ọ na-atụkwa anyị anya n’aka ịkwanyere ndị nnọchiteanya ya ùgwù