Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Bible ekwughị ka a ghara ịṅụ mmanya iji gọọrọ mmadụ ọfọ ahụ́ ike, gịnịzi mere Ndịàmà Jehova anaghị aṅụ mmanya iji gọọrọ mmadụ ọfọ ahụ́ ike?

Iji iko mmanya (ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ ọzọ) n’aka agọ ọfọ ndụ na ahụ́ ike bụ ihe dị adị kemgbe na ihe a na-eme n’ọtụtụ ebe, ọ bụ ezie na otú e si eme ya nwere ike ịdịtụ iche site n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ. Mgbe ụfọdụ, ndị na-agọrọ onwe ha ọfọ ndụ na ahụ́ ike na-akụkọta iko ha. Onye ahụ na-agọ ọfọ ahụ na-agọrọ mmadụ ọfọ obi ụtọ, ahụ́ ike, ogologo ndụ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ yiri ya. Ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ a na-agọ ọfọ nwere ike ikwu ihe ụfọdụ iji gosi na ha kwenyere n’ọfọ ahụ ma ọ bụ welie iko mmanya ha ma ṅụrụtụ mmanya. Ọtụtụ ndị chere na ọ dịghị ihe dị njọ n’omenala a ma ọ bụkwanụ na ọ bụ ihe mmadụ ji egosi na obi ya dị ọcha n’ebe ndị ọzọ nọ, ma e nwere ezigbo ihe ndị mere Ndịàmà Jehova adịghị eso agọ ọfọ.

Ọ bụghị na Ndị Kraịst adịghị achọ ka mmadụ nwee obi ụtọ na ahụ́ ike. Òtù na-achị isi na narị afọ mbụ ji okwu ndị nwere ike ịpụta “nweenụ ahụ́ ike,” “nọdụnụ nke ọma,” ma ọ bụ “ya dịrị unu ná mma” mechie akwụkwọ ozi ha degaara ọgbakọ ndị dị n’oge ahụ. (Ọrụ 15:29) Ụfọdụ ndị fere ezi ofufe gwakwara ndị eze bụ́ mmadụ, sị: “Ka onyenwe m . . . dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi” ma ọ bụ “Ka eze dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Ndị Eze 1:31; Nehemaịa 2:3.

Ma, olee otú omenala ịgọrọ mmadụ ọfọ ndụ na ahụ́ ike si malite? Ụlọ Nche (Bekee) nke January 1, 1968, hotara ihe dị n’akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ The Encyclopædia Britannica (1910), Mpịakọta nke 13, peeji nke 121, sị: “O yiri nnọọ ka è si n’ememe okpukpe oge ochie nke ịṅụ mmanya iji too chi dị iche iche na ndị nwụrụ anwụ nweta omenala nke ịṅụ mmanya iji ‘gọọrọ ndị dị ndụ ọfọ ahụ́ ike.’ Ndị Gris na ndị Rom tụpụụrụ chi ha dị iche iche mmanya n’ala mgbe ha na-eri nri, ha na-aṅụkwa mmanya n’oge ememe ha iji too ha na ndị nwụrụ anwụ.” Akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ kwukwara, sị: “Ọ ghaghị ịbụ na ndị ahụ na-aṅụ mmanya dị ka ụzọ isi chụọrọ chi ha dị iche iche àjà na-aṅụkwa mmanya iji gọọrọ ndị dị ndụ ọfọ ahụ́ ike mgbe ọ bụla ha na-eme nke ahụ.”

À ka na-eme ya taa? Otu akwụkwọ e bipụtara n’afọ 1995 nke a kpọrọ International Handbook on Alcohol and Culture kwuru, sị: “O nwere ike ịbụ na [iji mmanya agọrọ mmadụ ọfọ] bụ ihe na-emetụtaghị okpukpe nke sitere n’àjà a na-achụrụ chi dị iche iche n’oge ochie site n’ịtụrụ ha ihe dị nsọ n’ala: ọbara ma ọ bụ mmanya iji rịọta ha ihe, iji rịọ ha arịrịọ site n’ikwu ihe ndị dị ka ‘nyenụ anyị ogologo ndụ!’ ma ọ bụ ‘nyenụ anyị ahụ́ ike!’”

N’ezie, na e ji ihe mee ihe ma ọ bụ na e mere ihe ụfọdụ n’okpukpe ụgha n’oge ochie apụtachaghị na onye na-efe ezi ofufe aghaghị izere ya. Were mkpụrụ osisi pomegranate dị ka ihe atụ. Otu akwụkwọ nkà mmụta Bible a ma ama kọrọ, sị: “O yiri ka è lekwara mkpụrụ osisi pomegranate anya dị ka ihe dị nsọ n’okpukpe ndị ọgọ mmụọ.” N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke kwuru ka a kwanye pomegranate nke ogho n’ọnụ ọnụ ala uwe nke nnukwu onye nchụàjà, e jikwa pomegranate chọọ ogidi ọla kọpa nke dị n’ụlọ nsọ Solomọn mma. (Ọpụpụ 28:33; 2 Ndị Eze 25:17) Ọzọkwa, ọla agbamakwụkwọ nwere ihe ọ pụtara n’okpukpe. Ma, ọtụtụ ndị taa amaghị nke ahụ, ha na-ewere ya nanị dị ka ihe e ji ama onye lụrụla di ma ọ bụ nwunye.

Olee maka iji mmanya eme ihe mgbe a na-eme ememe okpukpe? Dị ka ihe atụ, n’otu oge, ndị ikom Shekem na-efe Bel ‘banyere n’ụlọ chi ha, rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, kọchaa Abimelek,’ nwa Gidiọn. (Ndị Ikpe 9:22-28) Ì chere na onye na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova gaara eso ṅụọ mmanya ahụ, eleghị anya na-akpọku chi ụgha inye ya ikike iji megide Abimelek? Mgbe Emọs na-akọwa oge ọtụtụ ndị Izrel nupụụrụ Jehova isi, o kwuru, sị: “Ha na-esetị onwe ha n’akụkụ ebe ịchụàjà nile ọ bụla, ọ bụkwa mmanya vaịn nke ndị e riworo ha nha ka ha na-aṅụ n’ụlọ Chineke ha.” (Emọs 2:8) Ndị na-efe ezi ofufe, hà ga-eso mee ihe ndị dị otú ahụ, ma à wụsaara chi ndị ahụ mmanya ahụ dị ka ịtụrụ ha mmanya ma ọ bụ ṅụọ mmanya ahụ mgbe a na-eme ihe ndị ahụ? (Jeremaịa 7:18) Ma ọ bụ, onye na-efe ezi ofufe, ọ̀ ga-ebuli iko mmanya elu na-akpọku otu chi ka ọ gọzie ọdịnihu mmadụ?

Ọ dị mma ịmara na ọ dịla mgbe ndị na-efe Jehova chịliri aka ha elu ma rịọ maka ihe ọma. Ọ bụ ezi Chineke ahụ ka ha chịliiri aka ha. Anyị na-agụ, sị: “Solomọn wee guzo n’ihu ebe ịchụàjà Jehova . . . wee gbasaa ọbụ aka ya abụọ n’ebe eluigwe dị: ọ sị, Jehova, bụ́ Chineke Izrel, ọ dịghị Chineke dị ka Gị . . . Gị onwe gị nụrụkwa n’ebe obibi Gị, n’eluigwe; mgbe Ị nụworo, Gị gbaghara.’” (1 Ndị Eze 8:22, 23, 30) N’otu aka ahụkwa, “Ezra wee gọzie Jehova . . . Ndị ahụ nile wee zaa, sị, Amen, Amen n’ịchịli aka ha elu: ha wee rube isi ha, kpọọ isiala nye Jehova.” (Nehemaịa 8:6; 1 Timoti 2:8) O doro anya na ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi achịlighị aka ha elu iji nweta ngọzi n’aka chi ihu ọma.—Aịsaịa 65:11.

Ọtụtụ ndị na-agọrọ mmadụ ọfọ ndụ na ahụ́ ike taa nwere ike iche na ha adịghị arịọ chi ọ bụla ka ọ gọzie ha, ma ha enweghịkwa ike ịkọwa ihe mere ha na-eji ebuli iko mmanya ha elu. Otú o sina dị, na ha anaghị echebara ihe ha na-eme echiche agaghị eme ka ezi Ndị Kraịst chee na ha kwesịrị iṅomi ha.

Ọ bụ ihe a maara ebe nile na ọ dị ụfọdụ ihe Ndịàmà Jehova na-adịghị eme nke ọtụtụ ndị na-eme taa. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-eme ihe ụfọdụ n’ihu ihe ndị na-anọchi anya mba, ma ọ bụ ọkọlọtọ; ha anaghị ele ihe ndị ahụ ha na-eme anya dị ka ofufe. Ezi Ndị Kraịst adịghị egbochi ndị mmadụ ime ihe ndị dị otú ahụ, ma ha adịghị eso eme ha. Ọtụtụ Ndịàmà ejiwo akọ mee ihe iji ghara ịkpasu ndị ọzọ iwe site n’ịghara ịnọ ya n’oge a pụrụ ime ememe dị otú ahụ. Ha kpebiri na ha agaghị eme ihe ọ bụla a na-eme iji sọpụrụ mba, bụ́ nke na-ekwekọghị na Bible. (Ọpụpụ 20:4, 5; 1 Jọn 5:21) Ọtụtụ ndị taa nwere ike ha agaghị ele ịgọrọ mmadụ ọfọ ndụ na ahụ́ ike anya dị ka ihe metụtara okpukpe. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ezi ihe mere Ndị Kraịst adịghị esonye n’ịgọrọ mmadụ ọfọ, bụ́ nke malitere n’okpukpe ụgha nakwa nke a pụrụ iwere ugbu a dị ka ịrịọ ‘eluigwe’ arịrịọ maka ngọzi, dị ka à ga-asị na mmadụ na-achọ enyemaka n’aka onye karịrị mmadụ ike.—Ọpụpụ 23:2.