Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Niu Yọk

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Niu Yọk

AFỌ ole na ole gara aga, otu nwanna aha ya bụ Cesar na nwunye ya bụ́ Rocio bi na Kalịfọnịa. Ha na-akpata ihe na-ezuru ha. Ọrụ Cesar ji oge ya niile na-arụ bụ ihe gbasara ihe na-eme ka ụlọ kpoo ọkụ, ihe na-eme ka ikuku na-abata n’ụlọ, nakwa ntụoyi. Rocio na-arụ ọrụ ụbọchị ụfọdụ n’ọfis onye dọkịta. Ha nwere ụlọ nke ha. Ha enweghịkwa ụmụ. Ma, e nwere otu ihe mere ka ha gbanwee otú ha si ebi ndụ. Gịnị ka ọ bụ?

N’ọnwa iri n’afọ 2009, alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka degaara ọgbakọ niile dị n’obodo ahụ akwụkwọ ozi, kwuo na ndị niile nwere aka ọrụ nwere ike itinye akwụkwọ ka ha bịa rụọ ọrụ nwa oge na Betel. Ha ga-eso rụọ ụlọ ndị ọhụrụ a chọrọ ịrụ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Wọlkil, Niu Yọk. E kwukwara na ndị gaferela afọ ole ndị chọrọ ịga Betel na-ekwesịghị ịgafe nwere ike itinye akwụkwọ. Nwanna Cesar na Rocio nwunye ya kwuru, sị: “N’ihi afọ ole anyị dị, anyị ma na ihe a bụ naanị ohere anyị nwere iji jee ozi na Betel. Anyị agaghị ekwe ka ọ kwaa anyị.” Ha dejupụtara akwụkwọ ozugbo ma ziga ya.

Ihe a bụ ụfọdụ ndị so na-arụ ọrụ na Wọwik

Mgbe ihe karịrị otu afọ gara, a kpọbeghị Cesar na Rocio ka ha bịa jewe ozi na Betel. Ma, ha malitere ịkwụsị ibi ndụ okomoko. Cesar kwuru, sị: “Anyị rụgharịrị ebe anyị na-adọwa ụgbọala ka ọ bụrụ otu ọnụ ụlọ ka anyị nwee ike inye onye ọzọ ụlọ anyị ka ọ kwụwa anyị ụgwọ. Anyị si ná nnukwu ụlọ anyị rụrụ n’oge na-adịbeghị anya kwaga n’otu ọnụ ụlọ ahụ. Ebe ahụ anyị bibu ka ebe anyị bi ugbu a okpukpu asatọ. Ihe ndị a anyị mere mere ka anyị jikere ejikere maka ịga Betel mgbe ọ bụla a kpọrọ anyị.” Gịnịzi mere? Rocio kwuru, sị: “Otu ọnwa anyị kwafechara n’otu ọnụ ụlọ anyị ahụ, anyị natara akwụkwọ ozi e ji kpọọ anyị ka anyị bịa rụwa ọrụ nwa oge na Wọlkil. Anyị ma na Jehova ga-agọzi anyị n’ihi na anyị hapụrụ ihe ụfọdụ ka anyị nwee ike ijekwuru ya ozi.”

Jason, Cesar, na William

JEHOVA NA-AGỌZI HA MAKA OTÚ HA SI WEPỤTA ONWE HA

Ọtụtụ narị ụmụnna emeela ụdị ihe a Cesar na Rocio mere. Ha ahapụla ihe ụfọdụ ka ha nwee ike iso rụọ ụlọ ndị ahụ a na-arụ na Steeti Niu Yọk. Ụfọdụ  n’ime ha so na-arụ ụlọ ọhụrụ ndị a na-arụ na Wọlkil. E nwekwara ndị so na-arụ isi ụlọ ọrụ anyị a na-arụ na Wọwik. * Ọtụtụ di na nwunye ahapụla ụlọ mara mma ha rụrụ, ezigbo ọrụ ha na-arụ, na anụ ụlọ ha ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Jehova ọ̀ gọziela ha maka ihe a niile ha hapụrụ? À na-ajụkwa ajụ?

Way

Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna na-awaya ọkụ aha ya bụ Way. Ya na Debra nwunye ya dị ihe dị ka iri afọ ise na asatọ. Ha rere ụlọ ha na ọtụtụ ihe ha nwere na Kansas ma kwaga Wọlkil ka ha nwee ike ịna-arụ ọrụ n’ebe ahụ. Ma, ha ga-esi n’ebe ha bi na-aga. * Ọ bụ eziokwu na o mere ka ha gbanwee ọtụtụ ihe ha na-eme, obi siri ha ike na ihe niile ha hapụrụ efughị ọhịa. Debra kwuru gbasara ọrụ ọ na-arụ na Betel, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka m̀ so ná ndị ahụ na-arụ ụlọ na Paradaịs a na-ese n’akwụkwọ anyị.”

Otu nwanna aha ya bụ Melvin na Sharon nwunye ya rere ụlọ ha na ihe ndị ọzọ ha nwere na Saụt Karolaịna ka ha nwee ike iso rụọ ọrụ na Wọwik. Ọ bụ eziokwu na ịhapụ ihe ndị ahụ adịghịrị ha mfe, ha ghọtara na iso rụọ ọrụ ahụ dị mkpa bụ ihe ùgwù. Ha kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ na-arụ ihe ọ ma na ọ ga-abara nzukọ Jehova zuru ụwa ọnụ uru, onye ahụ ga-enwe obi ụtọ na-enweghị atụ.”

Kenneth

E nwere otu nwanna lara ezumike nká aha ya bụ Kenneth. Ọ na-arụbu ụlọ. Ya na Maureen nwunye ya dị ihe dị ka iri afọ ise na ise. Ha si Kalịfọnịa kwapụ ka ha nwee ike iso rụọ ọrụ na Wọwik. Ka ha nwee ike ịga, ha gwara otu nwanna nwaanyị ka ọ na-elekọtara ha ụlọ ha, gwakwa ndị ezinụlọ ha ka ha nyere ha aka lekọta papa Ken merela agadi. Hà na-akwa mmakwaara maka ihe niile ha hapụrụ ka ha nwee ike ije ozi na Betel? Mba. Ken kwuru, sị: “Uru anyị na-erite enweghị atụ. Ọ̀ pụtara na o nweghị ihe siiri anyị ike? Mba. Ma, anyị ji ndụ anyị na-eme ihe bara uru. Anyị jikwa obi anyị niile na-agwa ndị ọzọ ka ha jewe ụdị ozi a.”

NSOGBU NDỊ HA MERIRI

E nwere nsogbu ụfọdụ ọtụtụ n’ime ndị wepụtara onwe ha bu ụzọ merie. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna aha ya bụ William. Ya na Sandra nwunye ya dị ihe dị ka iri afọ isii na atọ. Ahụ́ ruru ha ala na Pensụlvenịa ha bi. Ha na-akpatakwa ihe na-ezuru ha. Ha nwere ụlọ ọrụ na-akpụpụta akụkụ njin dị iche iche, nweekwa mmadụ iri na asaa na-arụrụ ha ọrụ. Ọgbakọ ha nọ n’oge ahụ bụ ọgbakọ ha nọ kemgbe ha dị obere. Ọtụtụ ndị ezinụlọ ha bikwa ha nso. N’ihi ya, mgbe ha hụrụ ohere a ha ga-eji gaa  rụwa ọrụ na Wọlkil, ha ma na ọ bụrụ na ha ekpebie ịga, ọ pụtara na ha ga-ahapụ ihe niile maara ha ahụ́ nakwa ndị niile ha ma. William kwuru, sị: “O doro anya na otu ihe kacha siere anyị ike bụ otú anyị ga-esi ahapụ ihe niile na-amasị anyị.” Ma, ha kpere ekpere ugboro ugboro ma kpebie ịkwaga ebe ahụ. Ha anaghị akwa ụta maka ya. William kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe e nwere ike iji tụnyere obi ụtọ anyị nwere maka na anyị so na-arụ ọrụ a, anyị na ndị ezinụlọ Betel ana-arụkọkwa ọrụ. Mụ na Sandra enwetụbeghị ụdị obi ụtọ anyị nwere ugbu a.”

Ihe a bụ ụfọdụ ndị di na nwunye so na-arụ ụlọ ọhụrụ ndị a na-arụ na Wọlkil

E nwere otu nwanna bụ́ onyeisi na-elekọta ndị na-arụ ụlọ na Hawaị. Aha ya bụ Ricky. A kpọrọ ya ka ọ bịa soro rụwa ọrụ na Wọwik. Ọ ga-esi n’ụlọ ya na-aga ọrụ ebe ahụ kwa ụbọchị. Kendra nwunye ya chọrọ ka o kweta ịga. Ma e nwere ihe bidoro ichu ha abụọ ụra, ya bụ, ihe gbasara nwa ha nwoke dị afọ iri na otu aha ya bụ Jacob. Ha nọ na-eche ma ọ̀ ga-adị mma ka ha niile kwaga na Steeti Niu Yọk nakwa ma ebe ahụ ọ̀ ga-ekwe nwa ha obibi.

Ricky kwuru, sị: “Ihe mbụ anyị chọrọ ime bụ ịchọta ọgbakọ nwere ọtụtụ ụmụaka na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Anyị chọrọ ka e nwee ọtụtụ ndị bụ́ ezigbo mmadụ ha na Jacob ga na-akpa.” O mechara bụrụ na e nwere ụmụaka ole na ole n’ọgbakọ ha nọ na ya. Ma, e nwere ọtụtụ ndị Betel na ya. Ricky kwuru, sị: “Mgbe anyị gachara ọmụmụ ihe mbụ anyị, ajụrụ m Jacob otú obi dị ya maka ọgbakọ a anyị gafere ọhụrụ, nke ka nke, ebe ọ bụ na e nweghị ndị ya na ha bụ ọgbọ. Ọ gwara m, sị, ‘Papa, echegbula onwe gị. Ndị enyi m ga-abụ ụmụ okorobịa na-eje ozi na Betel.’”

Ebe Jacob na papa ya na mama ya na ndị Betel nọ n’ọgbakọ ha na-akọrị

Ụmụ okorobịa na-eje ozi na Betel emetala Jacob enyi. Olee uru ọ baara ya? Ricky kwuru, sị: “E nwere otu abalị m na-agafe n’ebe nwa m nwoke bi. M chọpụtara na ọkụ ka na-enwu n’ọnụ ụlọ ya. M bu n’obi na m ga-ahụ ya ebe ọ na-egwu egwuregwu kọmputa. Ma, ọ nọ na-agụ Baịbụl. Mgbe m jụrụ ya ihe ọ na-eme, ọ sịrị m, ‘M chọrọ ime ka ndị Betel. M ga-agụcha Baịbụl n’otu afọ.’” O doro anya na obi dị Ricky na Kendra ụtọ. Ihe mere obi ji dị ha ụtọ abụghị naanị na Ricky so na-arụ ọrụ na Wọwik, kama ebe ahụ ha kwagara emeela ka nwa ha nwoke jiri ofufe Jehova kpọrọkwuo ihe.—Ilu 22:6.

HA ANAGHỊ ECHEGBU ONWE HA MAKA ECHI

Luis na Dale

A ga-emecha rụchaa ụlọ ndị ahụ a na-arụ na Wọlkil na Wọwik. N’ihi ya, ndị a kpọrọ ka ha bịa soro rụọ ọrụ ma na ọrụ ha bịara ịrụ na Betel bụ nwa oge. Ụmụnna ndị a hà na-echegbu onwe ha gbasara ebe ha ga-aga ma ọ bụ ihe ha ga na-arụ ma a sị ha lawa? Mba. Obi dị ọtụtụ n’ime ha otú ọ dị ụmụnna abụọ na ndị nwunye ha. Ha anọ si Flọrịda, dịrịkwa afọ iri ise na ụma. Aha otu bụ John. Ọ bụ onye na-elekọta ndị na-arụ ụlọ. Ya na Carmen nwunye ya  jere ozi nwa oge na Wọwik. Ha kwuru, sị: “Anyị ahụla otú Jehova si na-egboro anyị mkpa anyị ruo ugbu a. Obi siri anyị ike na Jehova agaghị akpọta anyị ebe a ma mechaa hapụ anyị.” (Ọma 119:116) Aha nwanna nke ọzọ bụ Luis. Ọ bụ onye na-arụpụta ihe ndị e ji emenyụ ọkụ. Ya na Quenia nwunye ya na-eje ozi na Wọlkil. Ha kwuru, sị: “Anyị na-ahụ otú Jehova si na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa. Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị otú ọ ga-esi eme ya, mgbe ọ ga-eme ya, na ebe ọ ga-eme ya, obi siri anyị ike na ọ gaghị akwụsị igboro anyị mkpa anyị.”—Ọma 34:10; 37:25.

 JEHOVA GA-AGỌZI GỊ ‘RUO MGBE Ọ NA-ENWEGHỊ IHE GA-AKỌ GỊ’

John na Melvin

Ọtụtụ n’ime ụmụnna ndị a gaara ahụ ihe ndị ha ga-asị na ọ bụ ha mere na ha agaghị eso rụọ ụlọ ndị a a na-arụ na Niu Yọk. Ma, ha nwalere Jehova otú ahụ ọ gwara anyị niile ka anyị mee. O kwuru, sị: “Biko, nwaleenụ m, . . . ma ḿ gaghị emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe wee wụsa unu ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ unu.”—Mal. 3:10.

Ị̀ ga-anwale Jehova ka ị hụ otú ọ ga-esi gọzie gị? Kpee ekpere ma chee echiche ihe ị ga-eme ka i nwee ike iso rụọ ọrụ dị mkpa a na-arụ ugbu a, ma ọ̀ bụ na Niu Yọk ma ọ̀ bụ n’ebe ọzọ a na-arụ ụlọ ná nzukọ Jehova. I mee otú ahụ, ị ga-eji anya gị hụ otú Jehova ga-esi gọzie gị.—Mak 10:29, 30.

Gary

E nwere otu nwanna aha ya bụ Dale. Ọ bụ njinia na-ahụ maka ịrụ ụlọ. Ya na Cathy nwunye ya si Alabama. Ha ji obi ha niile na-agwa onye ọ bụla na ụdị ọrụ a magburu onwe ya. Ha so ná ndị na-arụ ọrụ ugbu a na Wọlkil. Ha kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị kata obi hapụ ihe ụfọdụ na-amasị gị, ị ga-ahụ ihe gosiri na mmụọ Jehova na-akpa ike.” Gịnị ka mmadụ ga-eme ka o nwee ike ijekwuru Jehova ozi? Dale kwuru, sị: “Gbasie mbọ ike ka ị hapụkwuo ihe ndị na-eri gị oge. Ị gaghị akwa ụta ma i mee otú ahụ.” Onye ọzọ bụ nwanna nwoke si Nọt Karolaịna aha ya bụ Gary. Ọ haziri ihe gbasara ịrụ ụlọ ruo afọ iri atọ. Ya na Maureen nwunye ya kwuru na otu uru ọrụ ha na-arụ na Wọwik na-abara ha bụ na o meela ka ha “mata ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị jirila ọtụtụ afọ jeere Jehova ozi na Betel ma soro ha na-arụ ọrụ.” Gary kwuru, sị: “Onye ọ bụla chọrọ ije ozi na Betel ekwesịghị ibi ndụ okomoko. Ọ bụ otú kacha mma anyị ga-esi lafere n’ụwa ochie a.” E nwere nwanna nwoke ọzọ aha ya bụ Jason. Ọ na-arụbu ọrụ n’otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ịwaya ọkụ. Ya na Jennifer nwunye ya si Ilinọị. Ha kwuru na iso na-arụ ụlọ ọhụrụ ndị a na-arụ na Betel dị na Wọlkil ‘so n’ihe ya na ụdị ọrụ a ga-arụ n’ụwa ọhụrụ kacha yie.’ Jennifer kwuru, sị: “Obi dị anyị ezigbo ụtọ n’ihi na anyị ma na Jehova anaghị eji ihe ọ bụla anyị na-arụ egwu egwu. Ọ ga-abakwa ezigbo uru n’ụwa ọhụrụ o kwere anyị ná nkwa. Otú Jehova si agọzi onye na-arụ ụdị ọrụ a enweghị atụ.”

^ para. 7 Ndị na-esi n’ụlọ ha aga ọrụ na Betel ụbọchị ụfọdụ na-egboro onwe ha mkpa ha, ma ịkwụ ụgwọ ụlọ ma ihe ndị ọzọ. Ha na-eji otu ụbọchị ma ọ bụ karịa arụ ọrụ na Betel kwa izu.