Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Mụ na Chineke na Mama M Dịzi ná Mma

Mụ na Chineke na Mama M Dịzi ná Mma

“GỊNỊ mere na ị gaghị efe ndị nna nna gị? Ọ̀ bụ na ị maghị na ọ bụ ha mere ka ị dị ndụ? Ị́ gaghị egosi ha na obi dị gị ụtọ maka ihe ha meere gị? Gịnị mere ị ga-eji jụ omenala nna nna anyị hà kụziiri anyị? Ọ bụrụ na i kweghị asọpụrụ ndị nna nna anyị, ihe ị na-ekwu bụ na ofufe anyị abaghị uru.” Ihe ndị a ka mama m gwara m. Ozugbo o kwuchara, ya ebewe ákwá.

Ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ, Ndịàmà Jehova gwara mama m ka ha na ya mụwa Baịbụl. Ọ chọghị ịmụ Baịbụl, ma ọ gwara ha ka ha mụwara m Baịbụl n’ihi na ọ chọghị ka iwe wee ha. Ma, ọ maliteziri iwesa m iwe, nke bụ́ ihe ọ na-anaghị emebu ebe ọ bụ na m na-erubere ya isi mgbe niile. Ma, ebe ọ bụ na m chọrọ ime ka obi dị́ Jehova ụtọ, o nweghị otú m ga-esi eme ihe a mama m kwuru. Ọ dịghị mfe, ma Jehova nyere m ike ime ya.

OTÚ M SI GHỌỌ ONYE KRAỊST

Ezinụlọ anyị na-ekpe okpukpe Buda otú ahụ ọtụtụ ndị Japan na-ekpe. Ma, mgbe mụ na Ndịàmà Jehova mụrụ Baịbụl ọnwa abụọ, o doro m anya na ihe Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu. Mgbe m mụtara banyere Nna m nke eluigwe, m chọrọ ịmata ya nke ọma. Ná mmalite, mụ na mama m kwurịtara ihe m na-amụta. M bidoro ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụbọchị Sọnde. Ka m na-amụtakwu eziokwu Baịbụl, m gwara mama m na m gaghịzi eso ha na-eme ememme ndị Buda. Àgwà ya gbanwere ozugbo. O kwuru, sị: “Inwe onye na-ahụghị ndị nna nna anyị n’anya n’ezinụlọ anyị bụ ihe ihere.” Ọ gwara m ka m kwụsị ịmụ Baịbụl na ịga ọmụmụ ihe. Amaghị m na mama m ga-ekwu ụdị ihe a. Ọ na-emezi ka onye ọzọ.

M mụtara ná Ndị Efesọs isi isii na Jehova chọrọ ka m na-erubere papa m na mama m isi. Papa m dụnyeere mama m úkwù. M chọrọ ka udo dịghachi n’ezinụlọ anyị. M chekwara na ọ bụrụ na mụ egee ha ntị, ha ga-emecha hapụ m ka m gawa ọmụmụ ihe. Ihe ọzọ bụ na ule e ji abanye n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị eruwela mgbe ahụ, m kwesịkwara ịkwadebe maka ya. N’ihi ya, m kwetara ime ihe ha kwuru ruo ọnwa atọ. Ma, m kwere Jehova nkwa na m ga-amalitekwa ịga ọmụmụ ihe ma ọnwa atọ ahụ gachaa.

E nwere ihe abụọ mere o ji bụrụ na ihe ahụ m kpebiri ime adịghị mma. Nke mbụ bụ na m chere na ọnwa atọ ahụ gachaa, m ka ga-achọsi ife Jehova ike. Kama ime otú ahụ, adịm ná mma mụ na Jehova nyụrụ ka ọkụ n’egbughị oge. Nke abụọ bụ na mama m na papa m nyekwuru m nsogbu ka m kwụsị ife Jehova.

AKA E NYEERE M NA MMEGIDE E MEGIDERE M

N’oge ahụ m na-aga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, m hụrụ ọtụtụ ndị ndị ezinụlọ ha na-emegide. Ha gwasiri m ike na Jehova ga-eme ka m dị ike. (Mat. 10:34-37) Ha gwara m na ọ bụrụ na mụ anọsie ike n’ofufe Jehova, ndị ezinụlọ anyị nwere ike ịmụta banyere Jehova. N’ihi ya, m malitere ikpesi ekpere ike, ebe ọ bụ na m chọrọ ịmụta otú m ga-esi atụkwasị Jehova obi.

E nwere ọtụtụ ụzọ e si na-emegide m n’ezinụlọ anyị. Mama m rịọsiri m ike ka m kwụsị ịmụ Baịbụl, na-ekwukwa ihe ga-eme ka m gbanwee obi m. Ọtụtụ mgbe, m na-agbachi nkịtị. Mgbe ọ bụla m kwuru okwu, olu mụ na ya na-alawa elu n’ihi na anyị abụọ na-agbalị igosi na ihe anyị na-ekwu ziri ezi. Ma, aghọtala m ugbu a na ihe gaara aka mma ma a sị na m kwanyekwuuru mama m na ihe ndị o kweere ùgwù. Mama m na papa m nyekwuru m ọrụ m ga na-arụ n’ụlọ ka m ghara isi n’ụlọ pụọ. Mgbe ụfọdụ, m pụọ, ha na-akpọchi ụzọ ka m ghara ịbata. E nwere mgbe ụfọdụ ha na-enyeghị m nri.

Mama m gara kpọọ ndị ọzọ ka ha bịa nyere ya aka. Ọ gwara onye nkụzi anyị. Ma ọ chọghị itinye ọnụ n’okwu ahụ. Mama m kpọ m gakwuru onyeisi ha n’ụlọ ọrụ ha ka o mee ka m kweta na okpukpe niile enweghị isi na ọdụ. N’ụlọ anyị, mama m kpọrọ ọtụtụ ndị ikwu anyị na telefon, jiri olu ákwá na-arịọ ha ka ha nyere ya aka. Ihe ahụ were m ezigbo iwe. Ma, ọ na-abụ, m gaa ọmụmụ ihe, ndị okenye agwa m na mgbe ọ bụla mama m na-agwa ndị ọzọ banyere okwu mụ na ya, ọ bụ àmà ka ọ na-agbara ha.

Nsogbu ọzọ bụ na mama m na papa m chọrọ ka m gaa mahadum ka m nwee ike inweta ezigbo ọrụ. Iwe ekweghị anyị wetuo obi kwurịta ya. N’ihi ya, m deere ha akwụkwọ ozi ugboro ugboro, gwa ha ihe ndị m kpebiri ime. Papa m ji iwe baara m mba, sị: “Ọ bụrụ na i chere na ị ga-enwetali ọrụ, nweta ya echi, ma ọ́ bụghị ya, ị ga-akwapụ n’ụlọ a.” M gwara Jehova banyere ya n’ekpere. Mgbe m nọ n’ozi ọma n’echi ya, ụmụnna nwaanyị abụọ gwara m ka m bịa kụziwere ụmụ ha ihe, ka ha kwụwa m ụgwọ. Ihe a merenụ adịghị papa m mma n’obi, ya akwụsị ịtụpụrụ m ọnụ, malitekwa ime ka ọ naghị ahụ m. Mama m kwuru na ọ ka mma ka m bụrụ onye omekome kama m ga-abụ Onyeàmà Jehova.

Jehova nyeere m aka ịgbanwe otú m si eche echiche nakwa ịmata ihe m kwesịrị ime

Mgbe ụfọdụ, m nọ na-eche ma Jehova ọ̀ chọrọ ka m na-arụ papa m na mama m ụka otú a. Ma, mgbe m kpekwuru ekpere, tụgharịakwa uche n’ihe Baịbụl kwuru banyere ịhụnanya Jehova, m malitere ile mmegide a na-emegide m anya otú kwesịrị ekwesị. M ghọtakwara na ihe mere papa m na mama m ji na-emegide m bụ na ha na-echere m echiche ọma. Jehova nyeere m aka ịgbanwe otú m si eche echiche nakwa ịmata ihe m kwesịrị ime. Ije ozi ọma nyekwaara m aka. Ka m na-ejekwu ozi ọma, otú ahụ ka ọ na-atọkwu m ụtọ. N’eziokwu, m kpebiri na m ga-abụ ọsụ ụzọ.

MGBE M MALITERE ỊSỤ ỤZỌ

Mgbe ụfọdụ ụmụnna nwaanyị nụrụ na m chọrọ ịbụ ọsụ ụzọ, ha gwara m ka m chere ruo mgbe obi jụụrụ papa m na mama m. M kpere ekpere ka Jehova nye m amamihe. M mere nchọnchọ, cheekwa banyere ihe mere m ji chọọ ịmalite ịsụ ụzọ, gwakwa ụmụnna ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ banyere ya. M kpebiri na m chọrọ ime ihe ga-adị Jehova mma. M ghọtakwara na ọ bụrụgodị na mụ echetụkwuo tupu mụ amalite ịsụ ụzọ, papa m na mama m ka nwere ike ịna-emegide m.

M malitere ịsụ ụzọ mgbe m nọ n’afọ nke ikpeazụ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Mgbe m sụrụ ụzọ obere oge, m kpebiri ịga jewe ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ma, mama m na papa m achọghị ka m sí n’ụlọ anyị kwapụ. N’ihi ya, m cheere ruo mgbe m dị afọ iri abụọ. M degaziiri alaka ụlọ ọrụ anyị akwụkwọ ozi, gwa ha na m chọrọ ịga jewe ozi n’ebe ndịda Japan, bụ́ ebe dị́ nso n’ebe ndị ikwu anyị bi, ka obi nwee ike iru mama m ala.

Mgbe m gara ebe ahụ, obi dị m ụtọ ịhụ ka e mere ọtụtụ ndị m mụụrụ ihe baptizim. M malitere ịmụ asụsụ Bekee ka m nwee ike iji ya jekwuoro Jehova ozi. E nwere ụmụnna nwoke abụọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ọgbakọ ahụ. M hụrụ ma otú ha si anụ ọkụ n’obi ma otú ha si enyere ndị ọzọ aka. N’ihi ya, m kpebiri na m ga-abụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’oge ahụ, mama m rịara ezigbo ọrịa ugboro abụọ. M lachara ugboro abụọ ahụ gaa nyere ya aka. O juru ya anya, iwe na-ewe ya adajụwa.

ỌTỤTỤ ỤZỌ JEHOVA SI GỌZIE M

Mgbe afọ asaa gara, Nwanna Atsushi detaara m akwụkwọ ozi. Ọ bụ otu n’ime ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ahụ m kwuru banyere ha. Ọ gwara m na ya chọrọ ịlụ nwaanyị, kwuokwa na ya chọrọ ịma ma ọ̀ ga-adabara mụ na ya. Obi m adịtụbeghị n’ebe ọ nọ. Amaghịkwa m na obi ya dị n’ebe m nọ. Mgbe otu ọnwa gara, m zara ya na m chọrọ ka mụ na ya matakwuo nke ọma. Anyị mechara ghọta na obi anyị abụọ bụ otu n’ihe gbasara ijere Jehova ozi. Anyị chọrọ ịnọsi ike n’ozi oge niile, chọọkwa ije ozi n’ebe ọ bụla a ga-eziga anyị. Ka oge na-aga, mụ na ya lụrụ. Obi tọgburu m atọgbu na mama m na papa m na ọtụtụ ndị ikwu anyị bịara agbamakwụkwọ anyị.

Nepal

Ọ dịghị anya, a họpụta di m ka ọ bụrụ onye na-arụchitere onye nlekọta sekit ọrụ. Anyị bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile mgbe ahụ. Jehova sikwa n’ụzọ ndị ọzọ gọzie anyị n’oge na-adịghị anya. E mere anyị ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, mechaakwa mee di m onye nlekọta sekit. Mgbe anyị letachara ọgbakọ niile dị́ na sekit anyị, e si n’alaka ụlọ ọrụ anyị kpọọ anyị na telefon, jụọ anyị, sị, ‘Ùnu ga-achọ ka e ziga unu Nepal ka unu gaa rụwakwa ọrụ sekit n’ebe ahụ?’

Ozi anyị jere ná mba dị́ iche iche mere ka m mụta ọtụtụ ihe banyere Jehova

M malitere iche otú obi ga-adị mama m na papa m ma anyị gaa ebe dị́ anya otú ahụ. N’ihi ya, m kpọrọ ha na telefon. Papa m zara m, sị: “Ebe ahụ unu chọrọ ịga magburu onwe ya.” Naanị otu izu tupu mgbe ahụ, otu enyi ya nyere ya otu akwụkwọ kwuru gbasara Nepal. Kemgbe ahụ, ya ana-eche na ọ ga-adịkwanụ mma ma ọ gaa lee otú obodo ahụ dị.

Obi dị anyị ụtọ ije ozi na Nepal n’ihi na ndị obodo ahụ na-anabata ndị ọbịa. Ka oge na-aga, e tinyere ebe ụfọdụ dị́ na Bangladesh na sekit anyị. Bangladesh dị ezigbo iche n’agbanyeghị na ọ dị nso na Nepal. E nwere ọtụtụ ụzọ e si ekwusa ozi ọma n’ebe ahụ. Mgbe afọ ise gara, a gwara anyị gaghachi Japan, bụ́ ebe anyị na-arụ ọrụ sekit ugbu a.

Ozi anyị jere na Japan, Nepal, na Bangladesh mere ka m mụta ọtụtụ ihe banyere Jehova. Obodo nke ọ bụla nwere omenala na ihe ndị ọzọ e ji mara ya. Àgwà ndị mmadụ dịkwa iche iche. Ahụla m otú Jehova si elekọta ndị mmadụ n’otu n’otu, na-anabata ha, na-enyere ha aka, na-agọzikwa ha.

E nwere ọtụtụ ihe mere m ga-eji na-ekele Jehova. O kwere ka m mata ya ma na-arụrụ ya ọrụ. O mekwara ka m lụta ezigbo di. Chineke enyerela m aka ikpebi ihe ndị dị́ mma. Ugbu a, mụ na ya na ndị ezinụlọ anyị dị ná mma. Jehova emeekwala ka mụ na mama m bụrụ ezigbo enyi. Obi dị m ezigbo ụtọ na mụ na Chineke na mama m dịzi ná mma.

Ọrụ sekit na-eme anyị ezigbo obi ụtọ