Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Okpukpe Na-akụziri Ndị Òtù Ya Ịkpa Ezi Àgwà

Ezi Okpukpe Na-akụziri Ndị Òtù Ya Ịkpa Ezi Àgwà

Ezi Okpukpe Na-akụziri Ndị Òtù Ya Ịkpa Ezi Àgwà

EZI okpukpe na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eche ezi ihe ma na-akpazikwu àgwà. Ọ na-enyere anyị aka ná mbọ anyị na-agba ịghọ ezi mmadụ, na-enyekwara anyị aka ime ihe ọma niile anyị nwere ike ime. Olee otú anyị si mara na ezi okpukpe na-eme ụdị ihe ndị ahụ?

Lee ihe Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ bi n’obodo Kọrịnt, dị na Gris. Ihe e ji mara obodo oge ochie ahụ bụ ndụ rụrụ arụ. Pọl dọrọ ha aka ná ntị, sị: “N’ihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko, ndị nile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbịga mmanya oke, ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke n’alaeze Chineke.” Pọl kwuziri, sị: “Na mbụ, ụfọdụ n’ime unu na-ebi ndụ dị otú a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 6:9-11, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ị̀ hụrụ na ezi okpukpe nyeere ụfọdụ ndị na-akpabu àgwà ọjọọ aka ịghọ ndị ohu Chineke dị ọcha na ndị na-akpa àgwà ọma?

Ma, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Oge na-abịa mgbe ndị mmadụ na-agaghị anagide ezi nkuzi, ma site ná ntị ịkọọkọ ha nwere, ha ga-ekpokọtara onwe ha ndị nkuzi ga-akuziri ha ihe ga-amasị ha.”—2 Timoti 4:3, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

Olee otú okpukpe ndị ị maara si eme n’okwu a? Hà na-akpa àgwà ọma Baịbụl kwuru ka a na-akpa? Ka hà na-agwagbu ndụmọdụ doro anya dị n’Okwu Chineke, na-agwa ndị mmadụ naanị “ihe ga-amasị ha”?

Iji nyere gị aka ịmata ma okpukpe ọ̀ na-amị mkpụrụ ọma, lebagodị anya n’ajụjụ ndị a na-esonụ?

ISIOKWU: Alụmdi na nwunye.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu niile. Ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ: n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.”—Ndị Hibru 13:4, Bible Nsọ nke Union Version.

AJỤJỤ: Okpukpe a ọ̀ na-agwa ndị òtù ya ka nwoke na nwaanyị bikọ ọnụ gaa gbaa akwụkwọ otú iwu kwuru?

ISIOKWU: Ịgba alụkwaghịm.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: Mgbe a jụrụ Jizọs ma è nwere ihe ga-eme ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm, o kwuru, sị: “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghịm, na-abụghị n’ihi ịgba akwụna, lụrụ nwunye ọzọ, na-akwa iko.”—Matiu 19:9, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

AJỤJỤ: Okpukpe a ọ̀ na-akwanyere iwu a Jizọs nyere ùgwù, kwere ka ọ bụrụ naanị ịkwa iko ga-eme ka ndị òtù ya na-agba alụkwaghịm ma na-alụgharị di ma ọ bụ nwunye?

ISIOKWU: Mmekọahụ rụrụ arụ.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: “Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.”—1 Ndị Kọrịnt 6:18, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

“Ụmụnwaanyị ha ahapụla mmekọ n’ụzọ ziri ezi ma na-eme ya n’etiti onwe ha n’ụzọ ezighị ezi. Otu aka ahụ, ndị nwoke ha hapụrụ mmekọ dịịrị nwoke na nwaanyị bidozie ire ọkụ n’agụụ nke na-agụ ha n’ahụ ndị nwoke ibe ha. Ụmụnwoke na ndị nwoke ibe ha na-eme omume na-eweta ihere. N’ihi nke a, ha na-anatakwa ahụhụ kwesịrị ha maka njehie ha.”—Ndị Rom 1:26, 27, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

AJỤJỤ: Okpukpe a ọ̀ na-akụzi na nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ bụ mmehie? Ọ̀ na-akụzikwa na nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ bụ mmehie?

ISIOKWU: Ịhụ na ndị òtù ya na-eme ihe Baịbụl kwuru.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI: “Ka unu na onye ọ bụla nke a na-akpọ ya aha na ọ bụ nwanna ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye na-akwa iko, ma ọ bụ onye anyaukwu, ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị, ma ọ bụ onye nkwutọ, ma ọ bụ onye na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe; ka unu na onye dị otú a ghara ọbụna irikọ ihe.” (1 Ndị Kọrịnt 5:11, Bible Nsọ nke Union Version) Olee ihe e kwesịrị ime ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst na-eme mmehie ma jụ ichegharị? Okwu Chineke kwuru, sị: “Sitenụ n’etiti unu wepụ nwoke a.”—1 Ndị Kọrịnt 5:13, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

AJỤJỤ: Okpukpe a ọ̀ na-achụpụ onye òtù ya ọ bụla na-emebi iwu Baịbụl ma jụ ichegharị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 6]

Olee okpukpe a maara na-akpa àgwà ọma Baịbụl kwuru ka a na-akpa?