Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Echiche Ụgha nke 1: Mkpụrụ Obi Anaghị Anwụ Anwụ

Echiche Ụgha nke 1: Mkpụrụ Obi Anaghị Anwụ Anwụ

Echiche Ụgha nke 1: Mkpụrụ Obi Anaghị Anwụ Anwụ

Olee ebe echiche ụgha a si? “Ndị ọkà mmụta oge ochie bụ́ Ndị Kraịst nabatara ozizi mkpụrụ obi anwụghị anwụ nke ndị Gris na-ezi ma were mkpụrụ obi dị ka ihe Chineke kere ma tinye n’ahụ́ mmadụ mgbe a tụụrụ ime ya.”—The New Encyclopædia Britannica (1988), Nke 11, peeji nke 25.

Gịnị ka Baịbụl kwuru? “Mkpụrụ obi ọbụla mehierenụ ga-anwụ.”—Ezikiel 18:4, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

Baịbụl kwuru banyere otú e si kee mmadụ mbụ bụ́ mkpụrụ obi, sị: “Jehova bụ́ Chineke wee jiri ájá si n’ala kpụọ mmadụ ma kunye ume ndụ n’oghere imi ya, mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi [Hibru, neʹphesh] dị ndụ.”—Jenesis 2:7.

Okwu Hibru bụ́ neʹphesh, nke a sụgharịrị “mkpụrụ obi,” pụtara ‘ihe e kere eke na-eku ume.’ Mgbe Chineke kere nwoke mbụ, bụ́ Adam, O tinyeghị mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ n’ime ya, kama o tinyere ike ndụ nke iku ume na-eme ka ọ na-arụ ọrụ. Ya mere, na Baịbụl, ihe “mkpụrụ obi” pụtara bụ ihe dị ndụ, n’enweghị ihe a gụpụrụ n’ahụ́ ya. Ọ bụrụ na ike ndụ ahụ Chineke tinyere n’ime mmadụ ná mmalite adịkwaghị, mkpụrụ obi na-anwụ.—Jenesis 3:19; Ezikiel 18:20.

Ozizi mkpụrụ obi anwụghị anwụ akpatala ajụjụ ndị a: Olee ebe mkpụrụ obi na-aga mgbe mmadụ nwụrụ? Olee ihe na-eme mkpụrụ obi ndị ajọ omume? Mgbe Ndị Kraịst elu ọnụ nabatara echiche ụgha nke mkpụrụ obi anwụghị anwụ, o mere ka ha nabata echiche ụgha ọzọ, nke bụ́ ozizi ọkụ ala mmụọ.

Jiri amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ibe ha: Ekliziastis 3:19; Matiu 10:28; Ọrụ 3:23

NKE BỤ́ EZIOKWU:

Onye nwụrụ anwụ adịkwaghị ndụ