Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Asaa Ga-enyere Gị Aka Irite Uru n’Ịgụ Baịbụl

Ihe Asaa Ga-enyere Gị Aka Irite Uru n’Ịgụ Baịbụl

Ihe Asaa Ga-enyere Gị Aka Irite Uru n’Ịgụ Baịbụl

“Ọ bụghị naanị na Baịbụl bụ akwụkwọ kacha gaa ahịa n’ụwa, ọ bụ akwụkwọ kacha aga ahịa kwa afọ.”—MAGAZIN TIME.

“M na-agụ Baịbụl mgbe ụfọdụ, ma ịgụ ya na-agwụ m ezigbo ike.” —KEITH, ONYE EGWÚ A MA AMA SI INGLAND.

Ọ BỤ ihe ijuanya na ọtụtụ ndị nwere Baịbụl, ma o yighị ka ịgụ ya ọ̀ na-abachara ha uru. Ndị ọzọkwanụ ji ihe ha na-agụta na Baịbụl kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị aha ya bụ Nancy kọrọ, sị: “Kemgbe m malitere ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche na ya n’isi ụtụtụ ọ bụla, m na-adị njikere maka nsogbu ọ bụla ụbọchị ga-eweta. Ime nke a enyela aka belata obi ịda mbà m na-enwe site n’oge ruo n’oge karịa ihe ọ bụla ọzọ m merela banyere ya kemgbe iri afọ atọ na ise gara aga.”

Ya bụrụgodị na ị gụtụbeghị Baịbụl, ọ̀ masịrị gị ịnụ na o nyerela ụfọdụ ndị aka? Ọ bụrụ na ị gụwalarị Baịbụl, ị̀ ga-achọ iritekwu uru n’ịgụ ya? Ya bụrụ otú ahụ, gbalịa ime ihe asaa a kọwara n’isiokwu a.

NKE 1 Buru ezigbo ihe n’obi na-agụ ya

▪ I nwere ike ịgụ Baịbụl dị ka akwụkwọ na-atọ ụtọ ma ọ bụ n’ihi na i chere na ọ bụ ọrụ dịịrị gị ma ọ bụ na o nwere ike iduzi gị n’ụwa a jupụtara ná nsogbu. Ma, ọ ga-akacha abara gị uru ma ọ bụrụ na nzube gị bụ ịmụta eziokwu banyere Chineke. E wezụga nke ahụ, ị ga-erite ọtụtụ uru ma ọ bụrụ na nzube gị bụ ịhụ otú ihe Baịbụl kwuru nwere ike isi metụta ndụ gị.

Akwụkwọ Nsọ gosiri mkpa ọ dị ibu ezi ihe n’obi na-agụ ya site n’iji Baịbụl tụnyere enyo, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla bụ onye na-anụ okwu Chineke, ma ọ bụghị onye na-eme ya, onye a dị ka onye na-ekiri ihu ya n’enyo. N’ihi na ọ na-ekiri onwe ya, ọ na-apụkwa ma chefuo ụdị mmadụ ọ bụ ozugbo. Ma onye na-enyocha iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe, onye nọgidekwara n’ime ya, ga-enwe obi ụtọ n’ime ya eme, n’ihi na ọ bụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ, kama ọ bụ onye na-arụ ọrụ ahụ.”—Jems 1:23-25.

Onye ahụ e kwuru banyere ya n’ihe atụ a lere ihu ya n’enyo ma ghara imezi ọdịdị ya. Ikekwe, naanị ihe o mere bụ ile onwe ya anya elu elu, ma ọ bụ ya abụrụ na o nweghị mmasị imezi ọdịdị ya. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị na-agụ Baịbụl naanị mgbe ọ masịrị anyị ma ọ bụ ghara ime ihe anyị gụrụ eme, ọ gaghị abachara anyị uru. Ma, anyị ga-enweli ezi obi ụtọ ma ọ bụrụ na ihe anyị bu n’obi na-agụ Baịbụl bụ ịghọ “onye na-eme ya,” kwe ka echiche Chineke na-eduzi echiche na omume anyị.

NKE 2 Jiri nsụgharị ziri ezi na-agụ ya

▪ Ikekwe, e nwere nsụgharị Baịbụl dị iche iche i nwere ike ịgụ n’asụsụ gị. Ọ bụ ezie na ị ga-eriteli uru ná nsụgharị ọ bụla nke Okwu Chineke, e ji okwu ochie na okwu ndị gụrụ oké akwụkwọ, bụ́ ndị na-esi ike nghọta, dee ụfọdụ nsụgharị. (Ọrụ 4:13) Ụfọdụ nsụgharị Baịbụl na-agbanwedị eziokwu dị na Baịbụl n’ihi iso omenala. Dị ka ihe atụ, dị ka anyị kwuru n’isiokwu ndị mbụ na magazin a, ụfọdụ ejirila utu aha ndị dị ka “Chineke” ma ọ bụ “Onyenwe Anyị” dochie aha Chineke, bụ́ Jehova. N’ihi ya, mgbe ị na-ahọrọ nsụgharị ị ga-agụ, chọọ nke sụgharịrị Baịbụl otú ọ ga-adị mfe nghọta nke ga-eme ka ịgụ ya na-atọ gị ụtọ.

Ọtụtụ nde ndị na-agụ Baịbụl gburugburu ụwa achọpụtala na Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ dị nnọọ otú ahụ. * Tụlee ihe mere otu agadi nwoke na Bọlgeria. Ọ gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, e nye ya otu Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. O mechara kwuo, sị, “Agụọla m Baịbụl ọtụtụ afọ, ma agụtụbeghị m nsụgharị dị mfe nghọta na nke na-eru n’obi karịa ya.”

NKE 3 Kpee ekpere

▪ I nwere ike ịghọtakwu Baịbụl site n’ịrịọ Onye chepụtara ya ka o nyere gị aka, dị ka otu ọbụ abụ mere, bụ́ onye kwuru, sị: “Meghee anya m, ka m hụ ihe dị ebube ndị dị n’iwu gị.” (Abụ Ọma 119:18) Kpegara Chineke ekpere mgbe ọ bụla ị chọrọ ịgụ Akwụkwọ Nsọ, rịọ ya ka o nyere gị aka ịghọta Okwu ya. I nwekwara ike ikele ya maka Baịbụl, n’ihi na anyị enweghị ike ịmata Chineke ma e wezụga ya.—Abụ Ọma 119:62.

Chineke ọ̀ na-aza ekpere dị otú ahụ e kpegaara ya maka enyemaka? Ka anyị tụlee ihe mere ụmụ agbọghọ abụọ dị afọ iri na ụma nne ji na Yurugụaị. Ihe Baịbụl kwuru na Daniel 2:44 gbagwojuru ha anya, ha ekpeekwa ekpere ka Chineke zitere ha onye ga-enyere ha aka ịghọta ya. Ka ụmụ agbọghọ ahụ ka ji Baịbụl ha sapere asape n’aka, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ ha, gụọ nnọọ otu amaokwu ahụ ụmụ agbọghọ ahụ kpere ekpere banyere ya, kọwaakwara ha na ọ na-ekwu na Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ. * Ụmụnne abụọ ahụ dị afọ iri na ụma kwenyesiri ike na Chineke azala ha ekpere ha kpegaara ya maka enyemaka.

NKE 4 Na-agụ ya kwa ụbọchị

▪ Otu onye na-ebi akwụkwọ kwuru na “imeriime ndị mmadụ zụwara Baịbụl” mgbe ahụ ndị na-eyi ọha egwu wakposịrị Amerịka na Septemba 11, 2001. Ọtụtụ na-agụ Okwu Chineke naanị mgbe ha nọ ná nsogbu. Ma Baịbụl na-agba anyị ume ịgụ ya kwa ụbọchị, n’ihi na o kwuru, sị: “Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, ị ga na-agụkwa ihe dị na ya n’olu dị ala ehihie na abalị, ka i wee lezie anya mee ihe niile e dere na ya; n’ihi na mgbe ahụ, ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma, mgbe ahụkwa, ị ga-eji amamihe mee ihe.”—Jọshụa 1:8.

E nwere ike iji uru ịgụ Baịbụl mgbe niile bara tụnyere nwoke nwere ọrịa nkụchi obi ma kpebie iri nri ndị ka edozi ahụ́. Nke a ọ̀ ga-enyere ya aka ma ọ bụrụ na ọ na-eri ụdị nri ahụ naanị mgbe obi gbuwere ya ezigbo mgbu? Ee e. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ka ụdị nri ahụ nyere ya ezigbo aka, ọ ghaghị iri ya mgbe niile. N’otu aka ahụ, ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị ga-enyere gị aka ‘ime ka ụzọ gị gaa nke ọma.’

NKE 5 Na-agbanwe otú i si agụ ya

▪ O nwere ike ịdị mma ịgụ Baịbụl malite na Jenesis ruo Mkpughe, ma, isi n’ụzọ ndị ọzọ agụ ya nwere ike ịtọ gị ụtọ. Tụlee aro ole na ole ndị a.

Gụọ banyere otu onye. Gụọ isiakwụkwọ ma ọ bụ akwụkwọ Baịbụl niile kwuru banyere otu onye fere Chineke, dị ka ndị a:

Josef: Jenesis 37-50.

Rut: Rut 1-3.

Jizọs: Matiu 1-28; Mak 1-16; Luk 1-24; Jọn 1-21. *

Gụọ banyere otu isiokwu. Gụọ amaokwu ndị metụtara ya. Dị ka ihe atụ, mee nnyocha banyere ekpere, gụzie ndụmọdụ Baịbụl nyere banyere ekpere nakwa ụfọdụ n’ime ọtụtụ ekpere ndị e dere na Baịbụl. *

Na-agụpụta ya agụpụta. Ị ga-erite uru dị ukwuu ma ọ bụrụ na ị na-agụpụta Baịbụl agụpụta. (Mkpughe 1:3) Ezinụlọ unu dum nwedịrị ike ịgụpụta Baịbụl agụpụta, otu onye gụọ otu paragraf, onye nke ọzọ agụọ nke na-eso ya ma ọ bụkwanụ onye nke ọ bụla ana-agụ ihe otu onye kwuru. Ọ na-atọ ụfọdụ ndị ụtọ igere Baịbụl na teepụ. Otu nwaanyị kwuru, sị: “O siiri m ike ịmalite ịgụ Baịbụl, n’ihi ya, amalitere m igere Baịbụl na teepụ. Achọpụtala m ugbu a na Baịbụl na-atọ ụtọ karịa akwụkwọ ọgụgụ dị ụtọ.”

NKE 6 Tụgharịa uche

▪ Ndụ gbalụ gbalụ anyị na-ebi na ọtụtụ ihe ndọpụ uche e nwere taa anaghị ekwe mmadụ ịtụgharị uche. Ma, dị nnọọ ka nri anyị riri na-aghaghị ịgbari agbari iji dozie anyị ahụ́, anyị aghaghị ịtụgharị uche n’ihe anyị gụrụ na Baịbụl iji rite uru na ya. Anyị na-eme nke a site n’ịtụleghachi ihe ndị anyị gụrụ n’uche anyị na ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee ihe m mụtara banyere Jehova Chineke? Olee otú ihe a si metụta m? Olee otú m nwere ike isi jiri ya nyere ndị ọzọ aka?’

Ụdị echiche ahụ na-eme ka ihe Baịbụl kwuru na-eru anyị n’obi ma mee ka anyị nwetakwuo ọṅụ n’ịgụ Okwu Chineke. Abụ Ọma 119:97 kwuru, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.” Ọbụ abụ ahụ tụgharịrị uche n’Akwụkwọ Nsọ ogologo ụbọchị dum. Ime otú ahụ nyeere ya aka ịhụ ihe ndị ọ mụtara n’anya.

NKE 7 Nweta enyemaka iji ghọta ya

▪ Chineke anaghị atụ anya na anyị ga-aghọta Okwu ya nke ọma n’onwe anyị. Baịbụl kwudịrị na ihe ụfọdụ dị n’ime ya “siri ike nghọta.” (2 Pita 3:16) Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kọrọ banyere otu onye Itiopia nọ n’ọkwá dị elu nke na-aghọtaghị ebe ọ na-agụ na Baịbụl. Chineke ziteere ya otu onye ozi Ya inyere ya aka, nke mere na nwoke Itiopia ahụ “nọgidere na-agara onwe ya na-aṅụrị ọṅụ.”—Ọrụ 8:26-39.

I nwekwara ike iritekwu uru n’ọgụgụ Baịbụl site n’ịrịọ ka e nyere gị aka ịghọta ihe ị na-agụ. Kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ebe i bi, ma ọ bụ jiri adres dị na peeji nke 4 nke magazin a detara anyị akwụkwọ ka e duziwere gị ọmụmụ Baịbụl n’efu n’ụlọ gị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Ndịàmà Jehova ebipụtala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ zuru ezu ma ọ bụ nke na-ezughị ezu n’asụsụ iri asatọ na atọ, ọ dịkwa n’asụsụ iri na asaa na www.watchtower.org.

^ par. 15 Iji matakwuo banyere Alaeze Chineke na ihe ọ ga-eme, gụọ isi 8 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 24 Ọ bụrụ na ị malitere ịgụ Baịbụl ọhụrụ, burugodị ụzọ gụọ akwụkwọ Mak, bụ́ nke kọrọ banyere ozi Jizọs ná nkenke.

^ par. 25 Akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? enyerela ọtụtụ ndị aka ịmụ Baịbụl n’isiokwu n’isiokwu. Dị ka ihe atụ, isi nke 17 tụlere ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ekpere.