Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nsogbu Ndị Na-eme Ka E nwee Olileanya

Nsogbu Ndị Na-eme Ka E nwee Olileanya

Nsogbu Ndị Na-eme Ka E nwee Olileanya

“N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.”—2 TIMOTI 3:1.

Ị̀ NỤTỤLA ma ọ bụkwanụ hụ ebe otu n’ime ihe ndị a na-agbawa obi mere?

● Ọrịa ọjọọ gburu ọtụtụ mmadụ.

● Ụkọ nri lara ndụ ọtụtụ narị mmadụ n’iyi.

● Ala ọma jijiji gburu ọtụtụ puku mmadụ ma mee ka ọtụtụ ndị ọzọ ghara inwe ebe ha bi.

Na peeji ndị na-esonụ, ị ga-ahụ ihe ụfọdụ ga-eme ka i chebara ihe ndị ahụ na-eme n’ụwa echiche. Ị ga-ahụkwa na Baịbụl buru amụma na ihe ndị dị otú ahụ ga-eme n’oge a kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’ *

Ma, ihe mere e ji dee isiokwu ndị a abụghị ime ka i kweta na ụwa jupụtara ná nsogbu. O nwere ike ịbụ na ị na-enwe ụfọdụ n’ime nsogbu ndị a. Ihe mere e ji dee ha bụ ka ha mee ka i nwee olileanya. Ha ga-eme ka ị ghọta na amụma isii ndị a na-emezunụ na-egosi na ‘oge ikpeazụ’ ahụ agwụwala. N’isiokwu ndị a, a ga-atụle ihe mmadụ ụfọdụ na-ekwukarị bụ́ ndị na-ekweghị na ihe ndị a na-eme n’ụwa taa bụ mmezu amụma, tụleekwa ezi ihe mere anyị ga-eji kwere na ihe ga-adị mma n’oge na-adịghị anya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma ihe mere Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ ndị a na-eme, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?” nke dị na peeji nke 16 na nke 17 na magazin a.