Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nrụrụ Aka Ga-akwụsị!

Nrụrụ Aka Ga-akwụsị!

Nrụrụ Aka Ga-akwụsị!

“Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, debekwa ụzọ ya . . . Mgbe a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ị ga-ahụ ya.”​—ABỤ ỌMA 37:34.

ỌTỤTỤ ndị chere na o nweghị ihe ga-eme ka nrụrụ aka kwụsị n’ụwa. Ì so ná ndị na-eche otú ahụ? Onye ọ bụla chere otú ahụ emeghị ihe ọjọọ. A sị ka e kwuwe, o nwebeghị ụdị ọchịchị a na-enwebeghị n’ụwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụ mmadụ enwebeghị ike ịkwụsị nrụrụ aka kpamkpam. Ànyị kwesịrị ịtụwa anya na oge na-abịa mgbe onye ọ bụla ga na-akwụwa aka ọtọ?

Ee, Baịbụl kwuru otú ahụ. Ọ gwara anyị na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka nrụrụ aka kwụsị n’ụwa. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ ga-eji Alaeze ya, bụ́ ọchịchị ya nke ga-esi n’eluigwe na-achị, mee ka ọ kwụsị. Alaeze a ga-agbanwe ụwa kpamkpam. Ọ bụ Alaeze a ka Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka ọ bịa. N’ekpere ahụ Jizọs kụziiri ha, bụ́ nke a na-akpọ Ekpere Onyenwe Anyị ma ọ bụ ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, o kwuru, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa.”—Matiu 6:10.

O nwere otu amụma Baịbụl buru banyere Eze ga-achị Alaeze ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst. Ọ sịrị: “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka, nakwa onye nọ n’ahụhụ na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere, ọ ga-azọpụtakwa mkpụrụ obi ndị ogbenye. Ọ ga-anapụta mkpụrụ obi ha ná mmegbu nakwa n’ihe ike.” (Abụ Ọma 72:12-14) Ị̀ hụrụ na Jizọs na-emetere ndị a na-emegbu emegbu ebere nakwa na ọ ga-eme ka mmegbu ahụ a na-emegbu ha kwụsị? Ihe a Baịbụl kwuru kwesịrị ịkasi anyị obi.

Mgbe Eze ahụ dị ike nke na-emetere ụmụ mmadụ ebere ga-amalite ịchị ụwa, ọ ga-eme ka nrụrụ aka kwụsị. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ ga-ewepụ ụzọ ihe atọ ahụ mere ụmụ mmadụ ji etinye aka ná nrụrụ aka.

Mmehie

Ka ọ dị ugbu a, anyị niile na mmehie ka na-agba mgba. Mmehie ka na-emekwa ka anyị na-achọ naanị ọdịmma nke onwe anyị. (Ndị Rom 7:21-23) Ma, a ka nwere ndị ezi omume ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma. Ebe ọ bụ na ha nwere okwukwe n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ, a ga-agbaghara ha mmehie ha. * (1 Jọn 1:7, 9) Ihe ọma kachanụ Chineke meere ụmụ mmadụ, nke gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya, ga-abara ndị dị otú ahụ uru, dị ka e kwuru na Jọn 3:16. Ebe ahụ kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”

O nwere ihe dị ịtụnanya Chineke ga-emere ndị ezi omume. N’ụwa ọhụrụ na-abịanụ, ọ ga-ewepụcha mmehie n’ahụ́ ụmụ mmadụ ma jiri nke nta nke nta mee ka ha zuo okè. (Aịzaya 26:9; 2 Pita 3:13) N’oge ahụ, mmehie agakwaghị eme ka mmadụ ọ bụla mee ihe ọjọọ. Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụmụ mmadụ, ndị ezi omume ‘ga-enwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure.’—Ndị Rom 8:20-22.

Ụwa Ọjọọ Anyị Bi n’Ime Ya

Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị taa na-ama ụma emegbu ibe ha. Ha na-erigbu ndị ogbenye, na-emekwa ka ndị ọzọ na-etinye aka n’ihe ọjọọ. Baịbụl gwara ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ, sị: “Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya, ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya.” Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na ha echegharịa, Chineke ‘ga-agbaghara ha mmehie ha n’ụzọ dị ukwuu.’—Aịzaya 55:7.

Ma, Chineke ga-ebibi ndị niile jụwapụrụ isi na ha agaghị echegharị. Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo ihe a e kwuru na Baịbụl: “Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, debekwa ụzọ ya . . . Mgbe a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ị ga-ahụ ya.” * (Abụ Ọma 37:34) Mgbe e bibichara ndị ajọ omume na-achọghị ichegharị, ndị ezi omume ga-enwere onwe ha n’ihi na o nwekwaghị ndị ga na-emegbu ha.

Setan Bụ́ Ekwensu

Onye ajọ omume kachanụ nke na-enweghị nchegharị bụ Setan bụ́ Ekwensu. Ma obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova ga-atụ Setan mkpọrọ n’oge na-adịghị anya ma mee ka ọ kwụsị iduhie ụmụ mmadụ. E mechaa, ọ ga-ebibi Setan kpamkpam. Mgbe Chineke bibichara Setan, ọ gakwaghị anọ na-eme ka ndị mmadụ na-etinye aka n’ihe ọjọọ.

N’eziokwu, Baịbụl kwuru na Chineke ga-ewepụ ihe niile na-akpata nrụrụ aka. Ma ụfọdụ ndị nwere ike iche na ihe a Baịbụl kwuru bụ akụkọ ifo. I nwere ike ikwu n’obi gị, sị, ‘Chineke ọ̀ ga-emelikwanụ ihe niile a Baịbụl kwuru? Ya bụrụ na ọ ga-emeli ha, gịnị mekwaranụ na o mebeghị ha kemgbe?’ Ihe ndị a bụ ezigbo ajụjụ, Baịbụl zakwara ha nke ọma. * Ọ ga-adị mma ka ị gụọ ihe Baịbụl kwuru banyere ihe ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya, bụ́ mgbe nrụrụ aka na-agakwaghị adị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú o si bụrụ na àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ ga-agbapụta ụmụ mmadụ, gụọ isi nke 5 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

^ Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe ndị e kwuru n’isiokwu a, gụọ isi nke 3, nke 8, na nke 11 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?