Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Ò Kwesịrị Ịjụ Chineke Ajụjụ?

Mmadụ Ò Kwesịrị Ịjụ Chineke Ajụjụ?

Mmadụ Ò Kwesịrị Ịjụ Chineke Ajụjụ?

ỤFỌDỤ ndị na-ekwu na ọ dịghị mma ịjụ Chineke ajụjụ. Ha nwere ike iche na ọ bụrụ na mmadụ ajụọ Chineke ihe mere o ji kwe ka ihe ụfọdụ mee ma ọ bụkwanụ ka ihe ụfọdụ ghara ime, na onye ahụ na-akparị Chineke. Ọ̀ bụ ihe gịnwa chere?

Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike iju gị anya ịnụ na ọtụtụ ndị ezi omume jụrụ Chineke ajụjụ. Legodị ụfọdụ ajụjụ ha jụrụ ya:

Onye ezi omume bụ́ Job jụrụ, sị: “Gịnị mere i ji ewepụ ihu gị ma na-ewere m dị ka onye iro gị?”​Job 13:24.

Habakọk onye amụma jụrụ, sị: “Gịnị mere i ji na-ele ndị aghụghọ n’anya n’anya, na-agbachikwa nkịtị mgbe onye ajọ omume na-eloda onye na-eme ezi omume karịa ya?”​Habakọk 1:13.

Jizọs Kraịst jụrụ, sị: “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?”​Matiu 27:46.

Ọ bụrụ na ị gụọ amaokwu ndị bu amaokwu ndị a ụzọ nakwa amaokwu ndị sochiri ha, ị ga-ahụ na o nweghị ihe gosiri na Jehova * Chineke were iwe mgbe a jụrụ ya ajụjụ ndị ahụ. N’eziokwu, o kwesịghị iju anyị anya na ajụjụ ndị ahụ eweghị ya iwe. Dị ka ihe atụ, Chineke anaghị ewere ya na anyị na-akparị ya ma anyị rịọ ya ka o gbooro anyị mkpa anyị. Ọ na-eji obi ụtọ egboro anyị mkpa anyị. (Matiu 6:11, 33) Ọ na-akụzikwara anyị ihe ndị ga-eme ka obi ruo anyị ala. (Ndị Filipaị 4:6, 7) N’eziokwu, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu.” (Matiu 7:7) Ihe Jizọs na-ekwu ebe a bụ ka anyị rịọ Chineke ka o gbooro anyị mkpa anyị nakwa ka o mee ka anyị mata azịza nke ajụjụ ndị dị anyị mkpa. Ihe ndị o kwuru n’amaokwu ndị ọzọ na Matiu isi nke 7 gosiri na nke a bụ eziokwu.

Ọ bụrụ na a gwa gị ka ị jụọ Chineke ajụjụ, olee nke ị ga-achọ ịjụ ya n’ime ajụjụ ndị a?

● Gịnị mere i ji kee m?

● Olee ihe ga-eme m ma m nwụọ?

● Gịnị mere i ji hapụ m ka m na-ata ahụhụ?

Ebe ọ bụ na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke,” ị ga-ahụ otú Chineke si zaa ajụjụ ndị ahụ n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. (2 Timoti 3:16) Ka anyị leba anya n’ihe mere ụfọdụ ndị ji jụọ ajụjụ ndị ahụ nakwa otú Baịbụl si zaa ha.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.