Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Icheta Jizọs Kraịst

Icheta Jizọs Kraịst

Icheta Jizọs Kraịst

“Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—LUK 22:19.

Ihe mere ụfọdụ ndị ji agba Krismas.

Ụfọdụ ndị na-ekwu na “ọ bụ Jizọs mere ha ji agba Krismas.” Ha na-agba Krismas ka ha cheta ọmụmụ Jizọs.

Gịnị mere o ji esiri ọtụtụ ndị ike icheta Jizọs n’oge Krismas?

Ọtụtụ egwú a na-agụ n’oge Krismas na ihe ndị a na-eme n’oge ahụ enweghị ihe gbasara ha na Jizọs Kraịst. Ọtụtụ nde mmadụ ndị na-agba Krismas enweghị okwukwe na Jizọs. Ụfọdụ n’ime ha ekwedịghị na o nwere onye bụ Jizọs Kraịst. Ọtụtụ ndị ahịa ji oge Krismas ere ngwá ahịa ha, ha ejighị ya echeta Jizọs.

Otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere gị aka.

“Nwa nke mmadụ bịara . . . ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Mak 10:45) O doro anya na ọ bụ n’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ ka o kwuru ihe e dere ná mbido isiokwu a nke dị na Luk 22:19, ọ bụghị n’ụbọchị a mụrụ ya. N’abalị ahụ, o gosiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-echeta ọnwụ ya. Ma, gịnị mere Jizọs ji chọọ ka ndị na-eso ụzọ ya na-echeta ọnwụ ya kama icheta ụbọchị a mụrụ ya? Ọ bụ maka na àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ, ya bụ, ọnwụ ahụ ọ nwụrụ, ga-eme ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi nweta ndụ ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) Ọ bụ nke a mere ndị na-eso ụzọ Jizọs ji echeta ọnwụ ya kwa afọ n’ụbọchị ahụ ọ nwụrụ. Ihe ha na-echeta abụghị mgbe Jizọs bụ nwa e ku n’aka, kama ha na-echeta na Jizọs Kraịst bụ “onye nzọpụta nke ụwa.”—Jọn 4:42.

“Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) Ọ bụrụ na ị chọrọ icheta Jizọs ma na-akwanyere ya ùgwù, i kwesịrị ịmụta àgwà ọma ndị Jizọs kpara. I kwesịkwara iche echiche banyere otú àgwà ọma ndị dị ka ọmịiko, ndidi, na obi ike si nyere Jizọs aka ime ihe ziri ezi. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịgbalị na-akpa àgwà otú ahụ o si kpaa.

“Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị na nke Kraịst ya, ọ ga-achịkwa dị ka eze ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Mkpughe 11:15) Mgbe ọ bụla i chetara Jizọs Kraịst, echefula ihe ọ na-eme ugbu a. Jizọs na-achị achị ugbu a n’eluigwe. Baịbụl kwuru banyere Jizọs, sị: “Ọ ga na-ekpe ndị ogbenye ikpe ezi omume, ọ ga na-enyekwa ịdọ aka ná ntị n’izi ezi n’ihi ndị dị umeala n’obi n’ụwa.” (Aịzaya 11:4) Nke a gosiri na Jizọs abụghị nwa ọhụrụ kama ọ bụ Onye ọchịchị na-akpa ike, n’ihi na nwa ọhụrụ agaghị akpali àgwà ọma ndị a.