Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A: È NWERE OKPUKPE NKE BỤ́ EZIGBO OKPUKPE?

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka I Leruo Okpukpe Gị Anya?

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka I Leruo Okpukpe Gị Anya?

Weregodị ya na ị na-arịa ajọ ọrịa, ya abụrụ na a ga-awarịrị gị ahụ́ tupu gị agbakee, ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ka ọ bụrụ dọkịta ịwa ahụ́ doro anya ga-awa gị ahụ́ ahụ ebe ọ bụ na ndụ gị dịzi ya n’aka? Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ịmata ma dọkịta ahụ ọ̀ makwa nke a na-akọ n’ịwa ahụ́, ị ga-agbalị chọpụta otú o sirila waa ndị ọzọ ahụ́.

E nwekwara ike ikwu na ndụ gị dịkwa n’aka okpukpe ị na-ekpe ma ọ bụ chọọchị ị na-aga n’ihi na ọ bụ okpukpe gị ma ọ bụ chọọchị gị so n’ihe ga-eme ka i nweta ndụ ebighị ebi ma ọ bụ ka ị ghara inweta ya. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị saa anya na mmiri leba anya n’okpukpe anyị na-ekpe.

Jizọs kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịchọpụta ma okpukpe anyị ọ̀ bụ ezigbo okpukpe. Ọ sịrị: “A na-amara osisi ọ bụla site ná mkpụrụ ya.” (Luk 6:44) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i leruo okpukpe gị anya, olee ụdị mkpụrụ ọ na-amị? Ihe na-aka adị ndị isi okpukpe gị ma ọ bụ chọọchị gị mkpa ọ̀ bụ ego? Ndị chọọchị unu hà na-eme ihe Baịbụl kwuru gbasara ịlụ agha na ịkpa àgwà ọma? Ajụjụ ọzọ anyị kwesịrị ịjụ bụ: È nwere okpukpe nke bụ́ ezigbo ya? Anyị chọrọ ka i leba anya n’isiokwu ndị na-esonụ.

“A na-amara osisi ọ bụla site ná mkpụrụ ya.”—Luk 6:44