Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Uru Otú Ihe Dị Iche Iche Na-acha Baara Gị?

Olee Uru Otú Ihe Dị Iche Iche Na-acha Baara Gị?

Mgbe ọ bụla i legharịrị anya, anya gị na ụbụrụ gị na-arụkọ ọrụ, mee ka ị ghọta ihe ị na-ahụ. Ị hụ mkpụrụ osisi, ị na-ekpebi ma ị̀ ga-ata ya. I lee anya n’ihu ígwé, i nwere ike kwuo na mmiri agaghị ezo taa. Ị na-ahụ mkpụrụ okwu ndị a ị na-agụ ugbu a ma ghọta ihe ha pụtara. N’eziokwu, ihe mere i ji ahụ ha ma ghọta ha bụ otú ha na-acha. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a?

Ọ bụ otú mkpụrụ osisi na-acha ga-eme ka ị mata ma ọ̀ chaala ma ọ bụ na ọ chabeghị, ma è kwesịrị iri ya eri ma ọ bụ na e kwesịghị. Otú ihu ígwé na-acha na-eme ka ị mara ma mmiri ọ̀ ga-ezo, ka anwụ ọ̀ ga-acha. Ihe mere i ji na-ahụ ihe a ị na-agụ nke ọma bụ na akwụkwọ a na-acha ọcha, mkpụrụ okwu ndị e dere na ya ana-eji oji. Ọ bụ ya mere na ha anaghị achachi gị anya. N’eziokwu, otú ihe dị iche iche na-acha na-eme ka ị ghọta ihe ndị ị na-ahụ, na-emekwa ka ha ruo gị n’obi.

OTÚ IHE ANYỊ HỤRỤ NA-ACHA NA-EME KA O RUO ANYỊ N’OBI

Ọ bụrụ na ị gaa n’ụlọ ahịa, ị ga-ahụ ụdị ngwá ahịa dị iche iche a kpọsajuru na ya, ma ndị nnukwu ma ndị obere. A ma ụma kpọsa ha otú ọ ga-abụ ị hụ ha, ha amasị gị. Ma ị̀ ma ma ọ bụ na ị maghị, ndị na-ere ngwá ahịa na-asa anya na mmiri kpọsa ihe dị iche iche ụcha ya na ibe ya dabara ka ha dọta mmasị ndị e bu n’obi mepụta ha. Ndị ha bu n’obi mepụta ha nwere ike ịbụ ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị, ụmụaka ma ọ bụ ndị toro eto. Ndị na-achọ ime ụlọ mma na ndị na-achọ ákwà mma nakwa ndị na-ese ihe makwaara na otú ihe mmadụ hụrụ na-acha nwere ike ime ka onye ahụ nwee mmasị n’ihe ahụ.

Ebe mmadụ nọ too na omenala obodo ya nwere ike ime ka ihe na-agbata ya n’obi ma ọ hụ ihe na-eji oji ma ọ bụ ihe na-acha otú ọzọ dị iche n’ihe ga-agbata onye ọzọ n’obi. Dị ka ihe atụ, n’Eshia, e nwere ndị weere ihe na-acha uhie uhie ka ihe na-egosi na ihe ọma emeela nakwa ihe na-egosi oge ọṅụ. Ma n’ebe ụfọdụ n’Afrịka, ihe na-acha uhie uhie na-egosi na ndị mmadụ na-eru uju. Ma mgbe ụfọdụ, ihe na-agbata ndị mmadụ n’obi ma ha hụ otú ihe ụfọdụ na-acha na-abụ otu n’agbanyeghị ebe ha si. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

IHE NA-ACHA ỌBARA ỌBARA na-achapụ achapụ n’anya. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ahụ ebe e gechiri ákwá na-acha ọbara ọbara, ihe na-agbatakarị ha n’obi bụ agha ma ọ bụ na e nwere nsogbu n’ebe ahụ. Ozugbo mmadụ hụrụ ụdị ihe a, obi na-amalite ịkụ ya kpum kpum, ya ekuwe ume ọkụ ọkụ. Nri dị ya n’ahụ́ na-amalitekwa ịgbari ngwa ngwa.

Na Baịbụl, okwu Hibru a sụgharịrị “ihe na-acha ọbara ọbara” si n’okwu Hibru pụtara “ọbara.” Mgbe Baịbụl na-ekwu banyere otu nwaanyị akwụna, ọ sịrị na o yi ákwà odo odo na ákwà uhie uhie, ya bụ, ọbara ọbara. Ọ sịkwara na nwaanyị a nọ n’elu “otu anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie” nakwa na o “jupụtara n’aha nke na-ekwulu Chineke.”—Mkpughe 17:1-6.

IHE NA-ACHA AKWỤKWỌ NDỤ AKWỤKWỌ NDỤ na-adị jụụ n’anya. Ebe ọ bụ na ọ na-eme ka ahụ́ ruo mmadụ ala, mmadụ hụ ya, ọ naghị eme ka nri dị ya n’ahụ́ gbariwe ngwa ngwa. Ọ bụrụ na mmadụ ahụ ebe e gechiri ákwà na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, ihe ọ na-egosikarị bụ udo. Ahụ́ na-eru anyị ala ma anyị nọrọ n’ubi ma ọ bụ mbara ala akwụkwọ ndụ juru. Akwụkwọ Jenesis kwuru na Chineke kere ahịhịa ndụ na akwụkwọ ndụ dị iche iche maka ụmụ mmadụ.—Jenesis 1:11, 12, 29, 30.

IHE NA-ACHA ỌCHA na-egbuke egbuke n’anya. Ihe na-agbatakarị ndị mmadụ n’obi ma ha hụ ihe na-acha ọcha bụ ìhè na ihe dị nsọ. Ihe na-acha ọcha  pụtakwara ihe dị mma na ihe na-arụghị arụ. Ọ bụ ihe ndị na-acha ọcha ka a kacha kpọọ aha na Baịbụl karịa ihe ndị na-acha otú ọ bụla ọzọ. Mgbe Chineke mere ka ndị ohu ya hụ ọhụụ, ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi ha hụrụ yi uwe ọcha. Nke a gosiri na ndị ahụ a hụrụ n’ọhụụ bụ ndị ezi omume na ndị na-efe naanị Chineke. (Jọn 20:12; Mkpughe 3:4; 7:9, 13, 14) Ịnyịnya ọcha na ndị na-agba ha, bụ́ ndị yi ákwà linin na-acha ọcha, pụtara agha ọma nke si n’aka Chineke. (Mkpughe 19:14) Ihe na-acha ọcha na-egosikwa na Chineke chọrọ ịgbaghara ndị mmadụ mmehie ha. Ọ bụ ya mere Chineke ji sị: “Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.”—Aịzaya 1:18.

OTÚ IHE NA-ACHA NA-EME KA ANYỊ GHARA ICHEFU YA

Baịbụl gwara anyị otú ihe dị iche iche o kwuru okwu ha na-acha. Nke a gosiri na Chineke ghọtara na ịhụ otú ihe na-acha baara anyị uru. Dị ka ihe atụ, Akwụkwọ Mkpughe kwuru ihe dị iche iche na-eme n’oge anyị, dị ka agha, ụnwụ, agụụ na ọrịa ndị na-egbu ndị mmadụ. Ọ kọọrọ anyị banyere ịnyịnya dị iche iche na ndị na-agba ha, gwakwa anyị otú ha niile na-acha ka anyị nwee ike ịna-echeta ha ngwa ngwa.

Ịnyịnya nke mbụ na-acha ezigbo ọcha. Ihe ọ pụtara bụ agha ọma Jizọs Kraịst na-alụ. Ịnyịnya nke abụọ na-acha uhie uhie. Nke a pụtara agha mba dị iche iche na-alụrịta. Ịnyịnya sochiri ya bụ ịnyịnya ojii. Ihe ọ pụtara bụ ụkọ nri. Ịnyịnya nke ikpeazụ e kwuru okwu ya bụ “ịnyịnya nke ahụ́ ya chanwụrụ achanwụ; onye nọ n’elu ya nwekwara aha bụ́ Ọnwụ.” (Mkpughe 6:1-8) Otú ịnyịnya nke ọ bụla na-acha na-eme ka anyị ghọta ihe ọ pụtara. Ọ dịịrị anyị mfe icheta otú ha niile na-acha nakwa ihe ha na-akụziri anyị gbasara oge anyị a.

E nwere ọtụtụ ebe Baịbụl ji otú ihe ndị ọ kọrọ akụkọ ha na-acha mee ka anyị ghọta ihe a na-ekwu. N’eziokwu, Onye kere ìhè na anya ụmụ mmadụ na-eji otú ihe dị iche iche na-acha eme ka anyị ghọta ihe ndị e dere na Baịbụl ma na-echeta ha. Otú ihe anyị na-ahụ na-acha na-eme ka anyị ghọta ihe ahụ nke ọma, ọ na-emekwa ka ihe anyị hụrụ ruo anyị n’obi. Ọ na-eme ka anyị ghara ichefu ihe ndị dị mkpa. N’eziokwu, ọ bụ Chineke mere ka ihe dị iche iche na-acha otú ha na-acha ka ndụ nwee ike ịna-atọ anyị ụtọ.