Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | MMADỤ ỊṄỤ SỊGA Ọ̀ DỊ CHINEKE MMA?

Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Ndị sịga na-egbu karịrị akarị.

  • O gburu otu narị nde mmadụ n’ime otu narị afọ gara aga.

  • Ọ na-egbu ihe dị ka nde mmadụ isii kwa afọ.

  • Ọ na-egbu otu onye n’ime tịnkọm tịnkọm isii ọ bụla.

O nweghịkwa ihe gosiri na ọ ga-akwụsị ịsụ ndị mmadụ akwụ.

Ndị ọkachamara ekwuola na ọ bụrụ na ndị mmadụ ejiri aka a ha ji na-aṅụ sịga, mgbe ọ na-erula afọ 2030, ndị sịga ga na-egbu kwa afọ ga-eru nde mmadụ asatọ. Ha kwukwara na mgbe ọ na-erula afọ 2100, ndị sịga ga-egbula ga-eru otu ijeri mmadụ.

Ọ bụghị naanị ndị na-aṅụ sịga ka sịga na-emenyụ anya. Ọ bụrụ na sịga egbuo mmadụ, obi na-agbawa ndị ezinụlọ ya, ego na-akọkwa ha. Ihe ọzọ bụ na ihe dị ka narị puku mmadụ isii na-anwụ kwa afọ maka na ha na-ekuru anwụrụ ọkụ sịga ndị ọzọ na-aṅụ. O nweghị onye nsogbu a na-agbasaghị n’ihi na ọrịa sịga na-akpatara ndị mmadụ so n’ihe mere ego ndị mmadụ na-akwụ n’ụlọ ọgwụ ji arị elu.

Nsogbu ịṅụ sịga na-akpatara ndị mmadụ adịghị ka ọrịa a na-amaghị otú e si agwọ ya. Onye ukwu na onye nta ma ihe a ga-eme ka sịga kwụsị ịkpa ndị mmadụ ezé. Otu dọkịta aha ya bụ Margaret Chan, bụ́ nnukwu onyeisi Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike, sịrị: “Nsogbu sịga na-akpatara ndị mmadụ si ndị mmadụ n’aka. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị na ụmụ amaala agbasie mbọ ike, ha nwere ike ịkwụsị nsogbu ahụ.”

Mbọ mba dị iche iche na-agba ka nsogbu sịga na-akpatara ndị mmadụ kwụsị enweghị atụ. N’ọnwa Ọgọst afọ 2012, ihe dị ka otu narị mba na iri asaa na ise kwekọrịtara na ha ga-agbalị ka ndị mmadụ kwụsịlata ịṅụ sịga. * Ma, e nwere ihe ndị mere ọ ka ji esiri ndị mmadụ ike ịkwụsị ịṅụ sịga. Kwa afọ, ụlọ ọrụ na-emepụta sịga na-emefu ọtụtụ ijeri dọla n’ịkpọsa ngwá ahịa ha ka ha nweta ndị ọhụrụ ga na-aṅụ sịga, karịchaa, ụmụ nwaanyị na ụmụ okoro na agbọghọ bi ná mba ndị ka na-emepe emepe. Ihe ọzọ bụ na ịṅụ sịga na-eri ndị mmadụ ahụ́. N’ihi ya, ndị ọ ka ga-egbu n’ime otu ijeri mmadụ o ririla ahụ́ ka buru ibu. Ọ bụrụ na ndị na-aṅụ sịga ugbu a akwụsịghị ya, ndị sịga ga-egbu n’ime afọ iri anọ na-abịa abịa ga-akarị akarị.

Ọ na-esiri ọtụtụ ndị chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga ike ịkwụsị ya n’ihi otú e si akpọsa ịṅụ sịga nakwa n’ihi na o riela ha ahụ́. Otu nwaanyị aha ya bụ Naoko chọpụtara na ịkwụsị ịṅụ sịga adịghị mfe. O bidoro ịṅụ sịga mgbe ọ ka na-eto eto n’ihi na ọ chọrọ ịdị ka ndị ọ na-ahụ na tiivi bụ́ ndị o weere ka ndị hụrụ ụzọ. N’agbanyeghị na ọ bụ ọrịa kansa akpa ume gburu nne ya na nna ya, ọ kwụsịghị ịṅụ sịga. N’oge ahụ, ọ na-azụ ụmụ ya nwaanyị abụọ. Naoko sịrị: “Ụjọ nọ na-atụ m na m nwere ike rịawa ọrịa kansa akpa ume. Ihe ọzọ nọ na-echu m ụra bụ na sịga m na-aṅụ nwekwara ike ịkpatara ụmụ m ọrịa. Ma, o kweghị m nkwụsị. M chere na agaghị m akwụsịli ya.”

Ma, Naoko mechara kwụsị ịṅụ sịga. Ihe nyeere ya aka ịkwụsị ya bụkwa ihe nyeerela ọtụtụ nde mmadụ aka ka ha ghara ịṅụ sịga. Gịnị bụ ihe ahụ? Biko, gụrụ gawa.

^ para. 11 Ihe ụfọdụ ha kwuru na ha ga-eme bụ ịgwa ndị mmadụ nsogbu ịṅụ sịga na-akpata, ibelata sịga ole ndị na-emepụta sịga na-emepụta, ịkwụsịlata otú ha si akpọsa ngwá ahịa ha, ibugo ụtụ ahịa ha na-atụ, na iwepụta ihe ndị chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga ga na-eme ka ha nwee ike ịkwụsị ya.