Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ò NWERE MMASỊ N’EBE Ị NỌ?

Chineke Nwere Ike Ịkasi Gị Obi

Chineke Nwere Ike Ịkasi Gị Obi

“Chineke, bụ́ onye na-akasi ndị e wedara n’ala obi, kasiri anyị obi.”—2 NDỊ KỌRỊNT 7:6.

“Ọkpara Chineke . . . hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.”—NDỊ GALESHIA 2:20

IHE MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE IKWETA: N’agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-achọ onye ga-akasi ha obi, ha chere na ọ bụrụ na ha arịọ Chineke ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka mgbe ha nọ ná nsogbu, na ọ pụtara na ha na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Raquel. Ọ sịrị: “Ọ na-abụ m lechaa mmadụ ole nọ n’ụwa nakwa nsogbu ndị ha nwere, nsogbu m na-adịzi m ntakịrị nke na obi anaghị ekwe m rịọ Chineke ka o nyere m aka.”

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ: E nwere ụzọ Chineke sirila gbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka ma na-akasi ha obi. Onye ọ bụla dị ndụ n’ụwa taa ketara mmehie. Ọ bụ mmehie ahụ mere na o nweghị ka mmadụ metachaa ihe Chineke chọrọ. Ma, Chineke “hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya [bụ́ Jizọs Kraịst] ka ọ bụrụ àjà ime udo maka mmehie anyị.” (1 Jọn 4:10) Ọ bụ àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ mere Chineke ji agbaghara anyị mmehie anyị, meekwa ka obi anyị ghara ịna-ama anyị ikpe. Ọ bụkwa ya mere anyị ji nwee olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke udo ga-adị na ya. * Ma, àjà ahụ ọ̀ bụ naanị maka mmadụ niile, ka Chineke ò jikwa ya egosi na ọ hụrụ gịnwa n’anya?

Ka anyị lebagodị anya n’ihe Pọl onyeozi kwuru. Otú àjà Jizọs chụrụ si metụ ya n’obi mere ka o dee, sị: “Ndụ nke m dị ugbu a n’anụ ahụ́, m dị ya site n’okwukwe nke m nwere n’ebe Ọkpara Chineke nọ, bụ́ onye hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.” (Ndị Galeshia 2:20) Jizọs nwụrụ tupu Pọl aghọọ Onye Kraịst. N’agbanyeghị ya, Pọl weere àjà ahụ ka onyinye Chineke nyere yanwa.

Àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ bụkwa onyinye Chineke nyere gịnwa. Onyinye a gosiri na Chineke ji gị kpọrọ ihe. Àjà ahụ nwere ike inye gị “nkasi obi ebighị ebi,” meekwa ka i nwee “ezi olileanya” ka i wee “guzosie ike n’omume ọma niile nakwa n’okwu ọma niile.”—2 Ndị Tesalonaịka 2:16, 17.

N’eziokwu, Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga. Ma, olee ihe Chineke na-eme n’oge a nke gosiri na ọ chọrọ ka gị na ya dịrị ná mma?

^ para. 5 Ị chọọ ịmatakwu banyere àjà Jizọs chụrụ, gụọ isi nke 5 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.