Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | NDỊ NWỤRỤ ANWỤ HÀ GA-ADỊLI NDỤ ỌZỌ?

Gịnị Na-eme Mmadụ Ma Ọ Nwụọ?

Gịnị Na-eme Mmadụ Ma Ọ Nwụọ?

Otu nwoke aha ya bụ Lionel kwuru, sị: “Echere m na ebe atọ mmadụ nwere ike ịga ma ọ nwụọ bụ eluigwe, ọkụ mmụọ na pọgatrị. Ama m na erughị m eru ịga eluigwe nakwa na ajọ omume m erughị nke ịga ọkụ mmụọ. Ma, aghọtachaghị m ihe a na-akọ gbasara pọgatrị. Ndị mmadụ na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ na-aga n’ebe atọ ndị a. Agụtatụbeghị m ụdị ihe ahụ na Baịbụl.”

Otu nwoke aha ya bụ Fernando kwuru, sị: “A kụziiri m na mmadụ nwụọ, ya agaa eluigwe, ma ekwetaghị m. Echere m na onye nwụọ nke ya agaala, onye ahụ emekataghị dịrị ndụ ọzọ.”

È nwetụla mgbe ị jụrụ onwe gị, sị: ‘Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ? È nwere ebe ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ nọ na-ata ahụhụ? Ànyị ga-ahụ ha ọzọ? Olee otú anyị ga-esi amata nke bụ́ eziokwu?’ Ka anyị legodị ihe Baịbụl kwuru. Anyị ga-ebu ụzọ leba anya n’ihe o kwuru na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. E mechaa, anyị eleba anya n’ihe o kwuru gbasara ndị nwụrụ anwụ ịdị ndụ ọzọ.

Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

IHE BAỊBỤL ZARA: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ, n’ihi na e chefuwo ihe niile a pụrụ icheta banyere ha. Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum mee ha, n’ihi na ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol, ebe ị na-aga.” *Ekliziastis 9:5, 10.

Shiol bụ ebe onye ọ bụla nwụrụnụ na-aga. Ndị niile nọ na ya amaghị ihe ọ bụla, o nweghịkwa ihe ha ga-emeli. Olee ihe Job bụ́ onye ezi omume chere gbasara Shiol? N’otu ụbọchị, ụmụ Job na ihe niile o nwere lara n’iyi. Ka obere oge gachara, etuto ọjọọ etoo ya n’ahụ́ niile. Job rịọrọ Chineke sị: “A sị nnọọ na ị ga-ezobe m na Shiol, [“n’ime ala mmụọ,” Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik] na ị ga-ezobe m.” (Job 1:13-19; 2:7; 14:13) O doro anya na Job ewereghị Shiol ka ọkụ ala mmụọ, ebe ọ ga-aga takwuo ahụhụ. Kama, o weere ya ka ebe ọ ga-anọ zuru ike.

Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ bụ ịgụ ihe e dere na Baịbụl gbasara mmadụ asatọ si n’ọnwụ bilie.—Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Mmadụ Asatọ Baịbụl Kwuru na A Kpọlitere n’Ọnwụ.”

O nweghị onye n’ime ha kwuru na ya gara n’ebe ọ nọ na-enwe obi ụtọ ma ọ bụ na-ata ahụhụ. Ọ bụrụ na ha gara ụdị ebe ndị ahụ mgbe ha nwụrụ, ọ̀ bụ na ha agaraghị akọrọ ya ndị mmadụ? A gaara edekwa ya na Baịbụl ka onye ọ bụla nwee ike ịgụ ya. Ma, e deghị ụdị ihe ahụ na Baịbụl. O doro anya na mmadụ asatọ ahụ sí n’ọnwụ bilie enweghị ihe ha ga-ekwuli mere mgbe ha nwụrụ, n’ihi na ha dị ka ndị nọ́ n’oké ụra, ha amaghịkwa ihe ọ bụla. E nwedịrị ebe ụfọdụ Baịbụl kwuru na onye nwụrụ anwụ nọ n’ụra. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Devid na Stivin, bụ́cha ndị ezi omume, “dara n’ụra ọnwụ.”—Ọrụ Ndịozi 7:60; 13:36.

Ajụjụ bụzi: Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ? Hà ga-emecha sí n’ụra ọnwụ bilie?

^ para. 7 Okwu Hibru bụ́ “Shiol” na okwu Grik bụ́ “Hedis” pụtachara “ili.” Otú e si sụgharịa ya n’ụfọdụ Baịbụl bụ “ala mmụọ,” ma Baịbụl ekwughị na e nwere ọkụ ala mmụọ a na-ata ndị mere ihe ọjọọ ahụhụ ma ha nwụọ.