Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Gịnị mere e ji dee amụma ndị e dere na Baịbụl?

Gịnị mere Baịbụl ji kwuo ihe ndị ga-eme n’oge anyị a?Luk 21:10, 11.

E dere ọtụtụ amụma na Baịbụl, deekwa ihe niile gbasara otú ha ga-esi mee. O nweghị mmadụ ga-ekwuli ihe ga-eme n’ọdịnihu, kwuokwa otú ọ ga-esi mee, ya emee otú ahụ o si kwuo ya. Ma, amụma ndị e buru na Baịbụl na-emezucha. Ọ na-egosi na Baịbụl bụ Okwu Chineke n’eziokwu.—Gụọ Jọshụa 23:14; 2 Pita 1:20, 21.

Amụma Baịbụl ndị mezurulanụ na-eme ka anyị nwee okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ. (Ndị Hibru 11:1) Ha na-emekwa ka obi sie anyị ike na nkwa niile Chineke kwere anyị ga-emezucha. N’eziokwu, amụma ndị e buru na Baịbụl na-eme ka anyị nwee olileanya.—Gụọ Abụ Ọma 37:29; Ndị Rom 15:4.

Olee uru amụma ndị e buru na Baịbụl na-abara anyị?

Chineke ji ụfọdụ amụma ndị e dere na Baịbụl gwa ndị ya ihe ha ga-eme. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị mbụ soro ụzọ Jizọs hụrụ ka amụma ụfọdụ e buru gbasara ibibi Jeruselem na-emezu, ha si na Jeruselem gbapụ. Mgbe e mechara bibie Jeruselem n’ihi na ọtụtụ ndị bi na ya jụrụ Jizọs, ọkọ akọghị ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Gụọ Luk 21:20-22.

Amụma ndị na-emezu taa na-egosi na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ niile. (Daniel 2:44; Luk 21:31) Ọ bụ ya mere onye ọ bụla ji kwesị ịgbasi mbọ ike ugbu a na-eme ihe dị Jizọs Kraịst mma ebe ọ bụ Eze Chineke họpụtara ka ọ na-achị n’Alaeze ya.—Gụọ Luk 21:34-36.