Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ahụhụ juru n’ụwa?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ahụhụ anyị na-ata?

Olee ihe ị ga-aza?

  • Ee

  • Mba

  • O nwere ike

Ihe Baịbụl Kwuru

“Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ, ya bụrụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ihe arụ ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.” (Job 34:10) Ọ bụtụghị Chineke na-akpata ahụhụ na ihe ọjọọ anyị na-ahụ n’ụwa taa.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Onye kacha akpata ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata bụ Setan bụ́ Ekwensu. Ọ bụ ya “na-achị ụwa.”—Jọn 14:30.

  • Ihe ọzọ na-akpatakarị ihe ọjọọ na ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ụwa bụ mkpebi na-adịghị mma ha na-eme.—Jems 1:14, 15.

È nwere mgbe ahụhụ ga-akwụsị?

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ndị mmadụ nwere ike ịgbakọ aka mee ka ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata kwụsị. E nwekwara ndị nke na-ekwu na ha echeghị na ihe ga-emecha dị mma n’ụwa a. Gịnị ka i chere?

Ihe Baịbụl kwuru

Chineke ga-eme ka ahụhụ kwụsị. “Ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:3, 4.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Chineke ga-esi n’aka Jizọs mee ka ahụhụ niile Ekwensu kpataara ụmụ mmadụ kwụsị.—1 Jọn 3:8.

  • Ndị ezi omume ga-ebi n’udo n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:9-11, 29.