Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Na-akwanyere Ndị Chọọchị Ọzọ Ùgwù?

Ndịàmà Jehova Hà Na-akwanyere Ndị Chọọchị Ọzọ Ùgwù?

 Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha ‘na-asọpụrụ mmadụ niile.’ N’ihi ya, anyị na-asọpụrụ onye ọ bụla n’agbanyeghị chọọchị onye ahụ na-aga. (1 Pita 2:17) Dị ka ihe atụ, n’obodo ụfọdụ, e nwere ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova. Ma, anyị anaghị agwa ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị omeiwu ka ha machibido ndị chọọchị ọzọ iwu. Anyị anaghịkwa agwa ndị ọchịchị ka ha tie iwu ka ndị mmadụ mewe otú anyị na-eme ma ọ bụ kwere ihe ndị anyị kweere. Kama, anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù otú ahụ anyị ga-achọ ka hanwa na-akwanyere anyị.—Matiu 7:12.