Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Nọ n’Òtù?

Ndịàmà Jehova Hà Nọ n’Òtù?

 Mba, Ndịàmà Jehova anọghị n’òtù. Kama, anyị bụ Ndị Kraịst. Anyị na-agbalịkwa ike anyị niile iso nzọụkwụ Jizọs na ịna-eme ihe ndị ọ kụziri.

Gịnị bụ òtù?

 Okwu a bụ́ “òtù” nwere otú dị iche iche ndị mmadụ si aghọta ya. Ma, ka anyị leba anya n’ihe abụọ ndị mmadụ na-ekwukarị na òtù pụtara nakwa ihe mere ọ dabaghị adaba ịsị na anyị nọ n’òtù.

  •   Ụfọdụ ndị na-eche na òtù bụ okpukpe pụtara ọhụrụ ma ọ bụ okpukpe na-anaghị eme ihe okpukpe ndị a ma ama na-eme. Okpukpe Ndịàmà Jehova abụghị okpukpe ọhụrụ. Kama, anyị na-efe Chineke otú Ndị Kraịst oge mbụ si fee Chineke. E dekwara otú ha si fee Chineke na ihe ndị ha kụziri na Baịbụl. (2 Timoti 3:​16, 17) Anyị kweere na ọ bụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ịbụ o kwuchaa o bie n’ihe gbasara otú anyị ga-esi na-ekpere Chineke.

  •   Ụfọdụ ndị na-eche na òtù bụ okpukpe ọjọọ mmadụ bụ onyeisi ya. O nweghị mmadụ ọ bụla Ndịàmà Jehova ji mere onyeisi. Kama nke ahụ, onye anyị ji mere onyeisi bụ onye Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọ bụ onyeisi ha. Jizọs sịrị: “Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.”​—Matiu 23:10.

 E nwetụdịghị otú Ndịàmà Jehova si bụrụ ndị òtù ọjọọ. Kama nke ahụ, okpukpe ha na-abara ma hanwa ma ọhaneze uru. Dị ka ihe atụ, ozi ọma anyị na-ekwusa emeela ka ọtụtụ ndị kwụsị omume ọjọọ ndị ririla ha ahụ́, dị ka ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụbiga mmanya ókè. Ihe ọzọkwa bụ na n’ụwa niile, anyị nwere klas ebe anyị na-akụziri ndị mmadụ otú e si agụ na otú e si ede. Anyị na-agbatakwara ndị mmadụ ọsọ enyemaka ma e nwee ọdachi. Anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị nyere ndị ọzọ aka ịna-akpa àgwà ọma ka anyị, otú ahụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme.​—Matiu 5:​13-​16.