Gaa n'Isiokwu

Foto Briten—Nke 1 (Malite n’Ọnwa Jenụwarị Ruo n’Ọnwa Ọgọst afọ 2015)

Foto Briten—Nke 1 (Malite n’Ọnwa Jenụwarị Ruo n’Ọnwa Ọgọst afọ 2015)

Ndịàmà Jehova nọ́ na Briten na-ebufe alaka ụlọ ọrụ ha dị́ n’obodo Mil Hil dị́ na Lọndọn, gaa n’ebe dị nso na Kelmsfọd, dị́ na Eses. I si na Mil Hil gaa ebe ahụ dị ihe dị ka kilomita iri asaa. N’agbata ọnwa Jenụwarị na ọnwa Ọgọst, afọ 2015, ndị ọrụ rụrụ ụlọ ha ga-ebi, ọfis, na ebe ha ga na-adọwa ngwá ọrụ tupu ọrụ ebiri ọkụ.

Ihe ndị a rụrụ na Jenụwarị 23, afọ 2015

Mgbe ndị ọchịchị nyechara ikike ka a malite ọrụ, ndị ọrụ malitere ibupụsi osisi ndị e gbuturu egbutu ka a hụ ebe a ga-arụ ọrụ. Ha gbara mbọ hụ na ha rụchara ọrụ ahụ tupu oge nnụnụ ji arụ akwụ́ eruo. A wụsara iberibe osisi ndị si n’osisi ndị ahụ e gbuturu n’ụzọ ka ndị ji ụkwụ na-esi na ya agafe. A ga-ejikwa osisi ndị ahụ rụọ ọrụ mgbe a na-arụ alaka ụlọ ọrụ a.

Ihe a rụrụ na Jenụwarị 30, afọ 2015, n’ebe ndị ọrụ ga na-anọ eri nri

Ebe onye na-arụzi ọkụ na-arụnye ebe a ga-akwụnye waya tiivi n’ebe bụ́bu họtel. E jizi ya mere ebe a ga na-esi nri na ebe a ga-anọ na-eri nri. Tiivi ndị a ga-enwe ebe ahụ ga-eme ka ndị ọrụ na-ahụ ihe ndị a na-eme, na-anụkwa ihe ndị a na-ekwu mgbe ndị ezinụlọ betel na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị na mgbe ha na-enwe ọmụmụ ihe Ụlọ Nche.

Ihe a rụrụ na Febụwarị 23, afọ 2015, n’ebe a na-arụ alaka ụlọ ọrụ

Ihe a bụ ebe ndị ọrụ na-agba ụfọdụ ebe a ga-arụ ụlọ n’alaka ụlọ ọrụ a ogige. A ga-emecha gbaa ọtụtụ ebe n’ala a ogige. Ebe ọ bụ na ebe ahụ ka na-emepe emepe, a gbara mbọ hụ na ọrụ ndị a ga-arụ agaghị akpacha ụmụ anụmanụ ndị e nwere ebe ahụ aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, a dọkwasịrị ihe e ji gbaa ogige ahụ n’elu osisi a tọrọ n’ala ka e nwee ohere n’okpuru ya ebe ihe dị ka ewi na ebi ga-esi na-agafe ma ha kpagharịwa n’abalị.

Ihe a rụrụ na Febụwarị 23, afọ 2015, n’ebe a na-arụ alaka ụlọ ọrụ

Mgbe a na-arụ ụzọ ndị ọrụ ga na-esi n’ebe ha bi aga ebe a na-arụ ụlọ dị iche iche a ga-enwe n’alaka ụlọ ọrụ a. A ga-emecha mechie ya.

Ihe a rụrụ na Mach 5, afọ 2015, n’ebe a na-arụ alaka ụlọ ọrụ

Ihe a bụ mgbe a rụchara ụzọ a dị n’aka nri. Ị ga-esi n’ụzọ a aga ebe a na-arụ ụlọ ndị a ga-enwe n’alaka ụlọ ọrụ a. Ụlọ ndị a dị́ n’ala ala aka ekpe bụ ebe ndị ọrụ ga-ebi. A ga-arụkwu ụlọ ndị ọrụ ga-ebi n’akụkụ ya.

Ihe ndị e mere na Eprel 20, afọ 2015, n’ebe ndị ọrụ ga-ebi

Mgbe onye só n’Òtù Na-achi Isi nke Ndịàmà Jehova na onye na-anọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị letara ndị na-arụ alaka ụlọ ọrụ a. E mechara nwee nzukọ pụrụ iche n’izu ahụ. Ndịàmà Jehova nọ́ na Briten na Ayaland nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha dị iche iche gee ihe a na-ekwu, hụkwa ihe a na-eme. A gwara ha ụnyaahụ ya na ndị ọchịchị obodo Kelmsfọd kwuru ka ha bidogodị ọrụ.

Ihe a rụrụ na Mee 13, afọ 2015, n’ebe a ga-eji mere ọfis na ebe a ga-adọwa ngwá ọrụ

Ebe ndị ọrụ na-atọ ihe dị ka ígwè n’ala n’agbata nnukwu osisi oak abụọ. Ndị ọrụ ga na-esi ebe a aga ebe a ga-arụ ụlọ ndị a ga-enwe n’alaka ụlọ ọrụ a. Ihe a a na-atọ n’ala ga-eme ka nnukwu ụgbọala ghara imebi mgbọrọgwụ osisi mgbe ha na-agafe.

Ihe a rụrụ na Mee 21, afọ 2015, n’ebe ndị ọrụ ga-ebi

Ihe a bụ mgbe ndị ọrụ na-egwu ebe ha ga-eli waya ọkụ a ga-eji dọbata ọkụ n’ụlọ obibi ndị a ga-emecha kụtuo. Ụlọ ndị ị na-ahụ ebe a bụ ndị mbụ n’ime ụlọ iri ise ndị ọrụ ga-ebi na ha mgbe ọrụ biiri ọkụ.

Ihe a rụrụ na Jun 16, afọ 2015, n’ebe ndị ọrụ ga-ebi

Ebe onye plọmba na-etinye paịpụ mmiri n’otu n’ime ụlọ ndị ọrụ ga-ebi nwa mgbe.

Ihe a rụrụ na Jun 16, afọ 2015, n’ebe ndị ọrụ ga-ebi

Ụlọ ndị a dị́ n’aka nri bụ ụlọ ndị a rụrụ ọhụrụ ndị ọrụ ga-ebi na ha. Ntọala ndị a ị na-ahụ bụ ebe a ga-arụkwu ụlọ obibi. Ụlọ ndị nke dị n’aka ekpe bụkwa ụlọ ndị ọrụ ga-ebi, ebe a ga na-eri nri dịkwa na ya. A ga-arụ alaka ụlọ ọhụrụ a na mbara ala ahụ ahịhịa ya na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ nakwa odo odo.

Ihe a rụrụ na Jun 16, afọ 2015, n’ebe ndị ọrụ ga-ebi

Ebe onye ọrụ na-ejikọta waya na waya n’ụlọ nzipụ ozi. A chọrọ ka e nwee Ịntanet na ihe ndị ọzọ ndị ọrụ ga-eji na-ezirịta ozi mgbe ọrụ ga-amalite. Ha na ndị nọ n’alaka ụlọ ọrụ ndị ọzọ na ndị nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị ga-ejikwa ya na-ezirịta ozi.

Ihe a rụrụ na Julaị 6, afọ 2015, n’ebe a ga-arụ alaka ụlọ ọrụ

Ebe onye ọrụ ngo ji ígwè e ji amata ebe ihe dị na-achọ ebe ndị e gwuru olulu. Olulu ndị ahụ ga-enyere ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie aka ịmata otú ebe ahụ dị tupụ ọrụ ebido. Ọ bụ eziokwu na ndị Rom oge ochie biri n’obodo Kemsfọd dị́ nso n’ala a, ma ka ọ dị ugbu a, a chọpụtabeghị ihe ndị mgbe ochie n’otu narị olulu na asaa ndị ahụ e gwurula egwu.

Ihe a rụrụ na Julaị 6, afọ 2015, n’ebe a ga-eji mere ọfis na ebe a ga-adọwa ngwá ọrụ

Mgbe onye ọrụ na-akwọbi ihe e ji arụ awara ụzọ. A na-emezi ụfọdụ ụlọ ndị e nwere n’ebe a ka a nọrọ na ha na-arụzi ihe ụfọdụ. A ga-ejikwa ụfọdụ ebe mere ọfis na ebe a ga-anọ na-eme ihe ndị ga-eme ka ọrụ na-aga aga. A ga-anọ na ha na-arụ ọrụ ruo oge ụfọdụ

Ihe a rụrụ na Julaị 6, afọ 2015, n’ebe a ga-eji mere ọfis na ebe a ga-adọwa ngwá ọrụ

Ebe onye ọrụ ji katapila na-ekponye ájá na tipa a ga-eji ekpochi ihe.

Ihe e mere na Julaị 7, afọ 2015, n’ebe a ga-arụ alaka ụlọ ọrụ

Foto a na-egosi ala alaka ụlọ ọrụ a a chọrọ ịrụ nakwa ala ndị ọzọ nọ ya nso. A nọ n’ebe ndịda ala a see ya. Ala alaka ụlọ ọrụ a dị hekta iri atọ na anọ. E nwere ụzọ na-adịghị na foto a dị́ nso n’ala a, nke e si na ya aga ọdụ ụgbọ mmiri, ọdụ ụgbọelu nakwa Lọndọn.

Ihe a rụrụ na Julaị 23, afọ 2015, n’ebe a ga-arụ alaka ụlọ ọrụ

Ebe ndị ọrụ ngo na-akwatu ụlọ ndị dị n’ebe a chọrọ ịrụ alaka ụlọ ọrụ.

Ihe a rụrụ n’Ọgọst 20, afọ 2015, n’ebe a ga-eji mere ọfis na ebe a ga-adọwa ngwá ọrụ

Mgbe nnukwu kren na-adọkwasị ahụ́ ụlọ n’ogidi a rụrụla arụ. Ala ndị a dị ebe a bụ ebe a ga-arụ ụlọ ndị ọzọ. A ga-anọ na ha na-ahazi ọrụ ndị a na-arụ.