Gaa n'Isiokwu

Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova

Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.

Ịmaliteghachi Ilegharị Anya na Betel: N'ọtụtụ mba, a ga-amaliteghachi ịga legharịwa anya na Betel malite na Jun 1, 2023. Iji matakwuo ihe ndị ọzọ banyere ya, biko kpọturu alaka ụlọ ọrụ ị chọrọ ịga legharịa anya na ya. Biko, agakwala ilegharị anya na Betel ma ọ bụrụ na i bu ọrịa koronavaịrọs, nwee azụzụ, oyi ọmụma ma ọ bụ ya abụrụ na gị na onye bu ọrịa koronavaịrọs nọrọ ná nso nso a.

Kroeshia

Maka Ịgwa Anyị Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya

Mmadụ ò kwesịrị ịgwa anyị mgbe ọ ga-achọ ịbịa legharịa anya? Ee. Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, anyị ga-achọ ka ndị ọ bụla ga-abịa ilegharị anya gwa anyị agwa tupu ha abịa n’agbanyeghị ole ha ga-adị.

Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa, ị̀ ka nwere ike ịga legharịa anya? O nwere ike anyị agaghị ekwe ka ị gaa legharịa anya. Anyị enweghị ebe ga-aba ọtụtụ mmadụ, n’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka anyị nwere ike ịkpọgharị n’ụbọchị.

Olee oge i kwesịrị irute n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, biko abịala ihe karịrị otu awa tupu oge ị chọrọ iji malite ilegharị anya eruo.

Olee otú ị ga-esi agwa anyị na ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya.”

Ì nwere ike ịkagbu oge ị chọrọ ịbịa legharịa anya ma ọ bụ gbanwee ya? Ee. Pịa ebe e dere “Lee Oge I Tinyere ma ọ bụ Gbanwee Ya.”

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ ole anyị chọrọ ịkpọgharị n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya ezuola? Nọgide na-ele n’adres Ịntanet anyị n’ihi na anyị nwere ike ikwe ka ị bịa legharịa anya n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na ndị tinyeburu ụbọchị ahụ akagbuo ma ọ bụ yigharịa ya.

Adres Ya

Štrokinec 28

HR-10090 ZAGREB-SUSEDGRAD

CROATIA

+385 1-37-95-001

Ihe A Na-eme

Ha na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị 57 na Kroeshia nakwa ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị 16 na Bọznia na Hezegovina na-arụ. Ha na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Bọznian, Kroeshan, na n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Kroeshia. E nwekwara ebe a na-ele otú Ndịàmà Jehova si malite ikwusa ozi ọma n’ebe bụbu Yugoslavia. E nwere ebe ị ga-ahụ uru egwú bara n’ito Jehova.

Danloduo Akwụkwọ Ga-akọkwuru Gị Ihe Ndị Ọzọ