Gaa n'Isiokwu

Chineke Ò Nwere Aha?

Chineke Ò Nwere Aha?

Ihe Baịbụl kwuru

 Onye ọ bụla nwere aha. Chineke n’onwe ya kwesịkwara inwe aha. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na mmadụ bụrụ enyi, ị ga-ama aha ya, na-akpọkwa ya aha ya. Í cheghị na anyị kwesịrị ịma aha Chineke ma na-akpọ ya aha ya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi?

 Na Baịbụl, Chineke sịrị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” (Aịzaya 42:8) Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ aha ndị mmadụ na-etu Chineke, dị ka “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” “Ọkaakaa Onyenwe anyị” na “Onye Okike,” Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-akpọ ya aha ya. Ihe a o mere gosiri na ọ na-akwanyere anyị ùgwù.—Jenesis 17:1; Ọrụ Ndịozi 4:24; 1 Pita 4:19.

 N’ọtụtụ Baịbụl, e dere ezigbo aha Chineke n’Ọpụpụ 6:3. Ebe ahụ sịrị: “M na-apụta n’ihu Ebreham, Aịzik na Jekọb dị ka Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ma emeghị m ka ha mara m n’aha m bụ́ Jehova.”

 Kemgbe ụwa, e dewe aha Chineke n’asụsụ Igbo, a na-ede ya Jehova. Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ndị na-ede ya “Yahweh,” ma nke a kacha ede bụ “Jehova.” Mgbe mbụ e dere Baịbụl, ọ bụghị asụsụ Igbo ka e ji dee Agba Ọhụrụ kama ọ bụ asụsụ Hibru. E dee asụsụ Hibru n’akwụkwọ, a na-esi n’aka nri agụ ya aga n’aka ekpe. Lekwa otú e si ede aha Chineke n’asụsụ Hibru, יהוה. A sụpee ya ná mkpụrụ akwụkwọ Igbo, ọ pụtara YHWH. N’asụsụ Bekee, a na-akpọ mkpụrụ akwụkwọ anọ a Tetragrammaton.