Aịzaya 42:1-25

  • Ohu Chineke na ọrụ e nyere ya (1-9)

    • ‘Jehova bụ aha m’ (8)

  • Abụ ọhụrụ e ji eto Jehova (10-17)

  • Ndị Izrel kpuru ìsì, ntị chikwara ha (18-25)

42  Leenụ ohu m,+ bụ́ onye m na-akwado,Onye m họọrọ,+ onye ihe ya masịrị m.*+ Enyela m ya mmụọ m.+ Ọ ga-eme ka a na-ekpe ikpe ziri ezi ná mba niile.+   Ọ gaghị eti mkpu. Ọ gaghị eme ka olu ya na-ala elu. Ọ gaghịkwa eme ka a nụ olu ya n’okporo ámá.+   Ọ gaghị agbaji ahịhịa amị huuru ehuru. Ọ gaghịkwa emenyụ owu mpanaka* ọ bụla na-achọ ịnyụ anyụ.+ Ọ ga-ahụrịrị na e kpere ikpe ziri ezi.+   Ike agaghị agwụ ya. Ọ gaghịkwa ada mbà ruo mgbe o mere ka a na-ekpe ikpe ziri ezi n’ụwa.+ Ndị bi n’agwaetiti dị iche iche ga na-echere iwu* ya.   Jehova bụ ezi Chineke,Onye kere eluigwe na Onye Ukwu nke mere ka ọ saa mbara.+ Ọ bụ ya kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya.+ Ọ bụ ya na-eme ka ndị mmadụ na-eku ume,+Na-enyekwa ndị na-ejegharị n’ụwa ume ndụ.+ Ọ sịrị:   “Mụnwa, bụ́ Jehova, akpọọla gị n’ihi na m na-eme ezi omume. M serela gị n’aka. M ga-echebe gị, meekwa ka ọ bụrụ gị ka mụ na ndị mmadụ ga-eji gbaa ndụ.+ M ga-emekwa ka ị bụrụ ìhè mba niile ji ahụ ụzọ,+   Ka i meghee anya ndị ìsì,+Ka ị kpọpụta ndị mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ, Meekwa ka ndị nọ ọdụ n’ọchịchịrị si n’ụlọ mkpọrọ pụta.+   Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m. Anaghị m enye onye ọzọ ùgwù ruuru m. Anaghịkwa m enye arụsị a pịrị apị otuto e kwesịrị inye m.+   Ihe ndị m kwuru n’oge gara aga emezuola. Ọ bụzi ihe ndị ọhụrụ ka m na-akpọsa. Tupu ha emewe, m na-agwa unu gbasara ha.”+ 10  Ndị si n’oké osimiri aga njem na ihe niile dị n’oké osimiri,Agwaetiti dị iche iche na ndị bi na ha,+Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ.+ Jirinụ abụ too ya n’ụwa niile.+ 11  Ka ala ịkpa na obodo ndị dị na yaNakwa ógbè dị iche iche ndị Kida+ bi tie mkpu.+ Ka ndị bi ná nnukwu nkume tie mkpu ọṅụ. Ka ha nọrọ n’elu ugwu dị iche iche tisie mkpu ike. 12  Ka ha kwanyere Jehova ùgwù,Tookwa ya n’agwaetiti dị iche iche.+ 13  Jehova ga-apụta ka dike.+ Ọ ga-adị ka onye agha na-anụ ọkụ n’obi ịga agha.+ Ọ ga-eti mkpu. Ọ ga-eti mkpu agha. Ọ ga-egosi na ya ka ndị iro ya ike.+ 14  “Agbachiri m nkịtị kemgbe. Ekwughị m ihe ọ bụla. M jidere onwe m. M ga-asụ ude, kusie ume ike, kuokwa ume ọkụ ọkụ n’otu mgbe ahụOtú nwaanyị na-amụ nwa na-eme. 15  M ga-ala ugwu ukwu na ugwu nta n’iyi,M ga-emekwa ka ahịhịa ndụ niile dị na ha kpọọ nkụ. M ga-eme ka osimiri ghọọ agwaetiti. M ga-emekwa ka ọdọ mmiri ndị ahịhịa amị juru takọọ.+ 16  M ga-eduru ndị ìsì gaa n’ụzọ ha na-amaghị.+ M ga-emekwa ka ha jee ije n’okporo ụzọ ha na-amaghị.+ M ga-eme ka ìhè dị n’ebe gbara ọchịchịrị n’ihu ha,+Meekwa ka ala dị ndakoro ndakoro dị larịị.+ Ọ bụ ihe ndị a ka m ga-emere ha. M gaghịkwa ahapụ ha.” 17  Ihere ga-emegbu ndị tụkwasịrị arụsị a pịrị apị obi,Ndị na-asịkwa arụsị ndị a kpụrụ akpụ: “Unu bụ chi anyị.”+ A ga-emekwa ka ha laghachi azụ. 18  Ndị ntị chiri, geenụ ntị. Ndị ìsì, leenụ anya ka unu hụ ụzọ.+ 19  È nwere onye ọzọ kpuru ìsì ma e wezụga ohu m? Ònyekwa ka ntị chiri ka onye na-agara m ozi? Ònye kpuru ìsì ka onye m kwụrụ ụgwọ? Ònye kpuru ìsì ka ohu Jehova?+ 20  Ị na-ahụ ọtụtụ ihe, ma ị naghị echebara ha echiche. Ị na-eghewe ntị gị oghe, ma ị naghị ege ntị.+ 21  Jehova ji maka na ọ na-eme ezi omumeNwee mmasị igosi na iwu* ya enweghị atụ nakwa na ọ dị ebube. 22  Ma, ndị a bụ ndị e bukọọrọ ihe ha, kwakọrọkwa ihe ha.+ A kpọchiri ha niile n’ime olulu. E zokwara ha n’ụlọ mkpọrọ.+ A kpụrụla ha. E nweghịkwa onye ga-anapụta ha.+ A kpọọrọ ha n’ike. E nweghịkwa onye na-asị: “Kpọghachite ha!” 23  Ònye n’ime unu ga-anụ ihe a? Ònye ga-atọ ntị n’ala, geekwa ntị maka ọdịnihu? 24  Ònye nyefere Jekọb n’aka ndị kwakọọrọ ihe ya,Nyefeekwa Izrel n’aka ndị na-ebukọrọ ihe mmadụ? Ọ́ bụghị Jehova, onye anyị mehiere? Ha jụrụ ije ije n’ụzọ ya. Ha egeghịkwa ntị n’iwu* ya.+ 25  Ọ bụ ya mere Chineke ji jiri iwe na ọnụma mee ndị Izrel ihe,Meekwa ka agha kpaa ha aka ọjọọ.+ O nweghị otú ọ na-esighị wesa ha iwe, ma ha achọghị ịma.+ Ọ nọ na-ewere ha ezigbo iwe, ma o metụghị ha n’obi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Ma ọ bụ “ná ntụziaka.”