Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmadụ Ịhụ Onwe Ya n’Anya?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmadụ Ịhụ Onwe Ya n’Anya?

Ihe Baịbụl Kwuru

 Baịbụl kwuru na ọ dị mma, dịrịkwa mkpa, ka mmadụ hụ onwe ya n’anya, ma ọ bụghị gabiga ókè. Ihe ndị so na mmadụ ịhụ onwe ya n’anya bụ mmadụ ilekọta onwe ya, ịkwanyere onwe ya ùgwù, na obi isi ya ike na ọ bara uru. (Matiu 10:31) Baịbụl akwadoghị mmadụ ịna-eche naanị gbasara onwe ya, ma o kwuru na mmadụ kwesịrị ịhụ onwe ya n’anya otú kwesịrị ekwesị.

Ònye ka anyị kwesịrị ịhụ n’anya karịchaa?

  1.   Onye anyị kwesịrị ịhụ n’anya karịchaa bụ Chineke. Baịbụl kwuru na iwu kacha iwu niile bụ: “Jiri obi gị dum . . . hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”​​—⁠Mak 12:​28-​30; Diuterọnọmi 6:⁠5.

  2.    Iwu nke abụọ n’iwu kacha iwu niile bụ: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”​​—⁠Mak 12:31; Levitikọs 19:18.

  3.   Ọ bụ eziokwu na enweghị ebe Baịbụl nyere iwu hoo haa ka mmadụ hụ onwe ya n’anya, ma iwu o nyere ka ị “hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị” gosiri na mmadụ ịhụ onwe ya n’anya na ịkwanyere onwe ya ùgwù otú kwesịrị ekwesị dị mma, baakwa uru.

Ònye ka Jizọs kacha hụ n’anya?

 Jizọs gosiri otú kwesịrị ekwesị mmadụ ga-esi ahụ Chineke n’anya, hụ onye agbata obi ya n’anya, ma hụkwa onwe ya n’anya. Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme ka ya.​​—⁠Jọn 13:​34, 35.

  1.   Ọ bụ Jehova Chineke ka Jizọs kacha hụ n’anya. O jikwa ndụ ya niile rụọrọ ya ọrụ. Ọ sịrị: “Ka ụwa wee mara na m hụrụ Nna m n’anya, ọbụna dị ka Nna m nyere m iwu ka m mee, otú ahụ ka m na-eme.”​​—⁠Jọn 14:⁠31.

  2.   Jizọs hụrụ ndị agbata obi ya ma ọ bụ ndị ọzọ n’anya. Ọ bụ ya mere o ji gbooro ha mkpa ha. O rudịrị nke na o ji ndụ ya chụọ àjà maka ha.​​—⁠Matiu 20:⁠28.

  3.   Jizọs hụrụ onwe ya n’anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụ ya mere o ji wepụta oge zuo ike, rie nri, sorokwa ndị na-eso ụzọ ya na ndị nwere ike imecha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya kporie ndụ.​​—⁠Mak 6:​31, 32; Luk 5:​29; Jọn 2:​1, 2; 12:⁠2.

Mmadụ hụ ndị ọzọ n’anya karịa ka ọ hụrụ onwe ya, ọ̀ ga-eme ka ọ ghara ịna-enwe obi ụtọ ma ọ bụ mee ka a ghara ịna-akwanyere ya ùgwù?

 Mba, n’ihi na Chineke kere anyị n’onyinyo ya. Ọ bụkwa ịhụ ndị ọzọ n’anya bụ àgwà a kacha jiri mara Chineke. (Jenesis 1:​27; 1 Jọn 4:⁠8) Ihe ọ pụtara bụ na Chineke kere anyị ka anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya. Mmadụ ịhụ onwe ya n’anya dị mma, ma, ihe ga-akacha eme ka anyị na-enwe obi ụtọ bụ ma anyị hụ Chineke n’anya karịa onye ọ bụla nakwa karịa ihe ọ bụla, anyị ana-emekwara ndị ọzọ ihe ọma. Baịbụl sịrị na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”​​—⁠Ọrụ Ndịozi 20:⁠35.

 Ọtụtụ ndị taa na-ekwu na ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ bụ ma ọ hụ onwe ya n’anya karịchaa. Ha ewerela ‘hụ onwe gị n’anya’ dochie “hụ onye agbata obi gị n’anya.” Ma, ihe ndị mere eme n’oge a gosiri na ahụ́ na-aka agbasi ndị mmadụ ike, ha ana-enwekwu obi ụtọ ma ha na-erube isi n’ezigbo ndụmọdụ Baịbụl nyere, nke bụ́: “Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.”​—⁠1 Ndị Kọrịnt 10:⁠24.