Levitikọs 19:1-37

  • Iwu dị iche iche e nyere gbasara ịdị nsọ (1-37)

    • Otú e kwesịrị isi na-ewe ihe ubi (9, 10)

    • Ichebara ndị ntị chiri na ndị ìsì echiche (14)

    • Ekwutọla onye ọzọ (16)

    • Eburula mmadụ iwe n’obi (18)

    • Emela anwansi ma ọ bụ mgbaasị (26, 31)

    • Unu esenyela ihe n’ahụ́ (28)

    • Na-asọpụrụ ndị agadi (32)

    • Na-akwanyere ndị mbịarambịa ùgwù (33, 34)

19  Jehova gwara Mosis okwu ọzọ, sị:  “Gwa nzukọ Izrel niile okwu, sị ha, ‘Unu ga-adị nsọ, n’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova Chineke unu, dị nsọ.+  “‘Onye ọ bụla n’ime unu ga na-akwanyere nne ya na nna ya ùgwù.*+ Unu ga na-edebekwa ụbọchị izu ike m.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.  Unu efela chi na-abaghị uru.+ Unu emekwarala onwe unu chi a kpụrụ akpụ.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.  “‘Ọ bụrụ na unu na-achụrụ Jehova àjà udo,+ chụọnụ ya otú ga-eme ka ọ nabata ya.+  A ga-eri anụ ya n’ụbọchị unu chụrụ àjà ahụ nakwa n’echi ya. Ma ihe fọrọ na ya ruo n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọ ya ọkụ.+  Ma, ọ bụrụ na e rie ihe ọ bụla fọrọ na ya n’ụbọchị nke atọ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Chineke agaghị anabata ya.  Onye riri ya ga-aza ajụjụ maka mmehie ya n’ihi na o merụrụ àjà dị nsọ a chụụrụ Jehova. A ga-egbukwa onye ahụ.*  “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi n’ala unu, unu ewerechala ihe niile dị n’ọnụ ọnụ ubi unu. Unu atụtụkwala ihe unu hapụrụ* n’ihe ubi unu.+ 10  Unu aghọrọla mkpụrụ unu ghọfọrọ n’ubi vaịn unu. Unu atụtụkwala mkpụrụ vaịn dasasịrị n’ubi vaịn unu. Unu ga-ahapụ ha maka ndị ogbenye+ na ndị mbịarambịa. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 11  “‘Unu ezula ohi.+ Unu eduhiela mmadụ.+ Unu aghọkwala ibe unu aghụghọ. 12  Unu ejila aha m aṅụ iyi ụgha,+ si otú ahụ mebie aha Chineke unu. Abụ m Jehova. 13  Unu erigbula mmadụ ibe unu.+ Unu apụnarala mmadụ ihe.+ Unu goo mmadụ ọrụ, unu ahapụla ịkwụ ya ụgwọ ọrụ ya chi abọọ.+ 14  “‘Akpọla onye ntị chiri iyi.* Edochikwarala onye ìsì ihe n’ụzọ.+ Tụọ egwu Chineke gị.+ Abụ m Jehova. 15  “‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi. Unu emerela ogbenye ebere maka na ọ bụ ogbenye. Unu emenyekwarala ọgaranya maka na ọ bụ ọgaranya.+ Na-ekpenụ mmadụ ibe unu ikpe ziri ezi. 16  “‘Agala na-ekwutọsị onye ọzọ n’ihu ụmụnna gị.+ Agbala mbọ ka i gbuo mmadụ ibe gị.*+ Abụ m Jehova. 17  “‘Akpọla nwanna gị asị n’obi gị.+ I kwesịrị ịdọ mmadụ ibe gị aka ná ntị,+ ka ị ghara iso ya buru mmehie ya. 18  “‘Abọla ọbọ.+ Ebukwarala mmadụ ibe gị iwe n’obi. Hụ mmadụ ibe gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.+ Abụ m Jehova. 19  “‘Unu ga-edebe iwu ndị a m na-enye unu: Unu akpọtala anụ ụlọ abụọ na-abụghị otu ụdị anụ ka otu gbaa ibe ya. Unu aghakọtala ụdị mkpụrụ abụọ dị iche iche n’ubi unu.+ Unu eyikwala uwe e ji ụdị eri abụọ dị iche iche kpaa.+ 20  “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị enwee mmekọahụ, ya abụrụ na nwaanyị ahụ na-ejere nwoke ọzọ ozi, ya abụrụkwa na e kenyela nwaanyị ahụ nwoke ọzọ, ma nwoke ahụ agbarabeghị ya ma ọ bụkwanụ na nwaanyị ahụ enwerebeghị onwe ya, a ga-ata ha ahụhụ. Ma, a gaghị egbu ha n’ihi na nwaanyị ahụ enwerebeghị onwe ya. 21  Nwoke ahụ ga-ewetara Jehova àjà ikpe ọmụma ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ya bụ, ebule a ga-eji chụọ àjà ikpe ọmụma.+ 22  Onye nchụàjà ga-eji ebule ahụ a ga-eji chụọ àjà ikpe ọmụma kpuchiere ya mmehie ya n’ihu Jehova. A ga-agbaghara ya mmehie o mere. 23  “‘Ọ bụrụ na unu abata n’ala ahụ wee kụọ osisi ọ bụla nke unu ga-eri mkpụrụ ya eri, unu ga-ewere mkpụrụ ya ka ihe na-adịghị ọcha na ihe a na-anaghị eri eri.* Ọ ga-abụrụ unu ihe a na-anaghị eri eri ruo afọ atọ. Unu erikwala ya. 24  Ma n’afọ nke anọ, mkpụrụ ya niile ga-abụ mkpụrụ dị nsọ. Ọ ga-abụkwa oge ịṅụrị ọṅụ n’ihu Jehova.+ 25  N’afọ nke ise, unu nweziri ike iri mkpụrụ ya. Ọ ga-esozi ná mkpụrụ unu na-ewe n’ubi. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 26  “‘Unu erila ihe ọ bụla ọbara dị na ya.+ “‘Unu agbala afa ka unu mata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Unu emekwala anwansi.*+ 27  “‘Unu akpụla* ajị ndị dị n’akụkụ ntì unu. Unu akpụchapụkwala ọnụ afụ ọnụ* unu.*+ 28  “‘Unu ebekasịla ahụ́ unu maka onye nwụrụ anwụ.*+ Unu esenyekwala ihe n’ahụ́ unu. Abụ m Jehova. 29  “‘Emela ka nwa gị nwaanyị gbawa akwụna,+ si otú ahụ metọọ nwa gị nwaanyị. I mee otú ahụ, ịgba akwụna ga-eme ka ala unu rụọ arụọ, omume rụrụ arụ ejukwa n’ala unu.+ 30  “‘Unu ga na-edebe ụbọchị izu ike m.+ Unu ga na-akwanyere ebe a na-anọ efe m ùgwù.* Abụ m Jehova. 31  “‘Unu agakwurula ndị na-agba afa.+ Unu ajụkwala ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ase,+ ka ha ghara ime ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 32  “‘Ị ga-ebiliri onye isi awọ́.+ Ị ga-asọpụrụ agadi.+ Ị ga-atụkwa egwu Chineke gị.+ Abụ m Jehova. 33  “‘Ọ bụrụ na onye mbịarambịa binyeere unu n’ala unu, unu emegbula ya.+ 34  Unu ga-ewere onye mbịarambịa binyeere unu ka nwa afọ.+ Unu ga-ahụkwa ya n’anya otú unu hụrụ onwe unu n’anya, n’ihi na e nwere mgbe unu bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 35  “‘Unu ejila ihe ọ bụla e ji atụ̀ ihe nke na-ezughị ezu tụọ ihe, ma ùnu na-atụ otú ihe hà n’ogologo ma ùnu na-atụ otú ihe dịruru n’arọ ma ùnu na-atụ otú ihe bururu n’ibu.+ 36  Unu ga na-eji ihe zuru ezu atụ̀ ihe. Jirikwanụ ihe zuru ezu e ji atụ̀ otú ihe dịruru n’arọ na ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe dị mmiri mmiri* nakwa ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe na-adịghị mmiri mmiri* na-atụ ihe.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt. 37  N’ihi ya, unu ga na-edebe iwu m niile, na-emekwa ihe niile m kpebiri ma na-eso ha.+ Abụ m Jehova.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “na-atụ egwu nne ya na nna ya.”
Na Hibru, “A ga-esi ná ndị ya gbupụ mkpụrụ obi ahụ.”
Ma ọ bụ “ihe fọrọ.”
Ma ọ bụ “Abụla onye ntị chiri ọnụ.”
O nwere ike ịbụ, “Akwụrụla na-ele n’anya n’anya mgbe e nwere ihe ga-ata isi mmadụ ibe gị.”
Na Hibru, “ihe a na-ebighị úgwù.”
Ma ọ bụ “majik.”
Ma ọ bụ “akpụlatala.”
Ya bụ, ajị na-adị n’agba.
Ọ ga-abụ na ihe a na-ekwu bụ ịkpụ ya otú ndị na-ekpere arụsị si akpụ nke ha.
Ma ọ bụ “maka mkpụrụ obi.” N’amaokwu a, okwu Hibru bụ́ ne′phesh pụtara onye nwụrụ anwụ.
Na Hibru, “na-atụ egwu ebe a na-anọ efe m.”
Na Hibru, “hin zuru ezu.” Gụọ B14.
Na Hibru, “efa zuru ezu.” Gụọ B14.