Gaa n'Isiokwu

Gịnị Na-eme Mmadụ Ma Ọ Nwụọ?

Gịnị Na-eme Mmadụ Ma Ọ Nwụọ?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baịbụl sịrị na “ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5; Abụ Ọma 146:4) N’ihi ya, mmadụ nwụọ, onye ahụ na-akwụsị ịdị adị. Onye nwụrụ anwụ agaghị echeli echiche, ọ gaghị emeli ihe ọ bụla, ihe agaghịkwa emetụli ya n’ahụ́.

‘Ọ bụ n’ájá ka ị ga-alaghachi’

 Mgbe Chineke na-agwa nwoke mbụ bụ́ Adam okwu, o kwuru ihe na-eme ma mmadụ nwụọ. Mgbe Adam nupụchaara Chineke isi, Chineke gwara ya, sị: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.” (Jenesis 3:19) Tupu Chineke ‘ejiri ájá si n’ala’ kpụọ Adam, Adam adịghị adị. (Jenesis 2:7) Ọ bụkwa ihe mere mgbe Adam nwụrụ. Ọ laghachiri n’ájá, kwụsịzie ịdị adị.

 Ọ bụkwa otu ihe ahụ na-eme ma mmadụ nwụọ taa. Lee ihe Baịbụl kwuru banyere ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ. Ọ sịrị: “Ha niile na-aga n’otu ebe. Ọ bụ n’ájá ka ha niile si, ọ bụkwa n’ájá ka ha niile na-alaghachi.”​—Ekliziastis 3:19, 20.

Ma, ọ pụtaghị na onye ọ bụla nwụrụnụ nke ya agaala

 Baịbụl na-ejikarị ọnwụ atụnyere ụra. (Abụ Ọma 13:3; Jọn 11:11-14; Ọrụ Ndịozi 7:60) Onye nọ n’oké ụra anaghị ama ihe na-emenụ. Ọ bụkwa otú ahụ ka onye nwụrụ anwụ na-anaghị ama ihe ọ bụla. Ma, Baịbụl na-agwa anyị na ọ gaghị ara Chineke ahụ́ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ otú ahụ ọ na-anaghị ara ahụ́ ịkpọte onye na-ehi ụra. (Job 14:13-15) N’ihi ya, a gaghị asị na nke ndị Chineke ga-akpọlite n’ọnwụ agaala.