Gịnị Bụ Oké Mkpagbu Ahụ?
Ihe Baịbụl kwuru
Oké mkpagbu ahụ ga-eme ka ihe siere ụmụ mmadụ ezigbo ike otú ọ na-esitụbeghị mbụ. Amụmụ a e buru na Baịbụl gosiri na ihe a ga-eme “n’oge ikpeazụ,” ma ọ bụ ‘n’ọgwụgwụ oge.’ (2 Timoti 3:1; Daniel 12:4, Bible Nsọ Ọhụụ) Ọ ga-abụ “mkpagbu nke a na-enwebeghị ụdị ya kemgbe ihe ndị Chineke kere malitere ịdị ruo mgbe ahụ, a gaghị enwekwa ya ọzọ.”—Mak 13:19; Daniel 12:1; Matiu 24:21, 22.
Ihe ndị ga-eme n’oge oké mkpagbu ahụ
A ga-ebibi okpukpe ụgha. A ga-ebibi okpukpe ụgha n’otu ntabi anya. (Mkpughe 17:1, 5; 18:9, 10, 21) Ọ bụ Òtù Mba Ụwa, nọchiri anya ndị ọchịchị, ga-ebibi okpukpe ụgha.—Mkpughe 17:3, 15-18. *
A ga-alụso ndị Chineke ọgụ. Ọtụtụ mba ndị gbakọrọ aka ọnụ, a kpọrọ “Gọg nke ala Megọg” n’ọhụụ Ezikiel hụrụ, ga-agbalị igbukpọ ndị na-efe Chineke. Ma, Chineke ga-echebe ndị na-efe ya ka a ghara ibibi ha.—Ezikiel 38:1, 2, 9-12, 18-23.
A ga-ekpe ndị bi n’ụwa ikpe. Jizọs ga-ekpe ụmụ mmadụ ikpe. “Ọ ga-ekewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ.” (Matiu 25:31-33) Ihe ọ ga-elekwasị anya kpee ikpe ahụ bụ mà anyị kwadoro “ụmụnna” Jizọs, bụ́ ndị ga-eso ya chịa n’eluigwe, ka ọ̀ bụ na anyị akwadoghị ha.—Matiu 25:34-46.
Ịchịkọta ndị ga-achị n’Alaeze. Ndị niile a họọrọ ka ha soro Kraịst chịa, ga na-ejere Chineke ozi ruo mgbe ha ga-anwụ, a kpọlite ha n’ọnwụ, ha agaa eluigwe.—Matiu 24:31; 1 Ndị Kọrịnt 15:50-53; 1 Ndị Tesalonaịka 4:15-17.
Amagedọn. Agha a bụ “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” A na-akpọkwa ya “ụbọchị Jehova.” (Mkpughe 16:14, 16; Aịzaya 13:9; 2 Pita 3:12) A ga-ebibi ndị Kraịst ga-ama ikpe. (Zefanaya 1:18; 2 Ndị Tesalonaịka 1:6-10) Ihe ọzọ a ga-ebibi bụ ọchịchị niile e nwere n’ụwa, bụ́ nke Baịbụl kọwara dị ka anụ ọhịa nwere isi asaa.—Mkpughe 19:19-21.
Ihe ndị ga-eme mgbe oké mkpagbu ahụ gasịrị
A ga-eke Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya agbụ. Otu mmụọ ozi dị ike ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ “n’ime abis.” N’ebe ahụ, ọ ga-adị ka hà nwụrụ anwụ n’ihi na ha agaghịzi na-akpa ike. (Mkpughe 20:1-3) E nwere ike iji ọnọdụ Ekwensu ga-anọ na ya n’ime abis tụnyere onye nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ gaghịzi na-akpa ike.—Mkpughe 20:7.
Ọchịchị otu Puku Afọ ga-ebido. Alaeze Chineke ga-ebido ịchị ruo otu puku afọ. Ọchịchị ahụ ga-emere ụmụ mmadụ ọtụtụ ihe ọma na-enweghị atụ. (Mkpughe 5:9, 10; 20:4, 6) “Oké ìgwè mmadụ” onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta,’ jiri anya ha hụ mgbe ọchịchị Puku Afọ ahụ ga-amalite.—Mkpughe 7:9, 14; Abụ Ọma 37:9-11.
^ N’akwụkwọ Mkpughe, Babịlọn Ukwu ahụ ma ọ bụ “oké nwaanyị akwụna ahụ,” nọchiri anya okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:1, 5) Anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie, bụ́ nke ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ, nọchiri anya òtù na-anọchite anya mba niile dị́ n’ụwa, na-agbakwa mbọ ka ha dị n’otu. Mgbe mbụ òtù a pụtara, a kpọrọ ya Njikọ Mba Niile, ma a na-akpọzi ya Òtù Mba Ụwa.