Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Tesalonaịka 1:1-12

  • Ekele (1, 2)

  • Okwukwe ndị Tesalonaịka na-esikwu ike (3-5)

  • A ga-abọ ọbọ n’isi ndị na-anaghị erube isi (6-10)

  • Ekpere e kpeere ọgbakọ Tesalonaịka (11, 12)

1  Pọl, Silvenọs,* na Timoti+ na-edetara ọgbakọ ndị Tesalonaịka, ndị ha na Chineke Nna na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị n’otu, akwụkwọ ozi:  Ka Chineke Nna na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.  Ụmụnna anyị, anyị agaghị akwụsị ịna-ekele Chineke mgbe niile n’ihi unu. O kwesịrị ekwesị n’ihi na okwukwe unu na-esikwu ezigbo ike, unu niile n’otu n’otu na-ahụkwa ibe unu n’anya karịa otú unu na-emebu.+  N’ihi ya, anyị ji unu akpa nganga+ n’ọgbakọ dị iche iche nke Chineke n’ihi otú unu si atachi obi ma nwee okwukwe n’agbanyeghị mkpagbu niile a na-akpagbu unu na ahụhụ niile unu na-ata.*+  Ihe a na-egosi na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi, nke mere e ji were unu ka ndị ruru eru inweta Alaeze Chineke, bụ́ nke unu na-atara ahụhụ.+  Ebe ọ bụ na Chineke bụ onye ezi omume, ọ ga-ata ndị na-akpagbu unu ahụhụ.+  Ma, a ga-eme ka unu ndị a na-akpagbu na anyịnwa nwere onwe anyị mgbe a ga-esi n’eluigwe kpughee Onyenwe anyị Jizọs,+ ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike+  n’ọkụ na-enwu enwu, mgbe ọ ga-abọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-anaghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.+  A ga-ama ndị a ikpe. Ikpe a ga-ama ha bụ mbibi ebighị ebi a ga-ebibi ha,+ ka ha pụọ n’ihu Onyenwe anyị, ka ọ gharakwa iji ike ya dị ebube nyere ha aka. 10  Ihe a ga-eme n’oge Onyenwe anyị ga-abịa ka e mee ka ya na ndị nsọ ya dị ebube. N’ụbọchị ahụ, ndị niile nwere okwukwe na ya ga-akwanyere ya ùgwù. Unu ga-esokwa ha ebe ọ bụ na unu nwere okwukwe n’àmà anyị gbaara unu. 11  Ọ bụ ya mere anyị ji na-ekpere unu ekpere mgbe niile ka Chineke anyị were unu ka ndị ruru eru ịbụ ndị ọ kpọrọ,+ ka o jirikwa ike ya mezuo ihe ọma niile dị ya mma ma mee ka ọrụ niile unu ji okwukwe na-arụ gaa nke ọma. 12  Ọ bụ ka e wee si n’aka unu too aha Onyenwe anyị Jizọs, e tookwa unu maka na unu na ya dị n’otu, n’ihi amara Chineke anyị na nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

A na-akpọkwa ya Saịlas.
Ma ọ bụ “na-edi.”